Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Inwere Onwe Pụọ ná Mmetụta Ndị Mmụọ Ọjọọ
Ọ DỊWO anya ime mgbaasị nọworo na-achị ndụ nke ọtụtụ nde mmadụ. Ma ọ pụrụ ikwe mee inwere onwe onye! Nke ahụ bụ ihe mere n’ebe ọtụtụ ndị nọ n’obodo ochie bụ́ Efesọs. Dị ka ihe ndekọ Bible si kwuo, “ọ dịghịkwa mmadụ ole na ole n’etiti ndị na-eme mgbaasị kpokọtara akwụkwọ ha, rechapụ ha ọkụ . . . Otú a ka okwu Onyenwe anyị weere ike na-aga n’ihu n’ihu na-adịkwa irè.”—Ọrụ 19:19, 20.
N’otu aka ahụ, ọgbakọ ndị Kraịst taa na-eto eto. Dị ka ọ dịrị n’Efesọs, n’etiti ndị ahụ na-aghọ ndị kwere ekwe e nwere ndị fere ndị mmụọ ọjọọ ofufe na mbụ. Ahụmahụ na-esonụ sitere Zimbabwe na-eme ihe atụ nke a.
A maara Gogo (Nnenne) Mthupha nke ọma maka ike ime mgbaasị ya. Ndị mmadụ na-esi ebe ndị dị anya dị ka Zambia, Botswana, na South Africa abịa ka o were ọgwụ ọdịnala ya gwọọ ha. Gogo Mthupha na-akụzikwara ndị ọzọ otú e si abụ n’anga, ma ọ bụ dibịa afa. N’oge ụfọdụkwa ọ na-akọ ọgwụ!
N’otu ụtụtụ Sunday, Ndịàmà Jehova nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ letara Gogo Mthupha. Otu nkwurịta okwu ha na ya nwere banyere nkwa Bible maka ụwa ọhụrụ nke ezi omume, ụwa nke nweere onwe ya pụọ ná mmetụta ọjọọ nile tọrọ ya nnọọ ụtọ. Ọ natara akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala ma kwere ka e duziere ya ọmụmụ Bible ebe obibi.a Mgbe nanị ọmụmụ ihe atọ gasịrị, ọ malitere ịga nzukọ.
Site n’ọmụmụ Bible ya, Gogo Mthupha mụtara na ike ya pụrụ iche sitere n’aka ndị ajọ mmụọ e kere eke bụ́ ndị nupụworo isi megide ọbụbụeze Jehova. (2 Pita 2:4; Jud 6) Ọ mụtakwara na ndị mmụọ ọjọọ a kpebisiri ike ịtụgharị onye ọ bụla ha pụrụ megide Jehova na megide ofufe dị ọcha. Ebe ọ bụ na inweta ihe ndị o ji ebi ndụ dabeere n’ịjụ ajọ mmụọ ndị a ase, gịnị ka ọ ga-eme?
Gogo Mthupha kwupụtara ọchịchọ imebisị ọgwụ nchebe na ngwongwo mgbaasị ya. Nke a gụnyere ịchafụ isi ya pụrụ iche na “mpi ehi ndị na-ekwu okwu,” bụ́ ndị ọ na-eji eme ihe n’ọgwụgwọ n’anga ya. Gogo Mthupha chọrọ ibibisị ihe nile dị otú ahụ ka o wee nwee ike ijere nanị otu ezi Chineke nke dị ndụ, bụ́ Jehova ozi.
Ma, ụfọdụ ndị ikwu ya jụrụ n’ihi na ọ na-akwado ha n’ụzọ ego. Ha rịọrọ ya ka o nyefee ha ihe ndị ahụ, tinyere ike ya pụrụ iche, ka ha wee nwee ike ịga n’ihu n’inweta uru. Gogo Mthupha jụrụ.
Site n’enyemaka nke ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ebe ahụ, o kpojuru ngwá ọrụ mgbaasị ná nnukwu akpa atọ ma kpọọ ha nile ọkụ. Ka ire ọkụ na-erechapụ ngwá ndị o ji efe ndị mmụọ ọjọọ, Gogo Mthupha tiri ná mkpu, sị: “Lee! Mpi ahụ, ọ pụghị ịzọpụta onwe ya.”
Ka oge na-aga, Gogo Mthupha ji ọṅụ gosipụta nraranye ya nye Jehova site na baptism ime mmiri. Olee otú o si enweta ihe ndị e ji ebi ndụ ugbu a? Site n’ire akwụkwọ nri. Ee, site n’ike nke Okwu Chineke, mmadụ pụrụ inwere onwe ya pụọ n’ofufe ndị mmụọ ọjọọ. Gogo Mthupha kwuru sị: “Ọ dịtụbeghị mgbe m nweere onwe m otú a.”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.