Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 1/15 p. 5-9
  • Ndị Kpebisiri Ike Ịgbaso Ụzọ Ndụ Nke Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Kpebisiri Ike Ịgbaso Ụzọ Ndụ Nke Chineke
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jisọs Kraịst—Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Lezienụ Anya nke Ọma n’Otú Unu Si Ejegharị
  • “Nke A Bụ Ụzọ, Jeenụ Ije n’Ime Ya”
  • Mgbakọ Ndị Na-akpali Akpali Na-akwalite Izi Ihe Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi” Ejiri Ọṅụ Gbakọta
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • A Gbaa Ndị Na-ezi Okwu Chineke Ume Ịrụzu Ọrụ Ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ndị Na-eme Okwu Chineke Na-enweta Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 1/15 p. 5-9

Ndị Kpebisiri Ike Ịgbaso Ụzọ Ndụ Nke Chineke

Mgbakọ “Ụzọ Ndụ nke Chineke” ahụ nwere ihe dị nnọọ ukwuu inye ndị na-achọ ijere Chineke ozi! Otu onye bịara mgbakọ ahụ kọwara ya dị ka “oge magburu onwe ya nke ntụziaka, agbamume, na nghọta.”

ONYE ọzọ kwuru na “e nwere ọtụtụ ihe ịnụ ụtọ ya, ichebara echiche, na ịnakwere.” Ka anyị tụlezie usoro ihe omume ahụ n’onwe ya.

Jisọs Kraịst—Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

Nke a bụ isiokwu ụbọchị mbụ nke mgbakọ ahụ. (Jọn 14:6) Okwu mbụ kọwara nzube anyị ji gbakọta ná mgbakọ ahụ: iji bụrụ ndị a kụzikwuuru banyere ụzọ ndụ kasị mma a pụrụ inwe, bụ́ ụzọ ndụ nke Chineke. Jehova na-akụziri ndị ya otú ha ga-esi eje ije n’ụzọ ya. Ọ na-eme nke a site na Bible, “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” na mmụọ nsọ. (Matiu 24:45-47; Luk 4:1; 2 Timoti 3:16) Lee ihe ùgwù ọ bụ ịbụ ndị Ọkaaka nke eluigwe na ala ziri ihe!

N’ikwekọ n’isiokwu nke ụbọchị ahụ, okwu bụ́ isi bụ “Ihe Mgbapụta Kraịst—Ụzọ Nzọpụta nke Chineke.” N’ikwekọ n’ụzọ ndụ nke Chineke, ọ dị mkpa ịmata òkè Jisọs Kraịst na-ekere ná nzube Jehova. Ọkà okwu ahụ kwuru, sị: “E wezụga àjà mgbapụta Jisọs Kraịst, ọ dịghị mmadụ ọ bụla, n’agbanyeghị ihe o kweere ma ọ bụ ọrụ ya, pụrụ inweta ndụ ebighị ebi site n’aka Chineke.” Mgbe ahụ o hotara Jọn 3:16, nke na-asị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” Inwe okwukwe n’àjà mgbapụta Kraịst chọrọ ka anyị bịaruo mmazu nke eziokwu. Ọ na-agụnyekwa ịrara ndụ anyị nye Jehova, na-egosipụta nke a site na baptism ime mmiri, ma na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe nlereanya Jisọs Kraịst setịpụrụ.—1 Pita 2:21.

Nnọkọ nke ehihie ji okwu nke isiokwu ya bụ “Ụzọ Ịhụnanya Adịghị Ada Mgbe Ọ Bụla,” malite. Nke a gụnyere ntụle n’amaokwu n’amaokwu nke nkọwa na-akpali akpali Pọl nyere banyere ịhụnanya, bụ́ nke e dekọrọ ná 1 Ndị Kọrint 13:4-8. E chetaara ndị na-ege ntị na ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà bụ otu ihe e ji amata Iso Ụzọ Kraịst nakwa na ịhụnanya n’ebe Chineke na ndị agbata obi nọ bụ akụkụ ndị dị oké mkpa nke ofufe Jehova na-anakwere.

Usoro isiokwu nwere akụkụ atọ nke isiokwu ya bụ “Nne na Nna—Kụnyenụ Ụzọ Chineke n’Ime Ụmụ Unu,” sochiri. Nne na nna pụrụ inyere ụmụ ha aka ijere Chineke ozi site n’isetịpụ ezi ihe nlereanya n’ịgụ na ịmụ Okwu ya. Ha pụrụ ịkụnye eziokwu ahụ n’ime ụmụ ha site n’ọmụmụ ihe ezinụlọ a na-enwechi anya, na-eme ka ọ na-ekwekọ ná mkpa nke ezinụlọ. Ọ dịkwa mkpa inyere ụmụntakịrị aka ikere òkè n’ihe omume ọgbakọ na ozi ubi. Ọ bụ ezie na ịzụlite ụmụaka na-atụ egwu Chineke n’ụwa ajọ omume a bụ ihe ịma aka, ime otú ahụ na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu.

Ihe sochiri usoro isiokwu a bụ okwu bụ́ “Kwee Ka Jehova Kpụzie Gị Maka Iji Gị Mee Ihe Na-eweta Nsọpụrụ.” Dị nnọọ ka ọkpụite si akpụzi ite ụrọ, otú ahụ ka Chineke na-akpụzi ndị nwere ọchịchọ ijere ya ozi. (Ndị Rom 9:20, 21) Ọ na-eme nke a site n’inye ndụmọdụ n’Okwu ya na site ná nzukọ ya. Jehova ga-enyere anyị aka iji ike anyị mee ihe n’ụzọ zuru ezu ma ọ bụrụ na anyị ewepụta onwe anyị, jiri ohere ndị dịnụ mee ihe, ma dị njikere ikwe ka o duzie nzọụkwụ anyị.

Akụkụ na-akpali akpali nke usoro ihe omume ahụ sochiziri—“Ije Ozi n’Ubi Ala Ọzọ.” Ndị ozi bụ́ ndị Kraịst dị 2,390 bụ́ ndị e weere dị ka ndị ozi ala ọzọ, na-eje ozi ugbu a gburugburu ụwa ná mba 148. Ha na-esetịpụ ihe nlereanya magburu onwe ya nke iguzosi ike n’ihe na ịnụ ọkụ n’obi, ha nwekwara ekele miri emi maka ihe ùgwù ha nke ije ozi n’ala ọzọ. N’oge a na-atụle akụkụ a nke usoro ihe omume ahụ ná mgbakọ mba nile, ndị ozi ala ọzọ kwuru okwu banyere ihe ịma aka na ọṅụ nke ndụ ozi ala ọzọ.

Isiokwu nke okwu ikpeazụ n’ụbọchị mbụ ahụ bụ “À Na-adị Ndụ Mgbe A Nwụsịrị?” Ajụjụ a agbagwojuwo ihe a kpọrọ mmadụ anya ruo ọtụtụ puku afọ. Ndị mmadụ n’obodo ọ bụla atụgharịwo uche n’okwu ahụ. Ihe ndị e chere na ha bụ azịza ya ejupụtawokwa. Ha dịgasị iche dị ka omenala na okpukpe nke ndị na-aza ha. Ma, ọ dị ndị mmadụ mkpa ịmụta eziokwu ahụ.

N’ihi ya, ọkà okwu ahụ mara ọkwa mwepụta nke broshuọ ọhụrụ tụrụ àgwà mara mma nke nwere peji dị 32 bụ́ Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ? Broshuọ a na-akọwa mmalite nke ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, na-egosikwa otú echiche ahụ siworo dị oké mkpa nye ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpe nile dị n’ụwa taa. N’ụzọ doro anya ma na-adọrọ adọrọ, ọ na-enyocha ihe Bible na-ekwu banyere mkpụrụ obi, ihe mere anyị ji anwụ anwụ, na ihe na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ. Broshuọ ahụ na-akọwakwa olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ na ndị dị ndụ. Lee ngọzi mbipụta a ga-abụrụ ndị na-achọ eziokwu n’ebe nile!

Lezienụ Anya nke Ọma n’Otú Unu Si Ejegharị

Lee isiokwu kwesịrị ekwesị nke a bụụrụ ụbọchị nke abụọ nke mgbakọ ahụ! (Ndị Efesọs 5:15) Usoro ihe omume nke ụtụtụ lekwasịrị anya n’ọrụ nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ. Mgbe ntụle nke ihe mmụta dịịrị ụbọchị gasịrị, usoro ihe omume ahụ ji okwu bụ́ “Inyere Ndị Mmadụ Aka Ịbata n’Ụzọ Na-eduga ná Ndụ,” gaa n’ihu. N’ịrụzu ọrụ a dị ngwa, ọ dị mkpa inwe àgwà ziri ezi, na-aghọta na isoro ndị ọzọ kerịta eziokwu ahụ bụ ma ihe ùgwù ma ọrụ. Na narị afọ mbụ O.A., ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ jụrụ Okwu Chineke. Otú ọ dị, n’agbanyeghị mmegide, e nwere ndị ‘e doro ịnata ndụ ebighị ebi, ha wee kwere.’ (Ọrụ 13:48, 50; 14:1-5) Ọnọdụ ahụ yiri nke a na-ahụ taa. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị na-ajụ eziokwu Bible, anyị na-anọgide na-achọ ndị ga-azaghachi n’ụzọ dị mma.—Matiu 10:11-13.

Okwu sochirinụ tụlere ihe ịma aka nke iji ozi nke ndụ na-ejekwuru ndị ọzọ. Ebe ọ bụ na ọ na-esikwu ike ugbu a ịchọta ndị mmadụ n’ụlọ, ọ dị anyị mkpa ịgazu ebe nile na ichepụta ụzọ ndị ọhụrụ ma ọ bụrụ na anyị ga-eji ozi Alaeze ahụ jekwuru ọtụtụ mmadụ dị ka o kwere mee. N’ọtụtụ ala, ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ na-arụpụta ihe ndị dị mma site n’iji telifon agba àmà nakwa site n’ime nkwusa n’ógbè azụmahịa, si otú ahụ na-ejekwuru ndị gaara esi ike ịkpọtụrụ.

Okwu nke isiokwu ya bụ “Izi Ndị Na-eso Ụzọ Ihe Nile Kraịst Nyere n’Iwu” lekwasịrị anya ná mkpa ọ dị ịghọ ndị nwere nkà n’ozi anyị. A na-eme ka nkà izi ihe anyị ka mma ka anyị na-amụta ihe n’aka ndị ọzọ ma na-etinye ọzụzụ magburu onwe ya anyị natara ná nzukọ ọgbakọ n’ọrụ. Ka anyị na-aghọ ndị nwere nkà n’izi ihe anyị, anyị na-achọta ọṅụ na afọ ọjụjụ bara ụba n’ọrụ anyị nke inyere ndị mmadụ aka ịmụta eziokwu Bible.

Nnọkọ nke ụtụtụ ahụ ji okwu dabeere n’ihe nraranye na baptism pụtara, mechie. Otu n’ime isi ihe ndị ọkà okwu ahụ kwuru bụ na ọ bụrụ na anyị atụkwasị Chineke obi kpam kpam ma na-agbalịsi ike ime uche ya, ọ ga-agọzi ma kwado anyị. Onye amamihe ahụ dere, sị: “N’ụzọ gị nile mara [Chineke], Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezi.” (Ilu 3:6) Baptism ahụ na-enye ọṅụ n’onwe ya bụ otu ihe dị ịrịba ama ná mgbakọ ahụ, na-egosi na ọtụtụ ndị amalitewo ikwekọ n’ụzọ ndụ nke Chineke.

Mgbe nkwụsịtụ nke ehihie gasịrị, nnọkọ nke ehihie ji okwu bụ́ “Ije Ozi n’Olileanya nke Ndụ Na-enweghị Ngwụsị,” malite. A ga-emezu nzube Chineke nke ime ka ụmụ mmadụ na-erube isi jeere ya ozi ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa. Mgbe ahụ, lee ka o si kwesị ekwesị na anyị tụkwasịrị echiche, atụmatụ, na olileanya anyị n’ijere Jehova ozi na-eburu mgbe ebighị ebi n’uche! Ọ bụ ezie na anyị chọrọ iburu “ụbọchị ahụ nke Chineke” n’uche, ọ dị mkpa icheta na ihe mgbaru ọsọ anyị bụ ije ozi ruo mgbe ebighị ebi. (2 Pita 3:12) Amaghị kpọmkwem oge Jisọs ga-abọ ọ́bọ̀ Chineke na-eme ka anyị nọrọ na nche ma na-enye anyị ohere kwa ụbọchị igosi na anyị ji ebumnobi ndị ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-adịghị na ha na-ejere Jehova ozi.

Okwu abụọ ndị sochirinụ nyochara isi nke 4 nke akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Efesọs. N’ime ihe ndị a tụlere bụ ngọzi ndị anyị nwere ‘n’onyinye n’ụdị mmadụ,’ bụ́ ndị ikom ruru eru n’ụzọ ime mmụọ, ndị e ji mmụọ nsọ họpụta. Ndị okenye a na-enye ndụmọdụ na nduzi maka abamuru ime mmụọ anyị. Akwụkwọ ozi Pọl dere n’ike mmụọ nsọ na-agbakwa ndị Kraịst ume iyikwasị “mmadụ ọhụrụ.” (Ndị Efesọs 4:8, 24) Àgwà nsọpụrụ Chineke na-agụnye àgwà ndị dị ka ọmịiko, obiọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi, na ịhụnanya.—Ndị Kọlọsi 3:12-14.

Ilezi anya nke ọma n’otú anyị si ejegharị na-agụnye idebe onwe anyị n’enweghị ntụpọ site n’ụwa—isiokwu nke okwu sochirinụ. Nguzozi dị mkpa ná nhọrọ nke ntụrụndụ, ihe omume ọha na eze, na ná nchụso ihe onwunwe. Site n’itinye ndụmọdụ ahụ dị na Jemes 1:27 n’ọrụ bụ́ idebe onwe anyị n’enweghị ntụpọ site n’ụwa, anyị na-enwe nguzo dị ọcha n’ebe Chineke nọ na akọ na uche dị mma. Anyị pụkwara ibi ndụ nwere nzube, a pụkwara iji udo, ọganihu ime mmụọ, na ndị enyi magburu onwe ha gọzie anyị.

Ihe sochizirinụ bụ usoro isiokwu nwere akụkụ atọ nke isiokwu ya bụ “Ndị Ntorobịa—Gbasoonụ Ụzọ Chineke.” N’ịmara na Chineke hụrụ ha n’anya ma na-aghọta mgbalị ndị ha na-eme iji bulie ofufe dị ọcha elu, ndị na-eto eto kwesịrị ịzụ ike nghọta ha iji jeere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Otu ụzọ e si azụlite ike nghọta bụ site n’ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị na ịtụgharị uche na ya. Ọ bụrụ na anyị emee nke a, anyị pụrụ ịmara ụzọ Jehova. (Abụ Ọma 119:9-11) A na-azụlitekwa ike nghọta site n’ịnara ndụmọdụ ezi uche dị na ya site n’aka nne na nna, ndị okenye, na mbipụta dị iche iche nke Society. Site n’iji ike nghọta ha eme ihe n’ụzọ ziri ezi, ndị ntorobịa na-eguzogide itinye uche ha dum n’ihe onwunwe, okwu na-adịghị ọcha, na imebiga ihe ókè n’ihe banyere ntụrụndụ bụ́ nke e ji mara ụwa nke a e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ. Site n’ịgbaso ụzọ ndụ nke Chineke, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi pụrụ inwe ezi ihe ịga nke ọma.

Okwu ikpeazụ nke ụbọchị ahụ bụ “Onye Okike—Àgwà Ya na Ụzọ Ya Nile.” Mgbe ọ kọwasịrị na ọtụtụ ijeri mmadụ amaghị Onye Okike, ọkà okwu ahụ kwuru, sị: “Ezi nzube ná ndụ nwere ihe jikọrọ ya na ịma Onye Okike, bụ́ Chineke anyị bụ́ onye; ịmata àgwà ya; na isoro ụzọ ya nile. . . . E nwere eziokwu ndị dị banyere ụwa anyị na banyere anyị ndị ị pụrụ iji mee ihe inyere ndị mmadụ aka ịnakwere Onye Okike na ịchọta nzube n’ihe banyere ya.” Ọkà okwu ahụ tụleziri ihe àmà na-egosi ịdị adị nke Onye Okike nwere amamihe, nke na-ahụkwa n’anya. Okwu ahụ ji mwepụta nke akwụkwọ ọhụrụ bụ́—Is There a Creator Who Cares About You? bịaruo ná njedebe.

“Nke A Bụ Ụzọ, Jeenụ Ije n’Ime Ya”

Nke a bụ isiokwu nke ụbọchị nke atọ nke mgbakọ ahụ. (Aịsaịa 30:21) Usoro ihe omume ahụ ji usoro isiokwu na-akpali akpali nke nwere akụkụ atọ malite, bụ́ nke na-elekwasị anya n’ọhụụ Ezikiel banyere ụlọukwu. Ọhụụ a nwere ihe dị ukwuu ọ pụtara nye ndị Chineke taa, ebe ọ bụ na o metụtara ofufe dị ọcha n’oge anyị. Isi ihe na-enye aka n’ịghọta ọhụụ ahụ bụ nke a: nnukwu ụlọukwu ime mmụọ Jehova na-anọchite anya ndokwa ya maka ofufe dị ọcha. Ka a na-atụle akụkụ dị iche iche nke ọhụụ ahụ, ndị na-ege ntị tụgharịrị uche n’ihe omume ha n’ịkwado ọrụ nke ndị nlekọta na-ahụ n’anya nke ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ na ndị ga-eso n’òtù ndị isi na-arụ.

N’ikpeazụ n’ụtụtụ ahụ, e nwere ihe nkiri Bible mara mma nke nwere akụkụ ndị keere òkè na ya yi uwe ihe nkiri mee. Isiokwu ihe nkiri ahụ bụ “Ezinụlọ—Meenụ Ọgụgụ Bible Kwa Ụbọchị Ụzọ Ndụ Unu!” O gosipụtara okwukwe na obi ike nke ndị Hibru atọ ahụ bụ́ ndị jụrụ ịkpọ isiala nye oyiyi ọlaedo nke Eze Nebukadneza nke Babilọn guzobere. Nzube nke ihe nkiri ahụ bụ iji gosi na ọ bụghị nanị na Bible bụ akwụkwọ banyere akụkọ mgbe ochie kama na ndụmọdụ ya bara uru n’ezie nye ma ndị na-eto eto ma ndị okenye taa.

Nnọkọ nke ehihie bụ oge maka okwu ihu ọha bụ́ “Nanị Ụzọ Na-eduga ná Ndụ Ebighị Ebi.” Mgbe ọ tụleghachisịrị akụkọ ihe mere eme banyere ndaba ihe a kpọrọ mmadụ dabara ná mmehie na ọnwụ, ọkà okwu ahụ ji okwu ndị a na-akpali echiche mechie: “Akụkụ Bible ebe isiokwu nke ụbọchị mgbakọ a dabeere na ya bụ Aịsaịa isi 30, amaokwu nke 21, nke na-asị: ‘Ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya; mgbe unu na-eche ihu n’aka nri, na mgbe unu na-eche ihu n’aka ekpe.’ Olee otú anyị si anụ olu a? Ọ bụ site n’ige ntị n’Okwu Chineke, bụ́ Bible Nsọ, na site n’ịgbaso nduzi Onye Nkụzi Ukwu anyị, bụ́ Jehova Chineke na-enye site na ya na site ná nzukọ ndị Kraịst ya nke oge a. N’ezie, ime nke a bụ nanị ụzọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi.”

Mgbe nchịkọta nke isiokwu dịịrị ọmụmụ nke Ụlọ Nche maka izu ahụ gasịrị, okwu ikpeazụ nke isiokwu ya bụ “Nọgide Na-eje Ije n’Ụzọ Jehova,” sochiri. N’otu akụkụ, ọ tụleghachiri isi ihe ndị dị n’usoro ihe omume ahụ. Mgbe ahụ, ọkà okwu ahụ kwupụtara mkpebi nke na-egosi mkpebisi ike ịnọgide na-ebi ndụ n’ụzọ Chineke.

Mkpebi ahụ ji okwu ndị a na-akpali akpali mechie: “Anyị kwenyesiri ike na ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ, ndụmọdụ, na ịdọ aka ná ntị Akwụkwọ Nsọ na-eme ka e bie ndụ kasị mma taa ma na-atọ ezi ntọala maka ọdịnihu, ka anyị wee nwee ike ijide ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie. Karịsịa, anyị na-eme mkpebi a n’ihi na anyị ji obi, mkpụrụ obi, uche, na ume anyị dum hụ Jehova Chineke n’anya!” Ndị nile bịaranụ ji ee dara ụda kwupụta nkwenye ha!

[Igbe/Foto dị na peeji nke 8]

Ọ̀ Dị Onye Okike nke Na-eche Banyere Gị?

Akwụkwọ ọhụrụ ahụ nke bu isiokwu a na-enye ihe àmà nke na-eme ka e kwenye n’ịdị adị nke Onye Okike, bụ́ Jehova, na-atụlekwa àgwà ya. E dere ya karịsịa maka ndị gụrụ oké akwụkwọ n’ihe ụwa ma bụrụ ndị na-ekweghị na Chineke. Akwụkwọ a nwere peji 192 ga-emekwa ka okwukwe nke ndị kwerewooro na Chineke sikwuo ike, na-eme ka a ghọtakwuo àgwà na ụzọ ya nile.

Akwụkwọ ọhụrụ ahụ bụ́ Is There a Creator Who Cares About You? adịghị ewere ya na onye na-agụ ya kweere na Chineke. Kama nke ahụ, ọ na-atụle otú nchọpụta na echiche sayensị ndị e nwere na nso nso a si agba akaebe banyere ịdị adị nke Onye Okike. N’ime isiakwụkwọ ya bụ ndị ahụ isiokwu ha bụ “Gịnị Pụrụ Ime Ka Ndụ Gị Nwekwuo Nzube?,” “Olee Otú Eluigwe na Ala Anyị Si Bịa Dịrị?—Esemokwu Ahụ,” na “Lee Ka I Si Pụọ Iche!” Isiakwụkwọ ndị ọzọ na-atụle ihe mere anyị pụrụ iji jide n’aka na Bible sitere n’aka Chineke. Akwụkwọ ọhụrụ ahụ na-enyekwa ntụle zuru ezu nke Bible, bụ́ nke na-ekpughe àgwà na ụzọ nke Onye Okike. Ọ bụghị nanị na akwụkwọ ahụ na-atụle ihe mere Chineke jiworo kwere ka oké nhụjuanya dịrị kamakwa ọ na-akọwa otú ọ ga-esi kwụsị ya ruo mgbe ebighị ebi.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

E mere ọtụtụ ndị baptism

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ọ bụ A. D. Schroeder, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, wepụtara broshuọ ọhụrụ ahụ

[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

Ihe nkiri na-akpali akpali gbara ume ịgụ Bible kwa ụbọchị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya