Ọ̀ Dị Onye Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
“Anya mmiri nke ndị a na-emegbu” aghọọla mmiri na-ekwo ekwo. Ọ bụ ndị nwetaworo ọtụtụ “mmegbu” n’ụwa nile, ka ọ na-agba. Ndị e megbuworo na-echekarị na “ọ dịghị onye nkasi obi” ha nwere—na ọ dịghị onye na-eche banyere ha n’ezie.—Eklisiastis 4:1.
N’AGBANYEGHỊ anya mmiri a na-agbasi ike, nhụjuanya nke mmadụ ibe ha adịghị emetụ ụfọdụ ndị n’obi. Ha na-eleghara ihe mgbu nke ndị ọzọ anya, dị ka onye nchụàjà na onye Livaị ahụ a kọrọ banyere ha n’ilu Jisọs Kraịst banyere otu nwoke a wakporo, zuo ya ohi, hapụkwa ya ọ dị ndụ ọnwụ ka mma n’akụkụ ụzọ, mere. (Luk 10:30-32) Ọ bụrụhaala na ihe na-agazitụrụ ha na ezinụlọ ha, ha adịghị eche banyere ndị ọzọ. N’ụzọ dị otú ahụ, ha na-asị, “Ọ̀ gbasara m?”
Nke a ekwesịghị iju anyị anya. Pọl onyeozi buru n’amụma na na “mgbe ikpeazụ” ọtụtụ mmadụ ga-abụ ndị “ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ.” (2 Timoti 3:1, 3) Otu onye na-ekiri ihe na-emenụ kwara arịrị banyere àgwà ọ gbasaghị m ndị biliteworonụ. “Ụkpụrụ ọhụrụ nke iche nanị banyere onwe anyị,” ka o kwuru, “na-anọchizi nkwenkwe na ọdịnala ochie nke ndị Ireland bụ́ iche banyere ndị ọzọ na ikerịta ihe.” Gburugburu ụwa, ndị mmadụ na-eche nanị banyere onwe ha nke na ọ na-afọ nke nta ka ha ghara ichebatụrụ ọnọdụ ndị ọzọ echiche ma ọlị.
Mkpa Maka Onye Ga-eche Banyere Anyị
N’ezie, e nwere mkpa maka onye ga-eche banyere anyị. Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere otu nwoke owu mara na Germany bụ́ onye a “hụrụ ka ọ nọ ala n’ihu telivishọn ya—afọ ise mgbe ọ nwụsịrị n’oge Krismas.” Agụụ ịhụ nwoke a “a gbara alụkwaghịm, nke nwere nkwarụ bụ́ onye owu na-ama,” onye nwere obi ilu n’ihi ahụmahụ ndị dị mwute o nwere ná ndụ, agụghị ndị mmadụ ruo mgbe ego o nwere n’ụlọ akụ̀ bụ́ nke e si adọrọ ụgwọ ụlọ ya, gwụrụ. Ọ dịghị onye chere banyere ya n’ezie.
Cheekwa banyere ndị na-enweghị enyemaka bụ́ ndị ndị nna ukwu dị ike, ma dị anyaukwu na-emegbu. N’otu ógbè, “mmegbu na ụnwụ nri gburu” ihe dị ka mmadụ 200,000 (otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị bi n’ógbè ahụ) mgbe a napụsịrị ha ala ha n’ike. Ma ọ bụ chee banyere ụmụaka hụrụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụdị obi ọjọọ a na-apụghị ikweta ekweta. Otu akụkọ kwuru, sị: “Ọnụ ọgụgụ ụmụaka nọ [n’otu ala] bụ́ ndị hụrụ arụrụala dị iche iche—igbu mmadụ, iti ihe, ndina n’ike, nke ọ bụ ndị ọzọ nọ n’oge uto na-eme ha mgbe ụfọdụ—hiri nne nke ukwuu.” Ị pụrụ ịghọta ihe mere onye e mesoworo ihe n’ụzọ ọjọọ dị otú ahụ pụrụ iji were anya mmiri jụọ, sị, “Ọ̀ dị onye na-eche banyere m n’ezie?”
Dị ka otu akụkọ nke Mba Ndị Dị n’Otu si kwuo, ijeri 1.3 nke ndị bi ná mba ndị ka na-emepe emepe na-adị ndụ n’ihe na-erughị otu dollar U.S. kwa ụbọchị. Ha aghaghị iche ma ọ̀ dị onye na-eche banyere ha. Otú ahụ ka ọ dị ọtụtụ puku ndị gbara ọsọ ndụ bụ́ ndị otu akụkọ si n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Irish Times na-ekwu na “nhọrọ jọgburu onwe ya na-eche ha ịhụ bụ nke ịnọ n’ogige jọgburu onwe ya ma ọ bụ ná mba na-adịghị ele ọbịa ma ọ bụ ịnwa ịlaghachi n’ala nna ha bụ́ nke agha ma ọ bụ nkewa agbụrụ ka tisasịrị.” Otu akụkọ ahụ gụnyere usoro a na-akụda mmụọ bụ́: “Mechie anya gị, gụruo atọ, otu nwatakịrị anwụọla. Otu n’ime ụmụaka 35,000 bụ́ ndị ga-anwụ taa n’ihi erighị nri na-edozi ahụ ma ọ bụ ọrịa ndị a pụrụ igbochi egbochi.” Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ndị ji ebe ákwá n’ihi ahụhụ na obi ilu!—Tụlee Job 7:11.
È zubere ka ihe a nile dịrị nnọọ otú a? N’ụzọ ezi uche dị na ya, ọ̀ dị onye na-abụghị nanị na ọ na-eche banyere anyị kamakwa nwere ikike ịkwụsị nhụjuanya na ịgwọ ihe mgbu nile nke ndị mmadụ nweworo?
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 2]
Ihu akwụkwọ na peji nke 32: Reuters/Nikola Solic/Archive Photos
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 3]
A. Boulat/Sipa Press