Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 4/1 p. 20-22
  • Ònye Na-akpụzi Echiche Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Na-akpụzi Echiche Gị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • À Kpụziri Gị Otú Setan Si Chọọ?
  • Mara Ihe Na-aganụ
  • Mee Ihe Banyere Mkpụzi Jehova
  • Otú Ị Ga-esi Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ na Jehova Na-akpụzi Anyị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Kwe Ka Aka Ná Ntị Jehova Na-adọ Gị Kpụzie Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Kwee Ka Jehova Kpụzie Echiche Gị na Àgwà Gị
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
  • Otú Ị Ga-esi Emeri n’Ọgụ A Na-alụso Uche Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 4/1 p. 20-22

Ònye Na-akpụzi Echiche Gị?

“MMADỤ ọ bụla agaghị agwa m ihe m ga-eche! Ọ dịghịkwa mmadụ ọ bụla ga-agwa m ihe m ga-eme!” Ikwusi nnọọ nke ahụ ike na-apụtakarị na i nwere obi ike dị ukwuu n’ime onwe gị nakwa ná mkpebi gị. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ị na-eche? N’ụzọ kwere nghọta, onye ọzọ ekwesịghị imere gị mkpebi. Ma ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya ịjụ ozugbo ihe pụrụ imesị bụrụ ezi ndụmọdụ? Ọ̀ bụ na ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ inyere gị aka ma ọlị ime mkpebi ndị amamihe dị na ha? Otú ọ dị, ị̀ pụrụ ijide n’aka na ọ dịghị onye na-akpụzi echiche gị n’ezie, ebe gị onwe gị na-amaghịdị banyere ya?

Dị ka ihe atụ, tupu Agha Ụwa nke Abụọ, Joseph Goebbels, bụ́ minista na-agbasara Hitler ihe ọmụma, weghaara ụlọ ọrụ na-emepụta ihe nkiri nke Germany. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ matara na nke a ga-enye ya ngwá agha dị ike nke ukwuu bụ́ nke ọ pụrụ iji “metụta nkwenkwe ndị mmadụ nakwa àgwà ha.” (Propaganda and the German Cinema 1933-1945) Ma eleghị anya ị maara banyere ụzọ dị irè nke na-akụda mmụọ o si jiri nke a na ụzọ ndị ọzọ mee ihe iji chịkwaa ndị nkịtị—ndị uche zuru okè ma na-echezi echiche—ịgbaso nkà ihe ọmụma Nazi n’ajụghị ajụjụ.

Eziokwu bụ na mmetụta na echiche nke ndị ị na-ege ntị na-emetụtatụkarị otú i si eche echiche, nakwa otú i si eme omume. N’ezie, nke a ekwesịghị ịbụ ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na ndị a bụ mmadụ ndị bu ọdịmma gị n’obi—dị ka ndị nkụzi, ndị enyi, ma ọ bụ ndị mụrụ gị—mgbe ahụ ị ga-enweta abamuru dị ukwuu site na ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị ha. Ma ọ bụrụ na ha bụ ndị bu nanị ọdịmma nke aka ha n’obi, ndị e duhiekwara ma ọ bụ merụọ echiche ha, “ndị na-aghọgbukwa obi mmadụ,” dị ka Pọl onyeozi si kọwaa ha, mgbe ahụ kpachara anya!—Taịtọs 1:10; Deuterọnọmi 13:6-8.

Ya mere, aghọla onye onwe ya juru afọ ma na-eche na ọ dịghị onye pụrụ inwe mmetụta n’ahụ gị mgbe ọ bụla. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 10:12.) O yikarịrị ka ọ malitelarị ime—ọtụtụ mgbe karịa otú ị pụrụ ịdị njikere ikweta—ebe gị onwe gị na-achọpụtaghịdị ya. Were ihe atụ ahụ dị mfe banyere ihe i kpebiri ịzụ mgbe ị gara ịzụ ihe. Nke ahụ ọ̀ na-abụkarị mkpebi i meere onwe gị, nke ezi uche dị na ya? Ka ndị ọzọ, bụ́ ndị ị na-ahụghị mgbe mgbe, hà na-emetụta nhọrọ gị n’ụzọ dị aghụghọ ma dịkwa ike? Odeakụkọ na-eme nchọpụta bụ́ Eric Clark na-eche na ha na-eme. “Ka a na-ejikwu mkpọsa ngwá ahịa awụkwasị anyị,” ka ọ na-ekwu, “otú ahụ ka anyị na-adịghị amata mmetụta ya, ọzọkwa, n’ụzọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe e ji n’aka, otú ahụ ka ọ na-emetụta anyị karị.” Ọ kọkwara na mgbe a jụrụ ndị mmadụ otú ha chere na mkpọsa ngwá ahịa dịruru n’irè, “ihe ka ọtụtụ na-ekweta na ọ na-arụ ọrụ, ma ọ bụghị n’ebe ha nọ.” Ndị mmadụ na-echekarị na e kpughere onye ọ bụla ọzọ nye mmetụta a, ma e kpugheghị ha onwe ha. “Nye nanị ha onwe ha, ọ na-eyi ka nke ahụ apụghị imetụta ha.”—The Want Makers.

À Kpụziri Gị Otú Setan Si Chọọ?

O nwere ike ọ gaghị adị ihe ọjọọ si na ya apụta ma ọ bụrụ na mkpọsa ngwá ahịa a na-eme kwa ụbọchị na-emetụta gị. Otú ọ dị, e nwere mmetụta ọzọ nke dị nnọọ ize ndụ karị. Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na Setan bụ ọkà n’iji aghụghọ achịkwa ihe. (Mkpughe 12:9) N’ụzọ bụ́ isi, nkà ihe ọmụma ya na echiche nke otu onye na-eme mkpọsa ngwá ahịa bụ otu ihe, bụ́ onye sịrị na e nwere ụzọ abụọ e si emetụta ndị na-azụ ngwá ahịa—“site n’ịrata ha arata ma ọ bụ site n’ịkpụzigharị ha.” Ọ bụrụ na ndị na-agbasa ihe ọmụma na ndị na-akpọsa ngwá ahịa pụrụ iji ụzọ aghụghọ dị otú ahụ mee ihe iji kpụzigharịa echiche gị, lezienụ otú Setan na-aghaghị isi nwee nkà ka nnọọ ukwuu n’iji usoro ime ihe yiri nke ahụ na-eme ihe!—Jọn 8:44.

Pọl onyeozi maara nke a. Ọ tụrụ egwu na ụfọdụ ndị Kraịst ibe ya nwere ike ghara ịnọ na nche ma ghọọ ndị Setan ghọgburu. O dere, sị: “Ana m atụ egwu, ma ò nwere ụzọ ọ bụla a ga-emebi uche unu ka unu pụọ n’afọ ofufo na ịdị ọcha nke dị n’ebe Kraịst nọ, dị ka agwọ ahụ weere aghụghọ ya ghọgbuo Iv.” (2 Ndị Kọrint 11:3) Jiri ịdọ aka ná ntị ahụ kpọrọ ihe. Ma ọ́ bụghị ya i nwere ike ịdị ka ndị ahụ kwetara na mgbasa ihe ọmụma na mkpụzigharị na-arụ ọrụ—“ma ọ bụghị n’ebe ha nọ.” Eziokwu bụ́ na mgbasa ihe ọmụma nke Setan na-arụ ọrụ bụ nke a na-ahụ nke ọma gburugburu anyị n’obi ọjọọ, ịrụ arụ, na ihu abụọ nke e ji mara ọgbọ a.

Ya mere, Pọl rịọrọ ndị Kraịst ibe ya ka ha ghara ‘ikwe ka e mee ka ha yie ajọ oge a.’ (Ndị Rom 12:2) Otu onye nsụgharị Bible degharịrị okwu Pọl n’ụzọ dị otú a: “Ekwela ka ụwa nke gbara gị gburugburu kpụzie gị otú o si chọọ.” (Ndị Rom 12:2, Phillips) Setan ga-anwa ihe ọ bụla ọ pụrụ ime iji manye gị ịdị otú o si chọọ, dị ka ọkpụite nke oge ochie bụ́ onye sụnyejuru ụrọ n’ime ihe e ji akpụ ite iji nweta akara na njimara ndị ọ chọrọ ka ha dị n’ahụ ya. Setan emewo ka ndọrọ ndọrọ ọchịchị, azụmahịa, okpukpe, na ntụrụndụ nke ụwa dị njikere ime nke ahụ. Olee nnọọ ókè mmetụta ya gbasarurula? Ọ gbasaruru ebe nile dị ka ọ gbasara n’ụbọchị Jọn onyeozi. “Ụwa dum,” ka Jọn kwuru, “na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19; leekwa 2 Ndị Kọrint 4:4.) Ọ bụrụ na i nwere obi abụọ ọ bụla banyere ikike Setan nwere ịrafu ndị mmadụ ma merụọ echiche ha, cheta otú o si mee nke a n’ụzọ dị irè n’ebe otu mba nke jupụtara nnọọ ná mmadụ, bụ́ Israel nọ, bụ́ ndị raara onwe ha nye Chineke. (1 Ndị Kọrint 10:6-12) Otu ihe ahụ ọ̀ pụrụ ime gị? Ọ pụrụ ma ọ bụrụ na i ghewe uche gị oghe nye mmetụta na-arafu arafu nke Setan.

Mara Ihe Na-aganụ

N’ozuzu ya, ikike aghụghọ ndị dị otú ahụ ga-emetụta echiche gị nanị ma ọ bụrụ na i kwe ha. N’akwụkwọ ya bụ́ The Hidden Persuaders, Vance Packard kwuru okwu nke a: “Anyị ka nwere ihe nchebe siri ike megide ndị nrụgide dị otú ahụ [zoro ezo]: anyị pụrụ ịhọrọ ịghara ịbụ ndị a rụgidere. N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ọnọdụ nile, anyị ka nwere nhọrọ, a pụghịkwa ịchịkwa anyị n’ụzọ dị oké njọ ma ọ bụrụ na anyị amara ihe na-aganụ.” Nke ahụ bụkwa eziokwu banyere mgbasa ihe ọmụma na aghụghọ.

N’ezie, iji ‘mara ihe ga-aganụ,’ ị ghaghị ighewe uche gị oghe ma mee ka ọ na-anabata mmetụta ndị dị mma. Ọ dị uche dị mma mkpa, dịkwa nnọọ ka ọ dị ahụ dị mma mkpa, ịbụ ihe a na-azụ nke ọma ma ọ bụrụ na ọ gaje ịrụ ọrụ nke ọma. (Ilu 5:1, 2) Enweghị ihe ọmụma pụrụ nnọọ ịbụ ihe na-emebi ihe dịkwa ka ihe ọmụma na-ezighị ezi. Ya mere ọ bụ eziokwu na ọ dị gị mkpa ichebe uche gị pụọ n’echiche na nkà ihe ọmụma ndị na-eduhie eduhie, gbalịa ịghara ịzụlite echiche ịkpọasị na enweghị ntụkwasị obi banyere ndụmọdụ ma ọ bụ ihe ọmụma nile e nyere gị.—1 Jọn 4:1.

Iji ezi obi na-arụgide mmadụ na iji ụzọ nzuzo na-agbasa ihe ọmụma abụghị otu ihe. N’ezie Pọl onyeozi dọrọ nwa okoro ahụ bụ́ Timoti aka ná ntị ịnọ na nche maka “ajọ mmadụ nile na ndị aghụghọ [bụ́ ndị] ga na-aga n’ihu n’ịjọkarị njọ, na-eduhie ndị ọzọ, a na-eduhiekwa ha.” Ma Pọl gbakwụnyere, sị: “Ma gị onwe gị, nọgide n’ime ihe nile ị mụtara, nke e mekwara ka i kwere ha, ebe ị matara mmadụ ndị ị mụtara ha n’ọnụ ha.” (2 Timoti 3:13, 14) Ebe ọ bụ na ihe nile i webatara n’ime uche gị ga-emetụta gị ruo n’ókè ụfọdụ, ihe bụ́ isi bụ ‘ịmata mmadụ ndị ị mụtara ihe n’ọnụ ha,’ ijide n’aka na ha bụ ndị bu ọdịmma gị kasị mma n’obi, ọ bụghị nke ha.

Ọ dịịrị gị ime nhọrọ. Ị pụrụ ịhọrọ ịbụ onye ‘e mere ka o yie ajọ oge a’ site n’ikwe ka nkà ihe ọmụma ụwa a na ihe ndị o ji kpọrọ oké ihe chịkwaa echiche gị. (Ndị Rom 12:2) Ma ụwa a ebughị ọdịmma gị n’obi. Ya mere, “Lezienụ anya,” ka Pọl onyeozi na-adọ aka ná ntị, “ka onye ọ bụla ghara iwere ịhụ amamihe n’anya na aghụghọ efu nke ya bụrụ onye na-ezu unu n’ohi, ịhụ amamihe n’anya nke dị ka ihe ozizi mmadụ nyere idebe.” (Ndị Kọlọsi 2:8) Ịbụ onye a kpụzigharịrị otú Setan si chọọ n’ụzọ a, ma ọ bụ onye ‘ọ na-ezu n’ohi,’ adịghị ewe mgbalị ọ bụla. Ọ dị ka anwụrụ ọkụ e kupụrụ ekupụ. Ọ pụrụ imetụta gị nanị site n’ikuru ikuku ahụ e merụrụ emerụ.

N’aka nke ọzọ, ị pụrụ izere ikuru “ikuku” ahụ. (Ndị Efesọs 2:2, NW) Kama nke ahụ, gbasoo ndụmọdụ Pọl bụ́: “Ka e nwoghaa unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ, ka unu wee nwapụta ihe bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè.” (Ndị Rom 12:2) Nke a na-ewe mgbalị. (Ilu 2:1-5) Cheta, Jehova abụghị onye na-eji aghụghọ achịkwa mmadụ. Ọ na-eme ka e nwee ihe ọmụma nile dị mkpa, ma iji rite uru na ya, ị ghaghị ige ntị na ya ma kwe ka o metụta echiche gị. (Aịsaịa 30:20, 21; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:13) Ị ghaghị ịdị njikere iji eziokwu ahụ dị ‘n’ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ,’ bụ́ Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible, mejuo uche gị.—2 Timoti 3:15-17.

Mee Ihe Banyere Mkpụzi Jehova

Mkpa ọ dị gị irube isi na ịdị njikere ime ihe ma ọ bụrụ na ị ga-erite uru site ná mmetụta nke mkpụzi Jehova bụ nke e gosipụtara n’ụzọ siri ike mgbe Jehova gwara Jeremaịa onye amụma ka ọ gaa n’ụlọ ọrụ nke onye ọkpụite. Jeremaịa hụrụ ka ọkpụite ahụ gbanwere obi ya banyere ihe ọ ga-eji otu arịa mee mgbe ihe ahụ ọ nọ na-agbalị ịkpụ ‘bibiri n’aka ọkpụite ahụ.’ Mgbe ahụ Jehova kwuru, sị: “Àpụghị m ime unu dị ka ọkpụite a mere, unu ụlọ Israel? . . . Lee, dị ka ụrọ si dị n’aka ọkpụite a, otú a ka unu onwe unu dị n’aka m, unu ụlọ Israel.” (Jeremaịa 18:1-6) Nke ahụ ọ̀ pụtara na ndị nọ n’Israel dị nnọọ ka ọkpụrụkpụ ụrọ na-adịghị ndụ bụ́ ndị dị n’aka Jehova maka ya ịkpụzi ha otú o si masị ya gaa n’otu ụdị arịa ma ọ bụ ọzọ?

Jehova adịtụghị eji ike ya pụrụ ime ihe nile eme ka ndị mmadụ mee ihe ndị megidere ọchịchọ ha; ọ bụghịkwa ya na-akpata ihe ndị nwere ntụpọ, dị ka ọ pụrụ ịdị n’ebe ọkpụite bụ́ mmadụ nọ. (Deuterọnọmi 32:4) Ntụpọ na-amalite ịdị mgbe ndị Jehova gbalịrị ịkpụzi n’ụzọ dị mma guzogidere nduzi ya. Nke ahụ bụ otu nnukwu ọdịiche dị n’etiti gị na ọkpụrụkpụ ụrọ na-adịghị ndụ. I nwere onwe gị ime nhọrọ. N’iji ya mee ihe, ị pụrụ ịhọrọ ime ihe banyere mmetụta nke mkpụzi Jehova ma ọ bụ kpachara anya jụ ya.

Lee ihe mmụta na-akpali iche echiche nke a bụ! Lee ka o si dị mma ige ntị n’olu Jehova karịa iji mpako na-asị, “Mmadụ ọ bụla agaghị agwa m ihe m ga-eme”! Mmetụta nke nduzi Jehova dị anyị nile mkpa. (Jọn 17:3) Dịrị ka ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid, onye kpere ekpere, sị: “Jehova, mee ka m mara ụzọ Gị nile; zi m okporo ụzọ Gị nile.” (Abụ Ọma 25:4) Cheta ihe Eze Solomọn kwuru: “Ka onye maara ihe wee nụ, wee tụkwasị ihe mmụta n’amamihe ya.” (Ilu 1:5) Ị̀ ga-ege ntị? Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, mgbe ahụ “izuzu ga na-eche gị nche, nghọta ga-echebe gị.”—Ilu 2:11.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya