Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 11/1 p. 13-18
  • N’ime Ụwa Ma Ghara Isite na Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ime Ụwa Ma Ghara Isite na Ya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ntolite nke Ike Ụwa Dị Iche Iche
  • Ịchịisi Na-abịanụ nke Alaeze Chineke
  • Izere “Akara” nke “Anụ Ọhịa” Ahụ
  • “Anụ Ọhịa” ahụ na “Siza”
  • Ụmụ Amaala Nwere Akọ na Uche
  • Ndị Kraịst Bụ́ Ndị Na-anọpụ Iche n’Ụbọchị Ikpeazụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Chineke na Siza
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ịlụso Ajọ Anụ Ọhịa Abụọ Ọgụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Ihe Akwụkwọ Mkpughe Kwuru Chineke Ga-eme Ndị Iro Ya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 11/1 p. 13-18

N’ime Ụwa Ma Ghara Isite na Ya

“N’ihi na unu esiteghị n’ụwa, . . . ụwa na-akpọ unu asị.”—JỌN 15:19.

1. Mmekọrịta dị aṅaa ka ndị Kraịst na-eso ụwa enwe, ma olee otú ụwa si ele ha anya?

N’ANYASỊ ikpeazụ ya na ndị na-eso ụzọ ya nọrọ, Jisọs gwara ha, sị: “Unu esiteghị n’ụwa.” Olee ụwa nke ọ na-ekwu banyere ya? Ó kwughị n’oge bu ụzọ, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi”? (Jọn 3:16) Ndị ahụ na-eso ụzọ bụ n’ụzọ doro anya akụkụ nke ụwa ahụ n’ihi na ha bụ ndị mbụ gosipụtara okwukwe na Jisọs maka ndụ ebighị ebi. Mgbe ahụ, n’ihi gịnị ka Jisọs ji kwuo ugbu a na ndị na-eso ụzọ ya nọpụrụ iche n’ụwa? N’ihi gịnịkwa ka o ji kwuokwa, sị: “N’ihi na unu esiteghị n’ụwa, . . . n’ihi nke a ụwa na-akpọ unu asị”?—Jọn 15:19.

2, 3. (a) Olee “ụwa” nke ndị Kraịst na-esiteghị na ya? (b) Gịnị ka Bible na-ekwu banyere “ụwa” nke ndị Kraịst na-esiteghị na ya?

2 Azịza ya bụ na Bible na-eji okwu bụ “ụwa” (Grik, koʹsmos) eme ihe n’ụzọ dị iche iche. Dị ka a kọwara n’isiokwu bu ụzọ, mgbe ụfọdụ n’ime Bible “ụwa” na-ezo aka n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ n’ozuzu ya. Nke a bụ ụwa nke Chineke hụrụ n’anya na nke Jisọs nwụụrụ. Otú ọ dị, The Oxford History of Christianity na-ekwu, sị: “‘Ụwa’ bụkwa okwu ndị Kraịst ji eme ihe maka ihe e wezụgara n’ebe Chineke nọ na nke na-emegide ya.” Olee otú nke a si bụrụ eziokwu? Onye Katọlik na-ede akwụkwọ bụ́ Roland Minnerath, n’akwụkwọ ya bụ́ Les chrétiens et le monde (Ndị Kraịst na Ụwa), na-akọwa, sị: “E were ya n’ụzọ mkparị, e si otú ahụ na-ewere ụwa dị ka . . . ebe ike ndị na-emegide Chineke na-akpa ike ha na nke mejupụtara alaeze ukwu nke ndị iro n’okpuru nchịkwa Setan site ná nguzogide ọ na-eguzogide ịchịisi mmeri nke Kraịst.” “Ụwa” a bụ ìgwè ụmụ mmadụ e wezụgara n’ebe Chineke nọ. Ezi ndị Kraịst esiteghị n’ụwa nke a, ụwa na-akpọkwa ha asị.

3 Ka ọ na-eru ná ngwụsị nke narị afọ mbụ, Jọn bu ụwa a n’uche mgbe o dere: “Unu ahụla ụwa, ma ọ bụ ihe nke dị n’ụwa, n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya nke Nna anyị adịghị n’ime ya. N’ihi na ihe nile nke dị n’ụwa, bụ́ agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya, na oké okwu nke ibi obi, esiteghị ná Nna anyị, kama o sitere n’ụwa.” (1 Jọn 2:15, 16) O dekwara, sị: “Anyị matara na anyị bụ ndị si na Chineke pụta, ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Jisọs n’onwe ya kpọrọ Setan “onye isi ụwa nke a.”—Jọn 12:31; 16:11.

Ntolite nke Ike Ụwa Dị Iche Iche

4. Olee otú ike ụwa dị iche iche si malite ịdị?

4 Ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ dị ugbu a e wezụgara n’ebe Chineke nọ malitere ibilite ngwa ngwa Iju Mmiri ụbọchị Noa gasịrị, mgbe ọtụtụ ụmụ Noa kwụsịrị ife Jehova Chineke. Onye a ma ama n’ụbọchị mbụ ndị ahụ bụ Nimrọd, owu obodo na “dike n’ịchụ nta [megide, NW] Jehova.” (Jenesis 10:8-12) N’afọ ndị ahụ a haziri ihe ka ukwuu n’ụwa a gaa n’obere obodo ukwu ndị bụ alaeze, bụ́ ndị site n’oge ruo n’oge na-ejikọ aka ọnụ ma na-eburịta agha. (Jenesis 14:1-9) Ụfọdụ obodo ukwu bụ alaeze naghaara ọchịchị n’isi ndị ọzọ iji ghọọ ike ọchịchị nke ógbè. Ụfọdụ ike ọchịchị ógbè mesịrị too ịghọ nnukwute ike ụwa.

5, 6. (a) Olee ike ụwa asaa ndị dị n’akụkọ ihe mere eme nke Bible? (b) Olee otú e si mee ihe atụ ike ụwa ndị a, ebeekwa ka ike ha si bịa?

5 N’ịgbaso ụkpụrụ Nimrọd, ndị ọchịchị nke ike ụwa dị iche iche efeghị Jehova ofufe, eziokwu nke e gosipụtara n’ọrụ obi ọjọọ, nke ime ihe ike ha. E ji anụ ọhịa mee ihe atụ ike ụwa ndị a n’Akwụkwọ Nsọ, n’ime ọtụtụ narị afọ ndị na-agafekwa, Bible kọwara isii n’ime ha nwere mmetụta dị ike n’ahụ ndị Jehova. Ndị a bụ Ijipt, Asiria, Babilọn, Medo-Peasia, Gris, na Rom. Mgbe Rom chịsịrị, e buru amụma ike ụwa nke asaa ibilite. (Daniel 7:3-7; 8:3-7, 20, 21; Mkpughe 17:9, 10) Nke a ghọrọ Ike Ụwa Anglo-America, nke Alaeze Ukwu Britain na òtù ya bụ́ United States mejupụtara, nke mesịrị karịa Britain ike. Alaeze Ukwu Britain malitere ibilite mgbe akụkụ ikpeazụ nke Alaeze Ukwu Rom mesịrị pụọ n’anya.a

6 E ji isi dị iche iche nke otu anụ ọhịa nwere isi asaa nke si n’oké osimiri nke ụmụ mmadụ ahụ na-erughị ala na-arịpụta mee ihe atụ nke ike ụwa asaa ahụ na-esochi onwe ha n’akwụkwọ Mkpughe. (Aịsaịa 17:12, 13; 57:20, 21; Mkpughe 13:1) Ònye na-enye anụ ọhịa a na-achị achị ike ya? Bible na-aza, sị: “Dragọn ahụ wee nye ya ike ya, na ocheeze ya, na oké ịchịisi.” (Mkpughe 13:2) Dragọn ahụ abụghị onye ọzọ ma e wezụga Setan Ekwensu.—Luk 4:5, 6; Mkpughe 12:9.

Ịchịisi Na-abịanụ nke Alaeze Chineke

7. Na gịnị ka ndị Kraịst na-enwe olileanya, oleekwa otú nke a si emetụta mmekọrịta ha na gọọmenti ndị dị n’ụwa?

7 Ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000, ndị Kraịst ekpewo ekpere, sị: “Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:10) Ndịàmà Jehova maara na nanị Alaeze Chineke pụrụ iweta ezi udo n’ụwa. N’ihi ịbụ ndị na-ekiri amụma Bible n’ụzọ chiri anya, obi siri ha ike na a ga-aza ekpere a n’isi nso nakwa na Alaeze ahụ ga-eweghara ihe omume ụwa n’oge na-adịghị anya. (Daniel 2:44) Nrapara ha rapaara n’Alaeze a na-eme ka ha nọpụ iche n’ihe omume dị iche iche nke gọọmenti nile nke ụwa.

8. Olee otú gọọmenti dị iche iche si emeghachi omume n’ebe ịchịisi nke Alaeze Chineke dị, dị ka e buru n’amụma n’Abụ Ọma 2?

8 Mba ụfọdụ na-azọrọ idebe ụkpụrụ dị iche iche nke okpukpe. Ma, n’omume ha na-eleghara eziokwu ahụ bụ na Jehova bụ Eze Eluigwe na Ala nakwa na o chiwo Jisọs echichi dị ka Eze eluigwe nwere ike n’isi ụwa nile anya. (Daniel 4:17; Mkpughe 11:15) Otu abụ amụma sịrị: “Ndị eze nke ụwa na-eguzo onwe ha, ndị isi na-agbakọtakwa izu, imegide Jehova, na imegide onye Ya e tere mmanụ [Jisọs], sị, Ka anyị tijie agbụ nile ha, tụfuo ụdọ nile ha n’ahụ anyị.” (Abụ Ọma 2:2, 3) Gọọmenti dị iche iche adịghị anabata “agbụ” ma ọ bụ “ụdọ” ọ bụla nke Chineke nke ga-akpara ngosipụta nke ịbụ eze mba ha ókè. N’ihi ya, Jehova na-agwa Jisọs, Eze ya ọ họpụtara, sị: “Rịọ m, na aga m enye gị mba nile ka ha bụrụ ihe nketa gị. Ị ga-eji mkpanaka ígwè tijisịa ha; dị ka ihe ọkpụ ite kpụrụ ka a ga-atụpịa ha.” (Abụ Ọma 2:8, 9) Otú ọ dị, a gaghị ‘etijisị’ kpam kpam ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ nke Jisọs nwụụrụ.—Jọn 3:17.

Izere “Akara” nke “Anụ Ọhịa” Ahụ

9, 10. (a) Gịnị ka a dọrọ anyị aka ná ntị banyere ya n’akwụkwọ Mkpughe? (b) Gịnị ka ibu ‘akara anụ ọhịa ahụ’ bụ ihe atụ ya? (ch) Olee akara ndị ohu Chineke na-anakwere?

9 Mkpughe Jọn onyeozi natara dọrọ aka ná ntị na ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ nke e wezụgara n’ebe Chineke nọ ga-achọwanye ihe n’aka mmadụ kpọmkwem tupu ọgwụgwụ ya, “na-emekwa mmadụ nile, ndị nta na ndị ukwu, na ndị ọgaranya na ndị ogbenye, na ndị nweere onwe ha na ndị ohu, ka a kaa ha akara n’aka nri ha, ma ọ bụ n’egedege ihu ha; ka onye ọ bụla gharakwa ịpụ ịzụta ahịa ma ọ bụ ire ihe, ma ọ bụghị onye nwere akara ahụ.” (Mkpughe 13:16, 17) Gịnị ka nke a pụtara? Akara n’aka nri bụ ihe ngosi kwesịrị ekwesị nke ezi nkwado. Gịnị banyere akara n’egedege ihu? The Expositor’s Greek Testament na-ekwu, sị: “Ntụaka a nke bụ nnọọ ihe atụ na-ezo aka n’àgwà nke ịka ndị soja na ndị ohu akara egbugbu ma ọ bụ ichi a na-ahụ anya . . . ; ma ọ bụ, nke kakwa mma, n’omenala okpukpe nke ibu aha chi dị ka ọgwụ okike.” Ọtụtụ mmadụ site n’omume na okwu ha na-ebu akara a n’ụzọ ihe atụ, na-egosipụta onwe ha dị ka “ndị ohu” ma ọ bụ “ndị soja” nke “anụ ọhịa” ahụ. (Mkpughe 13:3, 4) Banyere ọdịnihu ha, Theological Dictionary of the New Testament na-asị: “Ndị iro Chineke na-ekwe ka a kaa ha [akara] anụ ọhịa ahụ, nọmba ihe omimi ahụ nke bu aha ya, n’egedege ihu na n’otu aka ha. Nke a na-enye ha ohere ndị dị ukwuu nke ọganihu akụ̀ na ụba na azụmahịa, ma na-eweta ha n’okpuru ọnụma Chineke, na-ekewapụkwa ha pụọ n’alaeze narị afọ iri ahụ, Mkpu. 13:16; 14:9; 20:4.”

10 Ọ na-ewewanye obi ike na ndidi iji guzogide nrụgide ịnara “akara ahụ.” (Mkpughe 14:9-12) Otú ọ dị, ndị ohu Chineke nwere ume dị otú ahụ, n’ihi nke a kwa, a na-akpọkarị ha asị, na-ekwutọkwa ha. (Jọn 15:18-20; 17:14, 15) Kama ibu akara anụ ọhịa ahụ, Aịsaịa kwuru na n’ụzọ ihe atụ ha ga-edekwasị n’aka ha, “Onye Jehova nwere.” (Aịsaịa 44:5) Ọzọkwa, ebe ọ bụ na ha ‘na-eze ume na-asụkwa ude’ n’ihi ihe arụ nile okpukpe dapụrụ n’ezi ofufe na-eme, ha na-anata akara ihe atụ n’egedege ihu ha nke na-egosipụta ha ịbụ ndị ruru eru ka a hapụ ha ndụ mgbe e mezuru ihe Jehova kpere n’ikpe.—Ezikiel 9:1-7.

11. Ònye na-ekwere ka gọọmenti ụmụ mmadụ na-achị ruo mgbe Alaeze Chineke ga-abịa iweghara ịchịisi nke ụwa?

11 Chineke na-ekwe ka gọọmenti ụmụ mmadụ chịruo oge Alaeze eluigwe nke Kraịst ga-eweghara ịchịisi ụwa a kpam kpam. Prọfesọ Oscar Cullmann kọwara nkwere a Chineke kwere ka ọchịchị ndọrọ ndọrọ dị iche iche dịgide n’akwụkwọ ya bụ́ The State in the New Testament. Ọ na-ede, sị: “Nchepụta dị mgbagwoju anya nke ọdịdị ‘nchere oge’ nke Ọchịchị bụ ihe mere àgwà ndị Kraịst mbụ n’ebe Ọchịchị dị ji ghara ịbụ otu, kama nke ahụ yie nke na-emegide onwe ya. M na-ekwusi ike, na o yiri ka ọ dị otú ahụ. Ọ dị anyị mkpa ịkpọtụ uche nanị ná Ndị Rom 13:1, ‘Ka mmadụ ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ike dịnụ . . . ,’ ya na Mkpughe 13: Ọchịchị dị ka anụ ọhịa ahụ nke si n’abyss rịgopụta.”

“Anụ Ọhịa” ahụ na “Siza”

12. Echiche dị aṅaa guzoziri eguzozi ka Ndịàmà Jehova nwere banyere gọọmenti ụmụ mmadụ?

12 Ọ gaghị ezi ezi ikwubi na ụmụ mmadụ nile nọ n’ikike ọchịchị bụ ngwá ọrụ Setan. Ọtụtụ anwapụtawo onwe ha ịbụ ndị nwere ụkpụrụ, dị ka onye isi bụ́ Sajiọs Pọlọs bụ́ onye a kọwara n’ime Bible dị ka “nwoke nwere nghọta.” (Ọrụ 13:7) Ụfọdụ ndị ọchịchị ejiwo obi ike gbachitere ihe ndị ruuru ìgwè ndị dị nta, bụrụ ndị akọ na uche Chineke nyere ha na-eduzi ọbụna ma ọ bụrụ na ha amaghị Jehova na nzube ya. (Ndị Rom 2:14, 15) Cheta, Bible na-eji okwu ahụ bụ́ “ụwa” eme ihe n’ụzọ abụọ dịrịtara iche: ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ, nke Chineke hụrụ n’anya na nke anyị kwesịrị ịhụ n’anya, na ụwa nke ụmụ mmadụ e wezụgara n’ebe Jehova nọ, nke Setan bụ chi ya na nke anyị kwesịrị iguzopụ iche n’ebe ọ nọ. (Jọn 1:9, 10; 17:14; 2 Ndị Kọrint 4:4; Jemes 4:4) N’ihi ya, ndị ohu Jehova nwere àgwà guzoziri eguzozi n’ebe ịchịisi ụmụ mmadụ dị. Anyị na-anọpụ iche n’okwu ọchịchị ebe ọ bụ na anyị na-eje ozi dị ka ndị ụkọ ma ọ bụ ndị ozi nke Alaeze Chineke, anyị rarakwaara ndụ anyị nye Chineke. (2 Ndị Kọrint 5:20) N’aka nke ọzọ, anyị na-eji akọ na uche edo onwe anyị n’okpuru ndị nọ n’ọchịchị.

13. (a) Olee otú Jehova si ele gọọmenti ụmụ mmadụ anya? (b) Ruo n’ókè hà aṅaa ka ịnọ n’okpuru ndị Kraịst nye gọọmenti ụmụ mmadụ na-eru?

13 Echiche a guzoziri eguzozi na-egosipụta echiche Jehova Chineke n’onwe ya. Mgbe ike ụwa dị iche iche, ma ọ bụ ọbụna ntakịrị Mba dị iche iche, na-eji ikike ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, arụgbu ndị be ha, ma ọ bụ akpagbu ndị na-efe Chineke, ha ruru eru n’ezie inweta nkọwa amụma e nyere ha dị ka ajọ anụ ọhịa. (Daniel 7:19-21; Mkpughe 11:7) Otú ọ dị, mgbe gọọmenti mba dị iche iche mere nzube Chineke n’ịhụ na e debere iwu na usoro n’ikpe ziri ezi, ọ na-ele ha anya dị ka “ndị ozi ihu ọha” ya. (Ndị Rom 13:6, NW) Jehova na-atụ anya ka ndị ya na-akwanyere gọọmenti ụmụ mmadụ ùgwù ma na-edo onwe ha n’okpuru ha, ma ịnọ n’okpuru ha abụghị nke a na-akparaghị ókè. Mgbe ndị mmadụ chọrọ n’aka ndị ohu Chineke ihe iwu Chineke machibidoro ma ọ bụ mgbe ha jụrụ ihe ndị Chineke chọrọ ka ndị ohu ya mee, ndị ohu ya na-agbaso nguzo ndị ozi weere, nke bụ: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.

14. Olee otú e si kọwaa ịnọ n’okpuru ndị Kraịst nye gọọmenti ụmụ mmadụ site n’ọnụ Jisọs? site n’ọnụ Pọl?

14 Jisọs kwuru na ụmụazụ ya ga-enwe ibu ọrụ n’ebe ma gọọmenti ma Chineke nọ mgbe o kwupụtara, sị: “Ya mere, nyeghachinụ Siza ihe nke Siza, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.” (Matiu 22:21) Pọl onyeozi dere n’ike mmụọ nsọ, sị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya . . . Ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe ọjọọ, tụọ egwu; n’ihi na ọ bụghị n’efu ka ọ na-ebu mma agha: n’ihi na ọ bụ onye na-ejere Chineke ozi, onye ọ́bọ̀ iwetara onye na-eme ihe ọjọọ iwe. N’ihi ya ọ dị mkpa ido onwe unu n’okpuru ya, ọ bụghị nanị n’ihi iwe ahụ, kama ọ bụkwa n’ihi akọ na uche. N’ihi na ọ bụ n’ihi nke a ka unu na-atụkwa ụtụ.” (Ndị Rom 13:1, 4-6) Malite na narị afọ mbụ O.A. ruo taa, ọ dịwo ndị Kraịst mkpa ịtụle ihe Ọchịchị na-achọ. Ọ dịwo ha mkpa ịchọpụta ma ikwenye n’ihe ndị ahụ a chọrọ hà ga-eduga n’imebi ofufe ha ma ọ bụ ma ihe ndị ahụ a chọrọ hà ziri ezi ma kwesị ka e mee ha n’ihi akọ na uche.

Ụmụ Amaala Nwere Akọ na Uche

15. Olee otú Ndịàmà Jehova si enyeghachi Siza ihe ha ji ya n’ụgwọ n’ihi akọ na uche?

15 Ndị ọchịchị “na-achị isi” bụ “onye na-ejere Chineke ozi” mgbe ha na-arụ ọrụ ha Chineke kwadoro, nke gụnyere ikike ‘ịbọ ọ́bọ̀ n’ahụ ndị na-eme ihe ọjọọ na ito ndị na-eme ezi ihe.’ (1 Pita 2:13, 14) Ndị ohu Jehova na-eji akọ na uche na-enyeghachi Siza ihe ziri ezi ọ chọrọ n’ụzọ ụtụ, ha na-erukwa n’ókè akọ na uche ha e ji Bible zụọ nyere ha ohere iru ‘n’ido onwe ha n’okpuru ndị isi, n’okpuru ndị nwere ike, . . . ndị e doziworo ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.’ (Taịtọs 3:1) “Ezi ọrụ” gụnyere inyere ndị ọzọ aka, dị ka mgbe ọdachi dara. Ọtụtụ ndị agbawo akaebe banyere obiọma Ndịàmà Jehova gosiri n’ebe mmadụ ibe ha nọ n’ọnọdụ ndị a.—Ndị Galetia 6:10.

16. Ọrụ ọma dịgasị aṅaa ka Ndịàmà Jehova na-arụrụ gọọmenti na ụmụ mmadụ ibe ha n’ihi akọ na uche?

16 Ndịàmà Jehova hụrụ ụmụ mmadụ ibe ha n’anya ma na-eche na ọrụ ọma kasịnụ ha pụrụ ịrụrụ ha bụ inyere ha aka inweta ezi ihe ọmụma nke nzube Chineke iweta “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” nke ezi omume. (2 Pita 3:13) Site n’ịkụzi na idebe ụkpụrụ omume ndị dị elu nke Bible, ha bụụrụ ọha mmadụ uru, na-azọpụta ọtụtụ ndị pụọ ná nnupụisi. Ndị ohu Jehova na-edebe iwu ma na-akwanyere ndị ozi, ndị ọrụ, ndị ọkàikpe, na ndị isi obodo ùgwù, na-asọpụrụ ‘ndị e ji ụgwọ nsọpụrụ.’ (Ndị Rom 13:7) Nne na nna bụ́ Ndịàmà na-eji ọṅụ eso ndị nkụzi ụlọ akwụkwọ ụmụ ha emekọ ihe ma na-enyere ụmụ ha aka ịmụ ihe nke ọma, ka, mgbe e mesịrị, ụmụ ha wee nwee ike inweta ihe e ji ebi ndụ ghara ịbụrụ ọha mmadụ ibu arọ. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:11, 12) N’ime ọgbakọ ha dị iche iche, Ndịàmà na-emegide ajọ mbunobi agbụrụ na ịkpa ókè ọkwá, ha na-ejikwa iwusi ndụ ezinụlọ ike akpọrọ oké ihe. (Ọrụ 10:34, 35; Ndị Kọlọsi 3:18-21) Ya mere, site n’omume ha, ha na-egosi na ebubo nile nke ha ịdị na-emegide ezinụlọ ma ọ bụ ghara ịdị na-enyere ógbè ha aka bụ ụgha. Otú a, okwu nke Pita onyeozi na-aghọ eziokwu: “Otú a ka ọchịchọ nke Chineke si dị, ka unu site n’ime ezi ihe mee ka amaghị ihe nke ndị na-enweghị uche kpuchie ọnụ.”—1 Pita 2:15.

17. Olee otú ndị Kraịst pụrụ isi ‘na-ejegharị n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ’?

17 Ya mere ọ bụ ezie na ezi ụmụazụ Kraịst “esiteghị n’ụwa,” ha ka nọ n’ime ụwa nke ọha mmadụ, ha aghaghịkwa ịnọgide ‘na-ejegharị n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ.’ (Jọn 17:16; Ndị Kọlọsi 4:5) Ruo oge Jehova kwere ka ndị na-achị isi na-arụ ọrụ dị ka ndị na-ejere ya ozi, anyị ga-akwanyere ha ùgwù kwesịrị ekwesị. (Ndị Rom 13:1-4) Ka anyị na-anọgide na-anọpụ iche n’ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị, anyị ga na-ekpe ekpere n’isi “ndị eze na ndị nile nọ n’ọnọdụ dị elu,” karịsịa mgbe a kpọkuru ndị a ime mkpebi ndị pụrụ imetụta nnwere onwe ife ofufe. Anyị ga-anọgide na-eme nke a “ka anyị wee biri obi udo na nke dị nwayọọ n’ime nsọpụrụ Chineke nile na ikwesị nsọpụrụ nile,” ka e wee “zọpụta mmadụ nile.”—1 Timoti 2:1-4.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, isi nke 35, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

Ajụjụ Ntụleghachi

◻ Olee “ụwa” nke ndị Kraịst sitere na ya, ma olee “ụwa” nke ha na-apụghị isite na ya?

◻ Gịnị ka “akara” nke “anụ ọhịa” ahụ n’aka ma ọ bụ n’egedege ihu mmadụ bụ ihe atụ ya, oleekwa akara ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi nwere?

◻ Echiche dị aṅaa guzoziri eguzozi ka ezi ndị Kraịst nwere n’ebe gọọmenti ụmụ mmadụ dị?

◻ Olee ụzọ ụfọdụ Ndịàmà Jehova si etinye ihe n’ọdịmma ọha mmadụ?

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Bible na-akọwa gọọmenti ụmụ mmadụ dị ka ma onye na-ejere Chineke ozi ma anụ ọhịa

[Foto dị na peeji nke 17]

N’ihi igosi nchegbu ịhụnanya maka ndị ọzọ, Ndịàmà Jehova bụụrụ ógbè ha uru

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya