Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 2/1 p. 24-28
  • “Ebere Gị Dị Mma Karịa Ndụ”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ebere Gị Dị Mma Karịa Ndụ”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịnata Ọzụzụ Maka Ozi
  • Mmalite nke Ọrụ Na-adịru Oge Ndụ Nile
  • Ihe Ùgwù Ije Ozi Ndị Pụrụ Iche
  • Canada Nakwa Ịga Belgium
  • Ọrụ A Mụbara Amụba Mgbe Agha Gasịrị
  • Ikwekọ n’Ọnọdụ Ndị Dịnụ
  • Onye Jehova Ziri Ihe Site na Nwata
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Nhọrọ Ndị Ziri Ezi M Mere Ewetara m Ngọzi Na-adịgide Adịgide
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Nne na Nna Anyị Kụziiri Anyị Ịhụ Chineke n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ihe Nketa Ndị Kraịst nke Dị Ụkọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 2/1 p. 24-28

“Ebere Gị Dị Mma Karịa Ndụ”

Dị ka Calvin H. Holmes si kọọ

Ọ bụ December nke 1930, m ka pịpụtasịkwara mmiri ara n’ehi mgbe papa m si na nke onye agbata obi bi nso lọta. “Nke a bụ akwụkwọ Wyman gbazinyere m,” ka o kwuru ka o wepụtara otu akwụkwọ na-acha anụnụ anụnụ n’akpa uwe ya. Aha ya bụ Deliverance, nke Watch Tower Bible and Tract Society bipụtara. Papa m, bụ́ onye ọ na-esiri ike ịgụ ihe ọ bụla, gụrụ akwụkwọ ahụ banye n’ime abalị.

E MESỊA, papa m gbazitere akwụkwọ ndị ọzọ, nwere aha ndị dị ka Light na Reconciliation, nke otu ndị ahụ bipụtara. Ọ chọtara Bible ochie mama m ma nọtee anya n’ime abalị iji wee gụọ ya n’ìhè ọkụ oriọna. Papa m gbanwere n’ụzọ dị ukwuu. N’oge oyi ahụ ọ gwara anyị okwu ruo ọtụtụ hour—nne m, ụmụnne m ndị inyom atọ, na mụ—ka anyị gbara ekwú ochie anyị gburugburu.

Papa sịrị na a na-akpọ ndị na-ebipụta akwụkwọ ndị a Ndị Mmụta Bible nakwa na, dị ka ha si ekwu, anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5) Ọ kọwara na a gaghị ebibi ala n’oge ọgwụgwụ ụwa kama na n’okpuru Alaeze Chineke a ga-agbanwe ya ịghọ paradaịs. (2 Pita 3:5-7, 13; Mkpughe 21:3, 4) Nke ahụ dara m nnọọ ka ihe na-akpali mmasị.

Papa m malitere ịgwa m okwu ka anyị so na-aga ije. Echetara m na anyị na-afụcha ọka mgbe ọ kọwara na aha Chineke bụ Jehova. (Abụ Ọma 83:18) N’ihi ya, n’oge opupu ihe ubi 1931, mgbe m dị nanị afọ 14, eweere m nguzo m maka Jehova na Alaeze ya. Ekpegaara m Jehova ekpere n’ubi mkpụrụ osisi apple ochie dị n’azụ ụlọ ma kwesie nkwa ike na m ga-ejere ya ozi ruo mgbe ebighị ebi. Ebere Chineke anyị dị ebube emetụworị m n’obi.—Abụ Ọma 63:3.

Anyị biri n’ubi dị ihe dị ka kilomita 30 site na St. Joseph, Missouri, U.S.A., nakwa ihe na-erughị kilomita 65 site na Kansas City. A mụrụ papa m n’ime obere ụlọ e ji osisi rụọ nke nna nna m ochie wururịị n’ubi ahụ ná mmalite narị afọ nke 19.

Ịnata Ọzụzụ Maka Ozi

N’oge okpomọkụ 1931, ezinụlọ anyị nụrụ na redio okwu ihu ọha bụ́ “Alaeze ahụ, Olileanya nke Ụwa,” nke Joseph Rutherford, onye isi oche nke Watch Tower Society n’oge ahụ, kwuru n’otu mgbakọ na Columbus, Ohio. Ọ kpaliri obi m, m nwekwara obi ụtọ isoro papa m kere òkè n’ikesara ndị anyị maara akwụkwọ nta okwu ihu ọha a dị mkpa dị n’ime ya.

N’oge opupu ihe ubi 1932, agara m nzukọ Ndịàmà Jehova na nke mbụ ya. Onye agbata obi anyị kpọrọ mụ na papa m òkù ịnụrụ okwu nke George Draper, bụ́ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova, ga-ekwu na St. Joseph. Mgbe anyị garuru, nzukọ ahụ agaala ọkara, m chọtakwara ebe m nọdụrụ ala n’azụ gbara agba ma saa mbara nke J. D. Dreyer, bụ́ onye gaje ịrụ ọrụ dị mkpa ná ndụ m.

Na September 1933, esooro m papa m gaa otu mgbakọ na Kansas City, bụ́ ebe m keere òkè na nke mbụ ya ná nkwusa ihu ọha. Papa m nyere m akwụkwọ nta atọ ma kụziere m ikwu, sị: “Abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. Obi abụọ adịghị ya na ị nụwo okwu Judge Rutherford na redio. Ihe karịrị ụlọ ọrụ 300 na-agbasa okwu ya kwa izu.” Mgbe ahụ m nyefee akwụkwọ nta ahụ. N’uhuruchi ahụ, ka m nọ n’ugbo na-apị mmiri ara ehi, echere m na nke a abụrụwo ụbọchị kwesịkarịrị ncheta ná ndụ m.

N’oge na-adịghị anya oge oyi malitere, anyị enwechakwaghị ike ime njem. Ma mgbe ahụ Nwanna Dreyer na nwunye ya bịara ma jụọ ma m ga-achọ ịbịa n’ụlọ ha n’uhuruchi Saturday ma nọruo echi ya. Iji ụkwụ gaa kilomita 10 iji ruo n’ụlọ Dreyer kwesịrị mgbalị e tinyere maka ya n’ihi na m nwere ike isoro ha gaa ozi n’echi ya ma gaa Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na St. Joseph. Kemgbe ahụ, ọ na-esi ike tupu mụ ahapụ ikere òkè n’ozi n’ụbọchị Sunday. Ọzụzụ na ndụmọdụ Nwanna Dreyer mesịrị baa oké uru.

Na September 2, 1935, m mesịrị nwee ike igosipụta nrara m raara onwe m nye Jehova site na baptism ime mmiri n’otu mgbakọ na Kansas City.

Mmalite nke Ọrụ Na-adịru Oge Ndụ Nile

Ná mbido 1936, etinyere m akwụkwọ ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye ozi oge nile, a gụnyekọrọ m n’etiti ndị na-achọ onye ha na ya ga-eso na-asụ ụzọ. N’oge na-adịghị anya ka e mesịrị anatara m akwụkwọ ozi site n’aka Edward Stead nke Arvada, Wyoming. Ọ kọwara na ya apụghị isi n’oche nkwagharị bilie, chọọkwa enyemaka iji na-asụ ụzọ. Anakweere m arịrịọ ya ozugbo, a họpụtakwara m dị ka onye ọsụ ụzọ n’April 18, 1936.

Tupu mụ apụọ isonyere Nwanna Stead, nne m gwara m okwu nanị m. “Nwa m nwoke, ì ji n’aka na nke a bụ ihe ị chọrọ ime?” ka ọ jụrụ.

“Ndụ agaghị adị ụtọ ma ọ bụghị otú ahụ,” ka m zaghachiri. Aghọtawo m na ebere Jehova dị mkpa karịa ihe ọ bụla ọzọ.

Iso Ted, dị ka anyị si akpọ Nwanna Stead, arụ ọrụ ọsụ ụzọ bụ ọzụzụ magburu onwe ya. Ọ na-anụ ọkụ n’obi nke ukwuu, nweekwa ụzọ dị nnọọ ụtọ nke iche ozi Alaeze ahụ n’ihu mmadụ. Ma ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na nanị ihe Ted pụrụ ime bụ ide ihe na ikwu okwu, ọrịa rheumatoid arthritis kụchiri nkwonkwo ya nile. M na-ebili n’isi ụtụtụ saa ya ahụ ma kpụọ ya ajị́ agba, kwadebe nri ụtụtụ, ma nye ya ihe oriri. Mgbe ahụ m na-eyiwe ya ákwà ma jikere ya maka ozi. N’oge okpomọkụ ahụ anyị sụrụ ụzọ na Wyoming na Montana, na-ehi n’ámá n’abalị. Ted na-arahụ n’ọnụ ụlọ pụrụ iche e wunyere n’azụ pikọpụ ya, m na-arahụkwa n’ala. Ka oge na-aga n’afọ ahụ akwagara m n’ebe ndịda ịsụ ụzọ na Tennessee, Arkansas, na Mississippi.

Na September 1937, agara m mgbakọ ukwu mbụ m na Columbus, Ohio. N’ebe ahụ e mere ndokwa iji phonogragh na-ebute ụzọ n’ọrụ nkwusa ahụ. Anyị kpọrọ oge ọ bụla anyị ji phonograph mee ihe otu nguzobe. N’otu ọnwa enwere m ihe karịrị nguzobe 500, ihe karịrị mmadụ 800 gere ntị. Mgbe m mesịrị nkwusa n’ọtụtụ obodo nke ọwụwa anyanwụ Tennessee, Virginia, na Ọdịda Anyanwụ Virginia, a kpọrọ m òkù ije ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ọkwá ọhụrụ, na-eso onye ohu zoonu, dị ka e si akpọ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị mgbe ahụ, arụ ọrụ.

Eletara m ọgbakọ na ìgwè ndị nọpụrụ iche n’Ọdịda Anyanwụ Virginia—na-eso nke ọ bụla ruo izu abụọ ruo anọ—butekwa ụzọ n’ozi ubi. E mesịa, na January 1941, a họpụtara m dị ka onye ohu zoonu. Ka ọ na-erule mgbe ahụ Mama na ụmụnne m ndị inyom atọ—Clara, Lois, na Ruth—ewerewo nguzo ha maka Alaeze ahụ. Ya mere ezinụlọ anyị dum gakọrọ mgbakọ ukwu ahụ ọnụ na St. Louis n’oge okpomọkụ.

N’oge na-adịghị anya mgbe mgbakọ ahụ gasịrị, a gwara ndị ohu zoonu na ọrụ zoonu ga-akwụsị ná ngwụsị November 1941. N’ọnwa na-eso ya United States banyere n’Agha Ụwa nke Abụọ. E kenyere m ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche, bụ́ nke chọrọ ka e tinye hour 175 n’ozi kwa ọnwa.

Ihe Ùgwù Ije Ozi Ndị Pụrụ Iche

Na July 1942, anatara m akwụkwọ ozi jụrụ ma m ga-adị njikere ije ozi n’ofesi. Mgbe m kwetasịrị, a kpọrọ m òkù ịga Betel, bụ́ isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova, dị na Brooklyn, New York. A kpọrọ ihe dị ka ụmụnna nwoke 20 n’alụghị nwunye òkù maka ọzụzụ pụrụ iche n’otu oge ahụ.

Nathan H. Knorr, bụ́ onye isi oche nke Watch Tower Society mgbe ahụ, kọwara na ọrụ ime nkwusa ebelatawo nakwa na a ga-enye anyị ọzụzụ iji wusie ọgbakọ ike n’ụzọ ime mmụọ. “Anyị achọghị ịma nanị ihe na-adịghị agazi agazi n’ọgbakọ,” ka o kwuru, “kama ihe i mere banyere ya.”

Mgbe anyị nọ na Betel, Fred Franz, bụ́ onye nọchiri Nwanna Knorr dị ka onye isi oche na 1977, kwuru okwu nke ọ nọ n’ime ya kwuo, sị: “Agha Ụwa nke Abụọ ga-akwụsị, ọrụ ime nkwusa dị ukwuu ga-emeghepụkwa. Obi abụọ adịghị ya na a ka ga-achịkọbata ọtụtụ nde ná nzukọ Jehova!” Okwu ahụ gbanwere ụzọ m si ele ihe anya kpam kpam. Mgbe e kenyegasịrị ọrụ, e mere ka m mara na m ga-eleta ọgbakọ nile dị na steti Tennessee na Kentucky. A kpọrọ anyị ndị ohu nke ụmụnna, bụ́ aha a gbanweworo eri oge ịbụ onye nlekọta sekit.

Amalitere m ijere ọgbakọ dị iche iche ozi n’October 1, 1942, mgbe m ka dị nanị afọ 25. N’oge ahụ nanị ụzọ e si agaru ọgbakọ ụfọdụ bụ iji ụkwụ ma ọ bụ ịgba ịnyịnya. Mgbe ụfọdụ mụ na ezinụlọ m binyeere na-ehi ụra n’otu ọnụ ụlọ.

Mgbe m na-eje ozi n’Ọgbakọ Greeneville dị na Tennessee na July 1943, anatara m ọkpụkpọ òkù ịga klas nke abụọ nke Watchtower Bible School of Gilead. Na Gilead, amụtara m ihe ọ pụtara n’ezie “ịṅabiga ntị ókè karị n’ihe a nụrụ” na ‘ịrụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè’ mgbe nile. (Ndị Hibru 2:1; 1 Ndị Kọrint 15:58) Ọnwa ise nke ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ ahụ gabigara ngwa ngwa, ụbọchị ngụsị akwụkwọ bịakwara na January 31, 1944.

Canada Nakwa Ịga Belgium

E kenyere ọtụtụ n’ime anyị ịga Canada, bụ́ ebe e wepụrụ mmachibido iwu n’ọrụ Ndịàmà Jehova n’oge na-adịbeghị anya. E kenyere m ọrụ njegharị, bụ́ nke chọrọ ịgazu ebe tere anya n’agbata ọgbakọ ụfọdụ. Ka m na-ejegharị, ọ bụ ihe na-enye ọṅụ ịnụ ahụmahụ banyere otú e siworo were ọrụ nkwusa anyị gaa n’ihu n’oge mmachibido iwu ahụ na Canada. (Ọrụ 5:29) Ọtụtụ ndị kọrọ banyere ihe ahụ a na-akpọ oké mkpọsa bụ́ mgbe n’ime otu abalị, e tinyere otu akwụkwọ nta n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ebe obibi nile site n’otu nsọtụ nke Canada ruo n’ọzọ. Lee ozi ọma ọ bụ ịnụ na May 1945 na agha a na-alụ na Europe ebiwo!

N’oge okpomọkụ ahụ, ka m na-eje ozi n’ọgbakọ dị n’obere obodo bụ́ Osage, Saskatchewan, anatara m akwụkwọ ozi site n’aka Nwanna Knorr, nke na-agụ, sị: “Ana m enye gị ihe ùgwù nke ịga Belgium. . . . E nwere ọtụtụ ọrụ a ga-arụ n’ala ahụ. Ọ bụ mba nke agha tisasịrị, ụmụnna anyị chọkwara enyemaka, o yikwara ihe kwesịrị ekwesị isite n’America ziga mmadụ iji nyere ha aka kwesịrị ekwesị na nkasi obi dị ha mkpa.” Azaghachiri m ozugbo, na-anara ọrụ ahụ.

Na November 1945, anọ m na Betel Brooklyn ebe mụ na Charles Eicher, bụ́ nwanna nwoke meworo okenye si Alsace, nọ na-amụ French. Anatakwara m ọzụzụ ọkụ ọkụ n’usoro e si eme ihe n’alaka. Tupu m gawa Europe, eji m obere oge gaa leta ezinụlọ na ndị enyi m na St. Joseph, Missouri.

Na December 11, ahapụrụ m New York n’ụgbọ mmiri bụ́ Queen Elizabeth, mgbe ụbọchị anọ gasịkwara erutere m Southampton, England. Anọrọ m otu ọnwa n’alaka dị na Britian, bụ́ ebe m natakwuru ọzụzụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, na January 15, 1946, m gafere Ọwa Mmiri England ma rịtuo n’Ostend, Belgium. Site n’ebe ahụ eji m ụgbọ okporo ígwè gaa Brussels, bụ́ ebe ezinụlọ Betel dum zutere m n’ebe ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị.

Ọrụ A Mụbara Amụba Mgbe Agha Gasịrị

Ọrụ m bụ ilekọta ọrụ Alaeze na Belgium, ma enweghịdị m ike ịsụ asụsụ ha. N’ihe dị ka ọnwa isii, amaara m French zuuru m iji eme ihe. Ọ bụ ihe ùgwù iso ndị tinyeworo ndụ ha n’ihe ize ndụ iji rụọ ọrụ nkwusa ahụ n’afọ ise ahụ nke mweghara ndị Nazi rụkọọ ọrụ. A tọhapụwo ụfọdụ n’ime ha n’oge na-adịchaghị anya site n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche.

Ụmụnna ahụ nwere oké mmasị n’ịhazi ọrụ ahụ na inye ndị agụụ eziokwu Bible na-agụ ihe oriri. Ya mere e mere ndokwa inwe mgbakọ dị iche iche na ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eletagasị ọgbakọ. Anyị nwetakwara nleta ndị na-agba ume site n’aka Nathan Knorr, Milton Henschel, Fred Franz, Grant Suiter, na John Booth—ndị bụcha ndị nnọchiteanya sitere n’isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn. N’ụbọchị mbụ ndị ahụ, ejere m ozi dị ka onye nlekọta sekit, onye nlekọta distrikti, na onye nlekọta alaka. Na December 6, 1952, mgbe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ asaa nke ije ozi na Belgium gasịrị, alụrụ m Emilia Vanopslaugh, bụ́ onye na-arụkwa ọrụ n’alaka dị na Belgium.

Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, n’April 11, 1953, a kpọrọ m òkù n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii mba ahụ ma gwa m na ọnụnọ m bụ ihe ize ndụ nye nchebe nke Belgium. Agara m Luxembourg ichere ebe e wegaara Kansụl Ọchịchị okwu m maka mkpegharị.

Na February 1954 Kansụl Ọchịchị Belgium kwadoro mkpebi ikpe ahụ bụ́ na ọnụnọ m bụ ihe ize ndụ nye mba ahụ. Ihe akaebe e kwuru bụ na kemgbe m bịara Belgium, ọnụ ọgụgụ Ndịàmà ná mba ahụ amụbawo n’ụzọ dị egwu—site na 804 na 1946 ruo 3,304 na 1953—nakwa na, n’ihi nke ahụ, e yiri nchebe nke Belgium egwu n’ihi na ọtụtụ Ndịàmà na-eto eto na-ewere nguzo siri ike maka nnọpụiche ndị Kraịst. N’ihi ya, e kenyere mụ na Emilia ọrụ na Switzerland, bụ́ ebe anyị malitere ịrụ ọrụ sekit n’akụkụ ebe a na-asụ French.

E guzobere Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze—ụlọ akwụkwọ e ji enye ndị Kraịst bụ́ ndị okenye ọzụzụ ka elu—na 1959 na Ndịda Lansing, New York. A kpọrọ m òkù n’ebe ahụ ịnata ọzụzụ iji kụzie ihe n’ụlọ akwụkwọ a na Europe. Mgbe m nọ na United States, eletara m ezinụlọ m na St. Joseph, Missouri. Ahụrụ m ezigbo nne m na nke ikpeazụ ya n’ebe ahụ. Ọ nwụrụ na January 1962; papa m anwụworị na June 1955.

Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze na Paris, France, malitere na March 1961, Emilia sokwa m gaa. Ndị nlekọta distrikti, ndị nlekọta sekit, ndị nlekọta ọgbakọ, na ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche si France, Belgium, na Switzerland bịa maka ụlọ akwụkwọ ahụ. N’ime ọnwa 14 sochirinụ, eduziri m klas 12 n’ime usoro ọmụmụ ihe a were izu anọ. Ka oge na-aga, n’April 1962, anyị matara na Emilia dị ime.

Ikwekọ n’Ọnọdụ Ndị Dịnụ

Anyị laghachiri Geneva, Switzerland, bụ́ ebe anyị nwere ikike obibi na-adịgide adịgide. Otú ọ dị, ọ dịghị mfe ịchọta ebe obibi, n’ihi na e nwere ajọ ụkọ nke ụlọ obibi. Ịchọta ọrụ adịkwaghị mfe. N’ikpeazụ enwetara m ọrụ n’otu nnukwu ụlọ ahịa dị n’etiti Geneva.

Etinyewo m afọ 26 n’ozi oge nile, n’ihi ya ọnọdụ anyị ndị gbanwerenụ chọrọ ime mgbanwe dị ukwuu. N’ime afọ 22 m rụrụ ọrụ ná nnukwu ụlọ ahịa ahụ ma nye aka n’ịzụlite ụmụ anyị ndị nwanyị abụọ, bụ́ Lois na Eunice, ezinụlọ anyị na-ebute ọdịmma Alaeze ụzọ mgbe nile. (Matiu 6:33) Mgbe m lasịrị ezumike nká n’ọrụ ego na 1985, m malitere ije ozi dị ka onye na-arụchitere onye nlekọta sekit ọrụ.

Ahụ ike Emilia ajọwo oké njọ, ma ọ na-eme ihe ọ pụrụ ime n’ozi. Lois jere ozi dị ka ọsụ ụzọ ruo ihe dị ka afọ iri. Lee ihe dị oké mkpa n’ụzọ ime mmụọ ọ bụ mụ na ya inwe ike ịnụ ụtọ mgbakọ mba nile ahụ kasị dị ebube na Moscow n’oge okpomọkụ 1993! Ná mkpirikpi oge ka e mesịrị, mgbe ọ na-eme njem oge ezumike na Senegal, Africa, Lois nwụrụ ka ọ na-egwu mmiri n’oké osimiri. Ịhụnanya na obiọma nke ụmụnna anyị bụ́ ndị Africa na ndị ozi ala ọzọ bụ oké ihe nkasi obi nye m mgbe m gara Senegal ịhụ maka olili ozu ahụ. Lee ka o si agụsi m agụụ ike ịhụ Lois ná mbilite n’ọnwụ!—Jọn 5:28, 29.

Enwere m ekele ịbụ onye nweworo nkwado siri ike nke onye òtù na-ahụ n’anya ruo ihe karịrị iri afọ anọ. N’ezie, n’agbanyeghị obi mgbu na nsogbu m, ebere Jehova adịwo ụtọ, o mewokwa ka ndụ dị ụtọ. A na-akwali obi m ikwupụta banyere Chineke anyị, bụ́ Jehova, n’ikwekọ n’okwu onye ọbụ abụ ahụ, sị: “N’ihi na ebere Gị dị mma karịa ndụ, egbugbere ọnụ m abụọ ga-aja Gị.”—Abụ Ọma 63:3.

[Foto dị na peeji nke 26]

Anyị ji ígwè “phonograph” bute ụzọ n’ọrụ nkwusa ahụ

[Foto dị na peeji nke 26]

Nne na nna m na 1936

[Foto dị na peeji nke 26]

Ịgba àmà okporo ámá na Belgium na 1948

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya