Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 1/15 p. 23-28
  • Iwusi Okwukwe Anyị n’Okwu Chineke Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iwusi Okwukwe Anyị n’Okwu Chineke Ike
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Okwu Chineke Bụ Eziokwu—Ihe Ndabere nke Okwukwe Anyị
  • Ṅomie “Onye Mmezu nke Okwukwe Anyị”
  • Dị Ndụ Site n’Okwukwe
  • Nwee Okwukwe ná Nkwa Ndị Jehova Kwere
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ì Nwere Okwukwe N’ezie N’ozi Ọma Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Nwee Okwukwe nke Dabeere n’Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • “Nyekwuo Anyị Okwukwe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 1/15 p. 23-28

Iwusi Okwukwe Anyị n’Okwu Chineke Ike

ỌNỤ ọgụgụ mmadụ ka ukwuu agụwo Bible karịa akwụkwọ ọ bụla ọzọ. Ma mmadụ ole gosipụtaworo okwukwe n’ozi ya? Bible n’onwe ya na-akọwa na “ọ bụghị mmadụ nile nwere okwukwe.” (2 Ndị Tesalọnaịka 3:2) N’ụzọ doro anya, a mụkọtaghị anyị na okwukwe. A ghaghị ịzụlite ya. Ọbụna ndị nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke okwukwe ekwesịghị iwere ya n’ihe dị nta. Okwukwe pụrụ imebi ma nwụọ. Ya mere, mgbalị dị mkpa iji nọgide na-adị “ezi ndụ n’ime okwukwe.”—Taịtọs 2:2.

Mgbe ahụ, e nwere ezi ihe mere Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova ji họrọ isiokwu bụ́ “Okwukwe n’Okwu Chineke” maka usoro mgbakọ distrikti ha nke afọ 1997/1998. Ọtụtụ nde Ndịàmà na ndị ọzọ esiwo otú a nwee ihe ùgwù izukọta iji wusie okwukwe ha n’Okwu Chineke ike.

Okwu Chineke Bụ Eziokwu—Ihe Ndabere nke Okwukwe Anyị

Nke a bụ isiokwu ụbọchị mbụ nke mgbakọ ahụ. O ji okwu ịja mma nye ndị nile bịaranụ malite. Ịnọ ya ná mgbakọ ahụ bụ ihe àmà nke nkwanye ùgwù maka Bible. Ma, a jụrụ ajụjụ ndị na-akpali iche echiche banyere ọdịdị nke okwukwe anyị: ‘Ànyị nwere ike ịgọpụrụ nkwenkwe anyị, na-eji Okwu Chineke eme ihe dị ka ebe ndabere anyị? Ànyị na-egosi ekele maka nri ime mmụọ, n’ewereghị Bible, nzukọ ọgbakọ, na akwụkwọ ndị dabeere na Bible mgbe ọ bụla n’ihe nkịtị? Ànyị na-eto eto n’ịhụnanya, ezi ihe ọmụma, na nghọta?’ Ọkà okwu ahụ gbara mmadụ nile ume ige ntị nke ọma, na-arịba ama na “a kwadebewo Mgbakọ Distrikti ‘Okwukwe n’Okwu Chineke’ nke a iji nyere anyị aka ịtụchasị onwe anyị na inyocha ọ̀tụ̀tụ̀ na ọdịdị nke okwukwe anyị nwere n’otu n’otu.”

A kpọrọ okwu bụ isi “Isite n’Okwukwe Na-ejegharị, Ọ Bụghị n’Ọhụhụ Ụzọ.” (2 Ndị Kọrint 5:7) “Okwukwe nke ndị ghọrọ Ndịàmà Jehova abụghị ikwere n’ajụghị ase,” ka ọkà okwu ahụ kwuru. Lee ka nke a siri bụrụ eziokwu! Ezi okwukwe ekpughị ìsì. Ọ dabeere n’ihe ndị bụ ezie. Ndị Hibru 11:1 na-asị: “Okwukwe bụ ndabere nke ihe a na-ele anya, bụrụkwa nnwapụta nke ihe a na-ahụghị anya.” Ọkà okwu ahụ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anyị ga-esite n’okwukwe na-ejegharị n’ezie, okwukwe nwere ezi mkpọrọgwụ dị anyị mkpa.” N’ihi na anyị na-ejegharị site n’okwukwe, ọ bụghị n’ọhụhụ ụzọ, ọ dịghị anyị mkpa ịmatacha ihe nile banyere otú na mgbe Jehova ga-emezu akụkụ ọ bụla nke nzube ya. Ihe anyị mawooro banyere ya na-enye anyị obi ike zuru ezu n’ike ya imezu nkwa ya n’ịhụnanya na n’ụzọ ziri ezi.

Okwu bụ́ “Ndị Ntorobịa Bụ́ Ndị Kraịst—Akụkụ Dị Mkpa nke Ọgbakọ” chetaara ndị na-eto eto otú ha si dị oké ọnụ ahịa nye Jehova. A gbara ha ume ito eto n’ụzọ ime mmụọ site n’ịchụso ihe mgbaru ọsọ ndị dị ka ịgụzu Bible na iru ihe ndị a chọrọ maka nraranye na baptism. Nchụso nke inwetakwu agụmakwụkwọ bụ okwu dịịrị onwe onye nke mmadụ ga-esoro ndị mụrụ ya kpebie, ma ọ bụrụ na a malite ya, ebumnobi ya kwesịrị ịbụ mgbe nile iji jikere anyị ijere Chineke ozi n’ụzọ dị irè karị. Agụmakwụkwọ ụwa pụrụ ije ozi bara uru mgbe anyị ‘na-anwa ihe ha na ibe ha dị iche’ bụ́ ndị metụtara okwukwe anyị.—Ndị Filipaị 1:9, 10.

Usoro isiokwu nwere okwu atọ sochiri n’isiokwu bụ́ “Ụkpụrụ Ònye Ka Ị Na-edebe?” Okwukwe n’Okwu Chineke na-akwali anyị ịrapagidesi ike n’ụkpụrụ Bible. Ndị Kraịst na-erubere iwu na ụkpụrụ Jehova isi. Dị ka ihe atụ, Akwụkwọ Nsọ na-adụ anyị ọdụ ka anyị ghara ikwu okwu rụrụ arụ na nkwulu. (Ndị Efesọs 4:31, 32) Ọkà okwu ahụ jụrụ, sị: “Mgbe a kpasuru gị iwe ma ọ bụ nye gị mgbakasị ahụ, ị̀ na-awụkwasị di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ ụmụ gị nkwulu?” N’ezie, nke ahụ agaghị abụ àgwà ndị Kraịst. Chineke nwekwara ụkpụrụ banyere ọdịdị onwe onye anyị. Ndị Kraịst kwesịrị iwere “ihe ịchọ mma kwesịrị ekwesị chọọ onwe ha mma, ya na nsọpụrụ.” (1 Timoti 2:9, 10) Okwu ahụ bụ “nsọpụrụ” na-enye echiche nke ùgwù onwe onye, echiche nke nsọpụrụ, anya udo, na imeru ihe n’ókè. Ịhụnanya maka ndị ọzọ na-akwali anyị, ụkpụrụ Bible na echiche nke ihe kwesịrị ekwesị na-eduzikwa anyị.

Okwu abụọ na-esochi gụnyere ntụle nke amaokwu n’amaokwu nke Ndị Hibru 3:7-15 na 4:1-16. Akụkụ Bible ndị a na-adọ anyị aka ná ntị megide ihe ize ndụ nke ịbụ ‘ndị e mere ka obi ha mee etili site n’aghụghọ nke mmehie.’ (Ndị Hibru 3:13) Olee otú anyị pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma n’ọgụ anyị na-alụso mmehie? Jehova na-enyere anyị aka site n’Okwu ya. N’ezie, “okwu Chineke dị ndụ na-arụsikwa ọrụ ike . . . bụrụkwa ihe nwere ike ịtụpụta echiche na izù nile nke obi.”—Ndị Hibru 4:12.

Okwu ikpeazụ n’ụbọchị mbụ nke mgbakọ ahụ bụ “Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile.” O mere ka ịbụ eziokwu, izi ezi, na abamuru nke Bible pụta ìhè. Lee ihe na-akpali mmasị ọ bụ ịnụ ka ọkà okwu ahụ mara ọkwa mwepụta nke broshuọ ọhụrụ dị peji 32 nke isiokwu ya bụ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile! A kwadebere mbipụta ọhụrụ a karịsịa maka ndị, n’agbanyeghị na ha gụrụ akwụkwọ, maara ihe dị nta banyere Bible. Okwu ahụ ji okwu ndị a mechie: “Ọ dị ndị mmadụ mkpa inyocha Okwu Chineke n’onwe ha. Obi siri anyị ike na ọ bụrụ na ha emee nnyocha n’onwe ha, ha ga-abịa kwenye na akwụkwọ a pụrụ iche, bụ́ Bible, bụ n’ezie akwụkwọ dịịrị mmadụ nile!”

Ṅomie “Onye Mmezu nke Okwukwe Anyị”

Isiokwu a maka ụbọchị nke abụọ nke mgbakọ ahụ dọọrọ uche gaa na Jisọs Kraịst, “onye mmezu nke okwukwe anyị.” Ọ dị anyị mkpa ‘iso ijeụkwụ Ya nile.’ (Ndị Hibru 12:2; 1 Pita 2:21) A na-agwa ọtụtụ ndị nọ na Krisendọm: ‘Kwere n’Onyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụtakwa gị!’ Ma ọ̀ gwụla ebe okwukwe jedebere? Bible na-eme ka o doo anya na “okwukwe bụ ihe nwụrụ anwụ ma ọrụ adịghị ya.” (Jemes 2:26) N’ihi ya, e wezụga ikwere na Jisọs, anyị aghaghị ịrụ ọrụ ọ rụrụ, karịsịa site n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke.

Usoro ihe omume ụtụtụ lekwasịrị anya n’ọrụ ikwusa ozi ọma. Dị ka Pọl, anyị kwesịrị inwe ịnụ ọkụ n’obi n’izisa ozi ọma nke nzọpụta. (Ndị Rom 1:14-16) Jisọs kwusaara ndị mmadụ ozi ọma n’ebe nile. Ọ bụ ezie na ije ozi ụlọ n’ụlọ anyị na-arụpụta ihe, ọtụtụ ndị mmadụ adịghị anọ n’ụlọ mgbe anyị gara. (Ọrụ 20:20) Ọtụtụ nọ n’ụlọ akwụkwọ, na-arụ ọrụ, na-azụ ahịa, ma ọ bụ na-eme njem. Ya mere, ọ dịkwa anyị mkpa ikwusa ozi ọma n’ebe ọha na eze na-anọ nakwa ebe ọ bụla a pụrụ ịchọta ndị mmadụ.

Okwu bụ́ “Gbanye Mkpọrọgwụ ma Guzosie Ike n’Eziokwu Ahụ” chetaara anyị ọnụ ọgụgụ bara ụba nke ndị na-eso ụzọ ọhụrụ a na-eme baptism—nkezi nke ihe karịrị 1,000 kwa ụbọchị! Ọ dị mkpa ka ndị ọhụrụ a gbanyesie mkpọrọgwụ ike ma guzosie ike n’okwukwe. (Ndị Kọlọsi 2:6, 7) Ọkà okwu ahụ kọwara na mkpọrọgwụ nkịtị na-amịta mmiri na ihe oriri ma na-enyekwa ihe ọkụkụ ahụ nkwụsi ike ma ọ bụ nkwado. N’otu aka ahụ, site n’ezi àgwà nke ịmụ ihe na mkpakọrịta na-ewuli elu, ndị na-eso ụzọ ọhụrụ pụrụ ịkwụsi ike n’eziokwu.

Ndụmọdụ a kwesịrị ekwesị karịsịa maka ndị a gaje ime baptism. Ee, n’ụbọchị nke abụọ nke mgbakọ ahụ, e mere ìgwè ndị na-eso ụzọ ọhụrụ baptism, n’ịgbaso ihe nlereanya Jisọs. Okwu bụ́ “Okwukwe n’Okwu Chineke Na-eduje na Baptism” chetaara ndị a gaje ime baptism na ịbụ ndị e mikpuru kpam kpam n’ime mmiri bụ ihe atụ kwesịrị ekwesị nke ha ịnwụ n’ebe ụzọ ndụ mbụ ha nke ọchịchọ onwe onye nanị dị. Ha ịbụ ndị e si na mmiri kulite na-anọchite anya ha ịbụ ndị e mere ka ha dị ndụ ime uche Chineke.

Okwu bụ́ “Na-agbasi Mgba Ike n’Ihi Okwukwe Ahụ” dabeere n’akwụkwọ Bible bụ́ Jud. A gbara anyị ume ichebe okwukwe anyị site n’ịjụ mmetụta ọjọọ nile ndị dị ka omume rụrụ arụ, nnupụisi, na ndapụ n’ezi ofufe. Ọzọ, ndị mụrụ ụmụ—karịsịa ndị nna—nwetara nlebara anya pụrụ iche n’okwu bụ́ “Mee Ndokwa Maka Ezinụlọ Gị.” Inye ezinụlọ ihe ime mmụọ, anụ ahụ, na mkpa mmetụta uche bụ ibu ọrụ Akwụkwọ Nsọ kwadoro. (1 Timoti 5:8) Nke a chọrọ oge, nkwurịta okwu, na ịnọ nso. Jehova Chineke nwere mmasị n’ezie n’ọrụ siri ike ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst na-arụ n’ịzụlite ụmụ ha n’eziokwu.

Usoro isiokwu sochiri, bụ́ “Ka Anyị Jee n’Ụlọ Jehova,” wulitere mmasị maka nzukọ ndị Kraịst. Ha na-enye izu ike pụọ ná nchegbu nke ụwa a. Ná nzukọ, anyị nwere ohere maka ịgbarịta ibe anyị ume, anyị pụkwara igosipụta ịhụnanya anyị maka ndị kwere ekwe ibe anyị. (Ndị Hibru 10:24, 25) Nzukọ na-enyekwara anyị aka ịmụcha nkà izi ihe anyị dị ka ndị ozizi, ha na-emekwa ka nghọta anyị banyere nzube Chineke mie emi. (Ilu 27:17) Ka anyị ghara ikewapụ onwe anyị n’ọgbakọ ma ọlị, ka anyị na-echetakwa okwu Jisọs ndị ahụ bụ́: “Ebe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ zukọworo n’aha m, n’ebe ahụ ka M nọ n’etiti ha.”—Matiu 18:20.

Okwu ikpeazụ nke ụbọchị ahụ bụ “Ọdịdị nke Okwukwe Gị—A Na-anwale Ya Ugbu A.” Okwukwe a na-anwalebeghị enweghị uru a nwapụtara anwapụta, ọdịdị ya ka bụkwa nke a na-amaghị. Ọ dị ka akwụkwọ ndọrọ ego a na-ejibeghị dọrọ ego. Ò ruru n’ezie ego ole e dere na ya? N’otu aka ahụ, a ghaghị ịnwale okwukwe anyị iji nwapụta na ọ bara uru, bụrụkwa ezigbo ya. (1 Pita 1:6, 7) Ọkà okwu ahụ sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ndị ụkọchukwu na ndị dapụrụ n’ezi ofufe na-aghọgbu usoro mgbasa ozi nakwa ndị ọchịchị gaa n’inye anyị aha ọjọọ, na-akọjọ nkwenkwe ndị Kraịst na ụzọ ndụ anyị. . . . Ànyị ga-ekwe ka ndị Setan mere ka ha kpuo ìsì menye anyị ụjọ ma mee ka obi lọọ anyị mmiri, meekwa ka ihere ozi ọma ahụ na-eme anyị? Ànyị ga-ekwere ka ụgha dị iche iche banyere eziokwu ahụ metụta anyị ịgachi nzukọ anya na ọrụ nkwusa anyị? Ka ànyị ga-eguzosi ike ma nwee obi ike, kpebisiekwa ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ ịnọgide na-akpọsa eziokwu ahụ banyere Jehova na Alaeze ya?”

Dị Ndụ Site n’Okwukwe

Isiokwu ụbọchị nke atọ nke mgbakọ ahụ dabeere n’okwu Pọl bụ́: “Ọ pụtara ìhè na ọ dịghị onye ọ bụla a na-agụ n’onye ezi omume n’iwu n’ihu Chineke: n’ihi na, Onye ezi omume ga-esite n’okwukwe dị ndụ.” (Ndị Galetia 3:11) Usoro isiokwu ahụ, bụ́ “Okwu Amụma Joel Maka Ụbọchị Anyị,” bụ otu n’ime isi ihe ndị pụtara ìhè n’ụtụtụ ahụ. Akwụkwọ Joel na-ezo aka n’oge anyị, na-asịkwa n’echiche nke ịdị ngwa: “Ewo, ụbọchị ahụ! N’ihi na ụbọchị Jehova dị nso, dị ka mbibi nke sitere n’aka Onye pụrụ ime ihe nile ka ọ ga-abịa.” (Joel 1:15) N’ụzọ yiri nke igurube ndị ike na-adịghị agwụ agwụ, ndị Kraịst e tere mmanụ ekwebeghị ka ihe ọ bụla gbochie ha ịkpọsa Alaeze n’oge ọgwụgwụ a.

Akwụkwọ Joel na-enyekwa olileanya, na-asị: “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova, a ga-eme ka o wepụga onwe ya.” (Joel 2:32) Nke a pụtara ihe karịrị nanị iji aha Jehova eme ihe. Nchegharị sitere n’obi dị mkpa, nke a na-agụnye ịgbakụta omume ọjọọ azụ. (Joel 2:12, 13) Ohere adịghị igbu oge n’ihi na Jehova ga-eme ihe e kpere n’ikpe n’isi nso n’isi mba nile, ọbụna dị ka o mere n’isi Moab, Amọn, na ógbè ebe ugwu nke Sia n’ụbọchị Eze Jehoshafat nke Juda.—2 Ihe E Mere 20:1-30; Joel 3:2, 12.

A gbara mmadụ nile ume site n’okwu bụ́ “Gosi Okwukwe Site n’Ichere Jehova.” Ka oge ọgwụgwụ a na-agami ugbu a, anyị pụrụ ileghachi anya azụ ná mmezu nke nkwa Jehova ndị mezuworonụ, anyị nwekwara oké mmasị n’ihe ndị ka ga-emezunụ. Ndị Jehova aghaghị ịnọgide na-enwe ndidi, na-echeta na ihe nile Chineke kweworo ná nkwa ga-eme.—Taịtọs 2:13; 2 Pita 3:9, 10.

Usoro ihe omume nke ụtụtụ ji ihe nkiri bụ́ “Ka Anya Gị Na-ele Otu Ebe” mechie. Ihe nkiri a nke ihe ndị na-eme eme gbara anyị ume inyocha àgwà anyị banyere nchụso ihe onwunwe. N’agbanyeghị ebe anyị bi, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ndụ anyị ghara ijupụta ná nchegbu, anyị aghaghị ịgbaso ndụmọdụ Jisọs ime ka anya anyị lekwasị n’otu ebe, na-elekwasị anya kpọmkwem n’Alaeze Chineke.—Matiu 6:22.

Okwu ihu ọha nwere isiokwu na-akpali mmasị bụ́ “Okwukwe na Ọdịnihu Gị.” O nyere ihe nnwapụta nke adịghị ike nke ndị ndú bụ́ mmadụ ịgwọta nsogbu nke ụwa. (Jeremaịa 10:23) Akụkọ ihe mere eme nke mmadụ anọgidewo na-emeghachi—n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka ukwuu ma na-ebibi ihe karị. Gịnị bụ echiche Ndịàmà Jehova banyere ọdịnihu? Anyị kwere na ihe a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi nwere ọdịnihu na-egbuke egbuke n’okpuru Alaeze Chineke. (Matiu 5:5) Chineke ga-emezu nkwa ya maka abamuru nke ndị nile nwere okwukwe n’Okwu ya, bụ́ nke na-agba ume, sị: “Chọọnụ Jehova mgbe a na-achọta Ya, kpọkuonụ Ya mgbe Ọ nọ nso.”—Aịsaịa 55:6.

Jisọs welitere otu ajụjụ dị mkpa banyere ụbọchị anyị. Ọ jụrụ, sị: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa, Ọ̀ ga-ahụ okwukwe n’elu ụwa?” (Luk 18:8) Okwu ikpeazụ tụleghachiri usoro ihe omume mgbakọ ahụ ma gosi otú o siworo nye ihe àmà dị ịrịba ama na okwukwe n’Okwu Chineke dị adị, ọ bụ ezie na anyị na-ebi n’ụwa na-enweghị okwukwe na nke ekweghị n’okpukpe.

Ma, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị n’otu n’otu, sị, ‘Èso m ná ndị nwere okwukwe na-adịghị aṅagharị aṅagharị na Chineke na Okwu ya?’ Mgbakọ Distrikti “Okwukwe n’Okwu Chineke” kwesịrị inyere anyị aka ịza ee nye ajụjụ ahụ. Leekwa aha ekele anyị nwere n’ebe Jehova nọ maka iwusi okwukwe anyị ike n’ebe ọ nọ na n’Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible!

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Ọtụtụ ndị ọrụ afọ ofufo jiri obi ụtọ rụọ ọrụ n’inye ọtụtụ puku ndị bịara mgbakọ ebe obibi

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

E ji ámá egwuregwu ndị buru ibu dị ka nke a mee ihe gburugburu ụwa

[Foto dị na peeji nke 25]

L. A. Swingle nke Òtù Na-achị Isi ka ọ na-ewepụta broshuọ ọhụrụ ahụ

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

E mere ọtụtụ ndị baptism ná ngosipụta nke nrara ha nye Jehova

[Foto ndị dị na peeji nke 27]

Ndị bịara mgbakọ ji ọṅụ bụọ abụ Alaeze. N’ime ime: ihe nkiri “Ka Anya Gị Na-ele Otu Ebe”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya