Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 4/15 p. 14-19
  • Jehova Na-emezuru Ndị Na-ekwesị Ntụkwasị Obi Nkwa Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Na-emezuru Ndị Na-ekwesị Ntụkwasị Obi Nkwa Ya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ezigbo Okwukwe n’Oge Ochie
  • Ihe Ndị Enweghị Okwukwe Kpatara
  • E Gosipụta Okwukwe n’Oge Anyị
  • Ọdịnihu Dị Ebube Maka Ndị Na-ekwesị Ntụkwasị Obi
  • Ọdịnihu Obi Ụtọ Bụ Ihe E Ji n’Aka
  • Tụkwasị Jehova Obi na Ọ Ga-emezu Nzube Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • ‘Isite n’Okwukwe Na-ejegharị, Ọ Bụghị n’Ọhụhụ Ụzọ’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • “Meenụ Ka Obi Unu Guzosie Ike”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Nwee Okwukwe nke Dabeere n’Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 4/15 p. 14-19

Jehova Na-emezuru Ndị Na-ekwesị Ntụkwasị Obi Nkwa Ya

“Onye ahụ Nke kwere nkwa kwesịrị ntụkwasị obi.”—NDỊ HIBRU 10:23.

1, 2. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike zuru ezu ná nkwa Jehova?

JEHOVA na-achọ ka ndị ohu ya zụlite ma nọgide na-enwe okwukwe siri ike na ya na nkwa ya. N’inwe okwukwe dị otú ahụ mmadụ pụrụ ịtụkwasị Jehova obi kpam kpam ime ihe ndị o kwere nkwa ime. Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ na-ekwu, sị: “Jehova nke usuu nile nke ndị agha aṅụwo iyi, sị, N’ezie dị ka M cheworo, otú a ka ọ ga-adị; na dị ka M zubeworo, nke ahụ ga-eguzosi ike.”—Aịsaịa 14:24.

2 Okwu ahụ bụ́, “Jehova nke usuu nile nke ndị agha aṅụwo iyi,” na-egosi na ọ na-adụ isi siri ike na ya ga-emezu nkwa ya. Ọ bụ nke ahụ mere Okwu ya pụrụ iji kwuo, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala ná nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezi.” (Ilu 3:5, 6) Mgbe anyị tụkwasịrị Jehova obi ma kwe ka amamihe ya duzie anyị, okporo ụzọ anyị nile aghaghị iduje ná ndụ ebighi ebi, n’ihi na amamihe Chineke bụ ‘osisi na-enye ndụ nye ndị na-ejide ya aka.’—Ilu 3:18; Jọn 17:3.

Ezigbo Okwukwe n’Oge Ochie

3. Olee otú Noa si gosi okwukwe n’ebe Jehova nọ?

3 Ihe ndekọ nke ọrụ Jehova n’ebe ndị nwere ezigbo okwukwe nọ na-agba akaebe ya ịbụ onye a pụrụ ịdabere na ya. Dị ka ihe atụ, ihe karịrị afọ 4,400 gara aga Chineke gwara Noa na Iju Mmiri zuru ụwa ọnụ gaje ibibi ụwa nke ụbọchị ya. O nyere Noa ntụziaka iwu akataka ụgbọ maka ichebe ndụ mmadụ na anụmanụ. Gịnị ka Noa mere? Ndị Hibru 11:17 na-agwa anyị, sị: “Noa, mgbe Chineke dụsịrị ya ọdụ banyere ihe a ka-ahụghị anya ruo oge ahụ, ebe ọ tụrụ egwu Chineke, ọ bụ okwukwe ka o ji dozie ụgbọ ịzọpụta ezinụlọ Ya.” N’ihi gịnị ka Noa ji nwee okwukwe n’ihe na-emetụbeghị mbụ, ihe “a ka-ahụghị anya”? N’ihi na ọ maara nke ọma banyere mmeso Chineke mesoro ezinụlọ mmadụ n’oge gara aga iji ghọta na ihe ọ bụla Chineke kwuru na-emezu. Ya mere Noa nwere obi ike na Iju Mmiri ahụ ga-ewerekwa ọnọdụ.—Jenesis 6:9-22.

4, 5. N’ihi gịnị ka Abraham ji tụkwasị Jehova obi n’ụzọ zuru ezu?

4 Ihe atụ ọzọ nke ezigbo okwukwe bụ Abraham. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 3,900 gara aga, Chineke gwara ya ka ọ chụọ Aịsak n’àjà, bụ́ nanị otu nwa nwoke o nwere nke nwunye ya, bụ́ Sera mụtara. (Jenesis 22:1-10) Olee otú Abraham si zaghachi? Ndị Hibru 11:17 na-ekwu, sị: “Mgbe a na-anwa Abraham, ọ bụ okwukwe ka o ji chee Aịsak n’ihu Chineke dị ka àjà.” Otú ọ dị, kpọmkwem n’oge ọ na-aga ime ya, mmụọ ozi Jehova kwụsịrị Abraham. (Jenesis 22:11, 12) Ma, n’ihi gịnị ka Abraham ga-ejidị chee echiche ime ihe dị otú ahụ? N’ihi na, dị ka Ndị Hibru 11:19 na-ekwu, “ọ na-agụ na Chineke pụrụ ime ka [Aịsak] si ọbụna ná ndị nwụrụ anwụ bilie.” Ma olee otú Abraham pụrụ isi nwee okwukwe ná mbilite n’ọnwụ mgbe ọ na-ahụtụbeghị otu, e nweghịkwa ihe ndekọ gara aga nke otu?

5 Cheta, Sera dị afọ 89 mgbe Chineke kwere ha nkwa nwa nwoke. Akpa nwa Sera apụkwaghị ịmụtali nwa—ọ nwụrụ anwụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. (Jenesis 18:9-14) Chineke weghachiri akpa nwa Sera ná ndụ, o wee mụta Aịsak. (Jenesis 21:1-3) Abraham maara na ebe Chineke weghachiri akpa nwa nwụrụ anwụ nke Sera ná ndụ, mgbe ahụ ọ pụkwara iweghachi Aịsak ná ndụ ma ọ dị mkpa. Ndị Rom 4:20, 21 na-ekwu banyere Abraham, sị: “O jighịkwa ekweghị ekwe nwee obi abụọ n’ebe nkwa Chineke dị, kama e jiri okwukwe ya mee ka o nwee ike, ọ na-enyekwa Chineke otuto, na-ekwezukwa na ihe O kwererịị ná nkwa, Ọ pụrụ imekwa.”

6. Olee otú Joshua si kwupụta obi ike n’ebe Jehova nọ?

6 Ihe karịrị afọ 3,400 gara aga mgbe Joshua dị ihe karịrị otu narị afọ nakwa mgbe o bisịrị ogologo ndụ nke ịhụ otú Chineke si kwesị ntụkwasị obi, o kwuru ihe a kpatara obi ike ya: “Unu amawo n’obi unu nile na n’ime mkpụrụ obi unu nile, na ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu; ha nile emeworo unu, ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ime ya.”—Joshua 23:14.

7, 8. Ihe dị aṅaa na-azọpụta ndụ ka ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi na narị afọ mbụ mere, n’ihi gịnịkwa?

7 Ihe dị ka afọ 1,900 gara aga, ọtụtụ ndị dị umeala n’obi gosipụtara ezigbo okwukwe. Ha ghọtara site ná mmezu nke amụma Bible na Jisọs bụ Mesaịa ahụ ma nakwere ozizi ya. N’inwe ndabere siri ike n’ihe ndị mere eme na n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, ha nwere okwukwe n’ihe Jisọs kụziri. N’ihi ya, mgbe Jisọs kwuru na ikpe ọmụma Chineke na-abịakwasị Judia na Jerusalem n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi, ha kweere ya. Mgbe ọ gwakwara ha ihe ha na-aghaghị ime iji zọpụta ndụ ha, ha mere ya.

8 Jisọs gwara ndị kwere ekwe na mgbe ndị agha gbara Jerusalem gburugburu, ha kwesịrị ịgbalaga. Ndị agha Rom bịakwasịrị Jerusalem n’afọ 66 O.A. Ma ndị Rom ahụ lara n’ihi ihe a na-akọwaghị akọwa. Nke ahụ bụ mgbaàmà ka ndị Kraịst gbapụ n’obodo ahụ, n’ihi na Jisọs ekwuwo, sị: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ Jerusalem ka a chị usuu ndị agha nọgide ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ịtọgbọrọ n’efu ya dị nso. Mgbe ahụ ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu; ndị nọkwa n’etiti ya, ka ha si n’ime ya wezụga onwe ha; ndị nọkwa n’ala ọzọ, ka ha ghara ịba n’ime ya.” (Luk 21:20, 21) Ndị nwere ezigbo okwukwe gbahapụrụ Jerusalem na ógbè dị ya gburugburu ma gbalaga.

Ihe Ndị Enweghị Okwukwe Kpatara

9, 10. (a) Olee otú ndị ndú okpukpe si gosipụta enweghị okwukwe ha n’ebe Jisọs nọ? (b) Gịnị bụ ihe ndị si n’enweghị okwukwe ahụ pụta?

9 Gịnị ka ndị na-enweghị ezigbo okwukwe mere? Ha agbalagaghị mgbe ha nwere ohere ya. Ha chere na ndị ndú ha pụrụ ịzọpụta ha. Ma, ndị ndú ahụ na ụmụazụ ha nwekwara ihe àmà nke ịbụ Mesaịa Jisọs. Ya mere gịnị mere na ha anakwereghị ihe o kwuru? N’ihi ọnọdụ obi ọjọọ ha. E kpughere nke a tupu oge a mgbe ha hụrụ ọtụtụ ndị nkịtị ka ha na-enuga n’ebe Jisọs nọ mgbe ọ kpọlitesịrị Lazarọs n’ọnwụ. Jọn 11:47, 48 na-akọ, sị: “Ndị isi nchụàjà na ndị Farisii kpọrọ nnọkọ ikpe [ụlọikpe dị elu nke ndị Juu] ka ha zukọọ, sị, Gịnị ka anyị na-eme? n’ihi na Nwoke a [Jisọs] na-eme ọtụtụ ihe ịrịba ama. Ọ bụrụ na anyị ahapụ Ya otú a, mmadụ nile ga-ekwere na Ya: ndị Rom ga-abịakwa napụ ebe nke anyị na mba nke anyị.” Amaokwu nke 53 na-asị: “Ya mere site n’ụbọchị ahụ ha gbara izu ka ha wee gbuo Ya.”

10 Lee ọrụ ebube dị egwu Jisọs rụworo—isite ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Lazarọs! Ma ndị ndú okpukpe ahụ chọrọ ka e gbuo Jisọs maka ime nke ahụ. E kpughekwuru ajọ obi ọjọọ ha mgbe “ndị isi nchụàjà gbara izu ka ha wee gbuokwa Lazarọs; n’ihi na ọ bụ n’ihi ya ka ọtụtụ n’ime ndị Juu na-apụ, na-ekwerekwa na Jisọs.” (Jọn 12:10, 11) A ka kpọlitesịrị Lazarọs site ná ndị nwụrụ anwụ, ndị isi nchụàjà ahụ chọkwara igbu ya ọzọ! Ha adịghị eche banyere uche Chineke ma ọ bụ banyere ọdịmma ụmụ mmadụ. Ha na-achọ ọdịmma onwe ha nanị, na-eche banyere ọkwá na uru ha. “Ha hụrụ otuto mmadụ n’anya karịa otuto Chineke.” (Jọn 12:43) Ma ha kwụrụ ụgwọ enweghị okwukwe ha. N’afọ 70 O.A., ndị agha Rom laghachitere ma bibie ebe ha na mba ha, nakwa ọtụtụ n’ime ha.

E Gosipụta Okwukwe n’Oge Anyị

11. Ná mmalite narị afọ a, olee otú e si gosipụta ezigbo okwukwe?

11 Na narị afọ a e nwewokwa ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom nwere ezigbo okwukwe. Dị ka ihe atụ, laa azụ ná mmalite afọ ndị 1900, ndị mmadụ n’ozuzu ha nọ na-atụ anya ọdịnihu ọma, nke na-enwe ọganihu. N’otu oge ahụ, ndị nwere okwukwe na Jehova nọ na-ekwupụta na ihe a kpọrọ mmadụ na-aga ịbanye n’oge nsogbu kasị njọ. Nke ahụ bụ ihe e buru n’amụma n’Okwu Chineke na Matiu isi nke 24, 2 Timoti isi nke 3, na n’ebe ndị ọzọ. Ihe ndị ahụ nwere okwukwe kwuru mezuru, na-eji Agha Ụwa Mbụ malite na 1914. Ụwa banyere n’ezie na “mgbe ikpeazụ” ahụ e buru n’amụma nke nwere “oge dị oké egwu.” (2 Timoti 3:1) N’ihi gịnị ka ndị ohu Jehova ji mara eziokwu banyere ọnọdụ ụwa laa azụ n’oge ahụ mgbe ndị ọzọ na-amaghị? N’ihi na, dị ka Joshua, ha nwere okwukwe na ọ dịghị otu okwu ọ bụla si n’ọnụ Jehova nke ga-ada ada.

12. Taa, ná nkwa dị aṅaa nke Jehova ka ndị ohu ya na-atụkwasị obi n’ụzọ zuru ezu?

12 Taa, ndị ohu Jehova, ndị tụkwasịrị ya obi ha, fọrọ ntakịrị ka ha ruo nde mmadụ isii gburugburu ụwa. Ha maara site n’ihe àmà ná mmezu nke okwu amụma Chineke na n’isi nso ọ ga-eweta usoro ihe a na-eme ihe ike, nke rụrụ arụ, ná njedebe. N’ihi ya obi siri ha ike na oge ahụ dị nso mgbe ha ga-ahụ mmezu nke 1 Jọn 2:17, nke na-asị: “Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” Ndị ohu ya kwere kpam kpam na Jehova ga-emezu nkwa a.

13. Ruo n’ókè hà aṅaa ka ị pụrụ ịtụkwasị Jehova obi?

13 Ruo ókè hà aṅaa ka ị pụrụ ịtụkwasị Jehova obi? Ị pụrụ ịtọgbọrọ ya ndụ gị! Ọ bụrụgodị na ndụ gị efunahụ gị ugbu a n’ihi ijere ya ozi, ọ ga-enyeghachi gị ndụ ka nnọọ mma ná mbilite n’ọnwụ. Jisọs na-emesi anyị obi ike, sị: “Oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili [ya bụ, ná ncheta Chineke] ga-anụ olu Ya, ha ga-apụtakwa.” (Jọn 5:28, 29) Ị̀ maara onye dọkịta ọ bụla, onye ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọkà mmụta sayensị, ọchụ nta ego, ma ọ bụ mmadụ ọ bụla ọzọ pụrụ ime nke ahụ? Ihe ndekọ ha gara aga na-egosi na ha apụghị. Jehova pụrụ, ọ ga-emekwa ya!

Ọdịnihu Dị Ebube Maka Ndị Na-ekwesị Ntụkwasị Obi

14. Ọdịnihu dị ebube dị aṅaa ka Okwu Chineke na-ekwe ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ná nkwa?

14 Jisọs gosiri ịbụ ihe e ji n’aka nke ụwa ọhụrụ n’okpuru Alaeze eluigwe Chineke, na-asị: “Ngọzi na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi: n’ihi na ndị ahụ ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5) Nke ahụ mesikwuru nkwa Chineke ahụ dị n’Abụ Ọma 37:29 ike: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” Kpọmkwem kwa tupu ọnwụ Jisọs, mgbe otu onye mmebi iwu gosipụtara okwukwe n’ebe ọ nọ, Jisọs gwara nwoke ahụ, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43) Ee, dị ka Eze nke Alaeze Chineke, Jisọs ga-ahụ na a kpọlitere nwoke a gaa ná ndụ n’elu ụwa na-enwe ohere ibi na Paradaịs ahụ. Taa, ndị nile nwere okwukwe n’Alaeze Jehova pụkwara ilega anya n’ịdị ndụ na Paradaịs mgbe “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.”—Mkpughe 21:4.

15, 16. N’ihi gịnị ka ndụ ga-eji dịrị nnọọ n’udo n’ụwa ọhụrụ ahụ?

15 Ka anyị were uche anyị gaa n’ụwa ọhụrụ ahụ. Were ya na anyị amalitelarị ịdị ndụ na ya. Ozugbo, anyị na-ahụ nnọọ n’ebe nile ndị nwere obi ụtọ na-ebikọ ọnụ n’udo zuru ezu. Ha na-enwe ọṅụ n’ọnọdụ ndị yiri ndị ahụ a kọwara n’Aịsaịa 14:7: “Ụwa nile ezuwo ike, dị jụụ: ha etiwawo mkpu ọṅụ.” Gịnị mere ha ji dị otú ahụ? Otu ihe bụ, rịba ama na ọnụ ụzọ ụlọ ndị ahụ enweghị ihe mkpọchi. Ha adịghị mkpa, ebe ọ bụ na mpụ ma ọ bụ ime ihe ike adịghị. Ọ bụ nnọọ dị ka Okwu Chineke kwuru na ọ ga-adị: “Ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.”—Maịka 4:4.

16 Agha adịkwaghị, n’ihi na n’ụwa ọhụrụ a, a mapụrụ agha n’iwu. A kpụgharịwo ngwá agha nile ka ha bụrụ ngwá ọrụ udo. N’echiche zuru ezu, e mezuwo Aịsaịa 2:4: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.” Ma, nke ahụ bụ ihe anyị tụrụ anya ya! N’ihi gịnị? N’ihi na ọtụtụ ndị bi n’ụwa ọhụrụ ahụ mụtara ime nke ahụ ka ha na-ejere Chineke ozi n’ụwa ochie ahụ.

17. Ọnọdụ ibi ndụ dịgasị aṅaa ga-adị n’okpuru Alaeze Chineke?

17 Ihe ọzọ ị na-arịba ama bụ na e nweghị ịda ogbenye. Ọ dịghị onye bi ná nkịkara ụlọ ma ọ bụ na-eyi nkịrịka uwe ma ọ bụ na-enweghị ebe obibi. Onye ọ bụla nwere ụlọ dị mma na ala nwere osisi na okooko osisi ọma ndị a na-elekọta nke ọma. (Aịsaịa 35:1, 2; 65:21, 22; Ezikiel 34:27) E nweghịkwa agụụ n’ihi na Chineke emezuwo nkwa ya bụ́ na a ga-enwe ụba ihe oriri maka mmadụ nile: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.” (Abụ Ọma 72:16) N’ezie, n’okpuru nduzi Alaeze Chineke, a na-agbasa paradaịs dị ebube n’ụwa nile, dị nnọọ ka Chineke zubere laa azụ n’Iden.—Jenesis 2:8.

18. N’ụwa ọhụrụ ahụ, gịnị bụ ihe ndị na-agaghị eyikwa ndị mmadụ egwu?

18 Ị na-enwekwa ịtụnanya n’oké ume ọrụ onye ọ bụla nwere. Nke a bụ n’ihi na ha nwere ugbu a ahụ na uche zuru okè. Ọrịa, ahụ mgbu, ma ọ bụ ọnwụ adịkwaghị. Ọ dịghị onye nọ n’oche nkwagharị ma ọ bụ n’àkwà ụlọ ọgwụ. Ihe ahụ dum agabigawo ruo mgbe nile ebighị ebi. (Aịsaịa 33:24; 35:5, 6) Leekwa, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ụmụ anụmanụ bụ ihe iyi egwu, n’ihi na e mewo ka ha dị n’udo site n’ike Chineke!—Aịsaịa 11:6-8; 65:25; Ezikiel 34:25.

19. N’ihi gịnị ka ụbọchị ọ bụla n’ụwa ọhụrụ ahụ ga-eji bụrụ nke ‘dị ụtọ’?

19 Lee ụdị ebe ntụsara ahụ dị ebube nke ndị kwesịrị ntụkwasị obi bi n’ụwa ọhụrụ a na-eguzobe! Ume ọrụ na nkà ha na akụ̀ na ụba nke ụwa ka e tinyere ná nchụso ndị bara uru, ọ bụghị ndị na-emerụ ahụ; n’iso ndị ọzọ na-emekọ ihe, ọ bụghị iso ha na-asọ mpi. Onye ọ bụla i zutekwara bụ onye ị pụrụ ịtụkwasị obi n’ihi na, dị ka Chineke kwere ná nkwa, mmadụ nile bụ “ndị mmụta Jehova.” (Aịsaịa 54:13) Ebe iwu Chineke na-achịkwa onye ọ bụla, ụwa ‘jupụtara n’ihe ọmụma Jehova dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.’ (Aịsaịa 11:9) N’eziokwu, ụbọchị ọ bụla n’ụwa ọhụrụ a bụ ihe Abụ Ọma 37:11 kwuru na ọ ga-abụ, nke ‘dị ụtọ.’

Ọdịnihu Obi Ụtọ Bụ Ihe E Ji n’Aka

20. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji nụ ụtọ ọdịnihu udo?

20 Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji bụrụ akụkụ nke ọdịnihu obi ụtọ ahụ? Aịsaịa 55:6 na-agwa anyị, sị: “Chọọnụ Jehova mgbe a na-achọta Ya, kpọkuonụ Ya mgbe Ọ nọ nso.” Ka anyị na-achọkwa ya, àgwà anyị kwesịrị ịbụ dị ka a kọwara n’Abụ Ọma 143:10: “Zi m ime ihe dị Gị ụtọ; n’ihi na Gị onwe gị bụ Chineke m.” Ndị na-eme nke a pụrụ ije ije n’enweghị ntụpọ n’ihu Jehova gabiga oge ikpeazụ ndị a, ha pụkwara ilepụ anya n’ọdịnihu ọma. “Rịba onye zuru okè ama, leekwa onye ziri ezi: n’ihi na ọdịnihu dịịrị onye udo. Ma ndị njehie, a na-ekpochapụ ha n’otu: a ga-ebipụ ọdịnihu nke ndị na-emebi iwu.”—Abụ Ọma 37:37, 38.

21, 22. Gịnị ka Chineke na-eguzobe taa, oleekwa otú e si enyezu ọzụzụ ahụ?

21 Kpọmkwem ugbu a Jehova si ná mba ọ bụla na-akpọpụta ndị chọrọ ime uche ya. Ọ na-eguzobe ha dị ka ntọala nke ọha mmadụ ọhụrụ nke ụwa ya, dị ka amụma Bible buru ụzọ kwuo, sị: “N’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a [oge anyị bi na ya ugbu a] . . . Ọtụtụ ndị dị iche iche ga-ejekwa, sị, Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova [ezi ofufe ya e buliri elu] . . . Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ Ya nile.”—Aịsaịa 2:2, 3.

22 Mkpughe 7:9 na-akọwa ndị a dị ka “oké ìgwè mmadụ . . . si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile pụta.” Amaokwu nke 14 na-asị: “Ndị a bụ ndị na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta,” na-alanarị ọgwụgwụ nke usoro ihe a. Ntọala a nke ụwa ọhụrụ ahụ dị ugbu a ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ isii, na-enwe ọtụtụ ndị ọhụrụ na-aghọ akụkụ ya kwa afọ. A na-azụ ndị ohu Jehova a nile na-ekwesị ntụkwasị obi maka ndụ n’ụwa ọhụrụ ya. Ha na-amụta nkà ime mmụọ na nkà ndị ọzọ dị mkpa iji gbanwee ụwa a ịghọ paradaịs. Ha nwekwara ntụkwasị obi n’ụzọ zuru ezu na Paradaịs ga-aghọ ihe dị adị n’ezie n’ihi na “Onye ahụ Nke kwere nkwa kwesịrị ntụkwasị obi.”—Ndị Hibru 10:23.

Isi Ihe Maka Ntụleghachi

◻ Ihe ndị dị aṅaa ka enweghị okwukwe wetara na narị afọ mbụ?

◻ Ruo n’ókè hà aṅaa ka ndị ohu Chineke pụrụ ịtụkwasịru ya obi?

◻ Ọdịnihu dị aṅaa dịịrị ndị na-ekwesị ntụkwasị obi?

◻ Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji jide n’aka na anyị nwetara ọdịnihu obi ụtọ n’ụwa ọhụrụ Chineke?

[Foto dị na peeji nke 18]

Kpọmkwem ugbu a Jehova na-eguzobe ntọala nke ọha mmadụ ọhụrụ nke ụwa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya