Ì Nwere “Ogwu n’Anụ Ahụ”?
1 Ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịrụzu ọrụ anyị nke ikwusa ozi ọma ruo n’ókè ike anyị ha. Otú ọ dị, ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị anyị hụrụ n’anya na-enwe ihe isi ike n’ikerezu òkè n’ihi na ajọ adịghị ike nke anụ ahụ ma ọ bụ nkwarụ na-egbochi ha, na-eme ka o siere ha ike imeru ókè ha chọrọ. Nye ha, ọ pụrụ ịbụ ihe ịma aka ịnagide mmetụta nke nkụda aka, karịsịa mgbe ha hụrụ ka ndị ọzọ nọ ha gburugburu dị nnọọ ike n’ije ozi.—1 Kọr. 9:16.
2 Ihe Nlereanya A Ga-eṅomi: Pọl onyeozi aghaghị ịlụ ọgụ megide otu “ogwu n’anụ ahụ” ya. Ọ rịọrọ Jehova ugboro atọ ka o wepụ ihe mgbochi ahụ na-enye ya nsogbu, nke ọ kọwara dị ka “mmụọ ozi nke Setan” nke nọgidere na-eti ya aka. Ma, n’agbanyeghị nke ahụ, Pọl tachiri obi, gaakwa n’ihu n’ozi ya. O meghịrị onwe ya ebere ma ọ bụ ghọọ onye na-emekarị mkpesa. O mere ike ya. Ihe mere o jiri nwee ihe ịga nke ọma n’ịnagide bụ mmesi obi ike a sitere n’ọnụ Chineke: “Amara m ezuworo gị: n’ihi na e mewo ka ike m zuo okè n’adịghị ike.” Adịghị ike Pọl ghọrọ ume mgbe ọ mụtara ịnakwere ọnọdụ ya na ịdabere na Jehova na mmụọ nsọ iji wee tachie obi.—2 Kọr. 12:7-10.
3 Ụzọ Ị Pụrụ Isi Tachie Obi: Adịghị ike nke mmadụ ọ̀ na-akpara ozi ị na-ejere Chineke ókè? Ọ bụrụ otú ahụ, ṅomie ụzọ Pọl siri lee ihe anya. Ọbụnadị a sị na nrịanrịa ma ọ bụ adịghị ike gị enweghị ngwọta na-adịgide adịgide n’usoro ihe nke a, ị pụrụ ịtụkwasị Jehova obi gị nile, bụ́ onye na-aghọta mkpa gị na onye ga-enye gị “ọkịka nke ike ahụ.” (2 Kọr. 4:7) Were enyemaka ị pụrụ inweta n’ọgbakọ mee ihe, ekewapụla onwe gị. (Ilu 18:1) Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ikere òkè n’ọrụ ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ chọpụta ụzọ ndị dị irè ị ga-esi gbaa àmà mberede.
4 Ọ bụ ezie na ogwu dị n’anụ ahụ pụrụ ịkpara ihe ị pụrụ ime n’ozi ókè, ọ dịghị mkpa ka i chewe na ị dịghị ekere òkè. Dị ka Pọl, gị onwe gị kwa pụrụ “ikwusi ozi ọma ahụ ike, bụ́ nke amara nke Chineke,” na-eme ihe ume na ọnọdụ gị kwere gị ime. (Ọrụ 20:24) Ka ị na-etinye mgbalị ijezu ozi gị, mara na ọ dị Jehova ezi mma.—Hib. 6:10.