Jehova Bụụrụ M Chineke nke Ezi Ịhụnanya
DI KA JOHN ANDRONIKOS SI KỌỌ
Ọ bụ n’afọ 1956. Ọ ka bụ nanị ụbọchị itoolu m lụsịrị nwunye, n’ebe a akwụ m n’ihu ụlọikpe mkpegharị ikpe dị na Komotiní, n’ebe ugwu Gris. Olileanya m bụ na a ga-akagbu ikpe mkpọrọ ọnwa 12 a mara m n’ihi ikwusa Alaeze Chineke. Mkpebi ikpe nke ụlọikpe mkpegharị ikpe a—ịnọ ọnwa isii n’ụlọ mkpọrọ—mere ka olileanya ahụ dakpọọ ma ghọọ nnọọ mmalite nke ọtụtụ ule. Otú ọ dị, n’ime ha nile, Jehova bụụrụ m Chineke nke ezi ịhụnanya.
MGBE a mụrụ m n’October 1, 1931, ezinụlọ anyị bi n’obodo Kaválla, bụ́ Neapolis nke Masedonia nke Pọl onyeozi letara n’oge njem ozi ala ọzọ nke abụọ ya. Mama m ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova mgbe m dị afọ ise, ọ bụkwa ezie na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iti, ọ gbalịrị ike ya ịkụnye ịhụnanya maka Chineke na egwu ya n’ime m. Papa m bụ nwoke na-adịghị anabatatụ echiche dị iche nke jiri ikwesi olu ike jigidesie ọdịnala chọọchị Ọtọdọks nke Gris ike. O nweghị mmasị n’eziokwu Bible, o megidekwara mama m, na-emekarị ihe ike.
N’ihi ya, etolitere m n’ezinụlọ kewara ekewa, bụ́ ebe papa m tiri mama m ihe, mesookwa ya ihe n’ụzọ ọjọọ, ọbụnakwa gbahapụ anyị. Site n’oge m bụ nwata, mama m na-akpọrọ mụ na nwanne m nta nwanyị eje nzukọ ndị Kraịst. Otú ọ dị, mgbe m ruru afọ 15, ọchịchọ ndị ntorobia na mmụọ nke nnwere onwe mere ka m kewapụ onwe m n’ebe Ndịàmà Jehova nọ. Ka o sina dị, mama m bụ́ onye na-ekwesị ntụkwasị obi gbalịsiri nnọọ ike, anya mmiri gbakwara ya ọtụtụ mgbe ka ọ na-agbalị inyere m aka.
N’ihi ịda ogbenye na ndụ ọjọọ m na-ebi, ọrịa siri ike jidere m, aghaghịkwa m idina n’àkwà ruo ihe karịrị ọnwa atọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka otu nwanna nwoke dị nnọọ umeala n’obi, bụ́ onye nyeere mama m aka ịmụta eziokwu, chọpụtara na m nwere ezi ịhụnanya n’ebe Chineke nọ. O chere na a pụrụ inyere m aka ịdịghachi ike n’ụzọ ime mmụọ m. Ndị ọzọ gwara ya, sị: “Ị na-atụfu oge gị ịnwa inyere John aka; O mekataghị nweghachi mmasị n’ihe ime mmụọ.” Ma ndidi nwanna nwoke a na nnọgidesi ike ya n’inyere m aka mịpụtara mkpụrụ. N’August 15, 1952, mgbe m dị afọ 21, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova site na baptism ime mmiri.
Onye Lụrụ Nwunye Ọhụrụ ma Nọrọ n’Ụlọ Mkpọrọ
Afọ atọ mgbe nke ahụ gasịrị, m matara Martha, bụ́ nwanna nwanyị nwere àgwà ndị pụtara ìhè ma jiri ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, n’oge na-adịghịkwa anya, anyị banyere ná nkwa ọlụlụ. Otu ụbọchị o juru m nnọọ anya mgbe Martha gwara m, sị: “Taa ezubere m ime nkwusa site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ. Ị̀ chọrọ iso m jee?” Tupu mgbe ahụ ekeretụbeghị m òkè n’akụkụ a nke ọrụ ahụ, ebe ọ bụ na m na-eme nkwusa na mberede karịsịa. N’oge ahụ a machibidoro ọrụ nkwusa iwu na Gris, anyị aghaghịkwa ịrụ ọrụ nkwusa anyị na nzuzo. N’ihi ya a nwụchiri ọtụtụ ndị, nwee ọtụtụ okwu ikpe, maakwa ọtụtụ ndị ikpe ije mkpọrọ. Ma, apụghị m ịjụ isonyere nwa agbọghọ m chọrọ ịlụ!
Martha ghọrọ nwunye m na 1956. Ọ bụ mgbe ahụ, ụbọchị itoolu anyị gbasịrị akwụkwọ, ka ụlọikpe mkpegharị ikpe ahụ dị na Komotiní mara m ikpe ịga mkpọrọ ọnwa isii. Nke a chetaara m otu ajụjụ m jụrụ otu nwanna nwanyị onye Kraịst bụ́ enyi mama m, n’otu oge gara aga, sị: “Olee otú ọ pụrụ isi kwe m mee igosi na abụ m ezi Onyeàmà Jehova? Enwebeghị m ohere igosipụta okwukwe m.” Mgbe nwanna nwanyị a bịara ileta m n’ụlọ mkpọrọ, o chetaara m ajụjụ ahụ ma kwuo, sị: “Ugbu a ị pụrụ igosi Jehova ókè ị hụruru ya n’anya. Nke a bụ ọrụ dịịrị gị.”
Mgbe m nụrụ na ọkàiwu m na-agbalị inweta ego iji gbapụta m n’ụlọ mkpọrọ, agwara m ya na ọ ga-akara m mma ịnọzu oge mkpọrọ m. Lee obi ụtọ m nwere ịhụ ka mmadụ abụọ n’ime ndị mkpọrọ ibe m nabatara eziokwu ka ọ na-erule ngwụsị nke mkpọrọ ọnwa isii ahụ a tụrụ m! N’afọ ndị sochirinụ, a kpụụrụ m gaa n’ụlọikpe ọtụtụ mgbe n’ihi ozi ọma ahụ.
Nhọrọ Ndị Anyị Na-akwatụbeghịrị Ụta
Na 1959, afọ ole na ole mgbe a tọhapụsịrị m, anọ m na-eje ozi dị ka ohu ọgbakọ, ma ọ bụ onyeisi oche ndị nlekọta, a kpọkwara m òkù ịbịa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze, bụ́ ọzụzụ maka ndị okenye ọgbakọ. Otú ọ dị, n’otu oge ahụ, e nyere m ọkwa na-adịgide adịgide n’otu ụlọ ọgwụ ọha na eze, bụ́ ọrụ ga-enye mụ na ezinụlọ m ego ga-ezuru anyị ná ndụ. Olee nke m ga-ahọrọ? Anọwo m rị na-arụ ọrụ nwa oge n’ụlọ ọgwụ ahụ ruo ọnwa atọ, aka ọrụ m jukwara onyeisi anyị afọ, ma mgbe akwụkwọ ịkpọ òkù maka ụlọ akwụkwọ ahụ bịarutere, o kweghị ka m were ọbụna oge ezumike a na-agaghị akwụ m ụgwọ maka ya. Mgbe m jisịrị ekpere chebara ọnọdụ amaghị nke a ga-eme ahụ m nọ n’ime ya echiche, ekpebiri m idebe ọdịmma nke Alaeze ahụ n’ihu ma jụ ọrụ ahụ e nyere m.—Matiu 6:33.
N’ihe dị ka n’otu oge ahụ, onye nlekọta distrikti na onye nlekọta sekit bịara ileta ọgbakọ anyị. Anyị aghaghị inwe nzukọ anyị na nzuzo n’ụlọ ndị mmadụ n’ihi mmegide siri ike nke ndị ụkọchukwu chọọchị Ọtọdọks nke Gris na ndị ọchịchị. Mgbe otu n’ime nzukọ ndị ahụ gasịrị, onye nlekọta distrikti ahụ bịakwutere m jụọ m ma echeela m echiche ịbanye n’ozi oge nile. Aro ya metụtara m n’obi nke ukwuu n’ihi na nke a abụwo ọchịchọ m kemgbe e mere m baptism. Azaghachiri m, sị: “Achọsiri m ya nnọọ ike.” Otú ọ dị, enwekwuola m ibu ọrụ nke izulite otu nwa nwanyị. Nwanna nwoke ahụ gwara m, sị: “Tụkwasị Jehova obi, ọ ga-enyekwara gị aka imezu atụmatụ gị.” N’ihi ya, n’elefurughị ibu ọrụ ezinụlọ anyị anya, mụ na nwụnye m nwere ike ịgbanwe ọnọdụ anyị, m wee malite ije ozi n’ebe ọwụwa anyanwụ Masedonia dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche na December 1960—otu n’ime ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ise e nwere ná mba ahụ.
Ka m rụsịrị ọrụ dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche ruo otu afọ, alaka ụlọ ọrụ dị n’Atens kpọrọ m òkù ije ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Mgbe m si ọzụzụ otu ọnwa maka ụdị ije ozi a lọta, mgbe m ka na-akọkwara Martha ahụmahụ m, onyeisi nke otu ụlọ ọrụ na-egwụpụta ọla e ji emepụta enyo bịara n’ụlọ anyị ma kpọọ m òkù ka m bịa ghọọ manịja nke ngalaba na-anụcha ha anụcha, na-enye m ọrụ ngo afọ ise a ga-akwụ m ezigbo ego na ya, ụlọ mara mma, na ụgbọala. O nyere m ụbọchị abụọ iji zaghachi ya. Ọzọkwa, n’alaghị azụ ma ọlị, ekpekuuru m Jehova ekpere, sị: “Lee m; ziga m.” (Aịsaịa 6:8) Nwunye m kwenyesiri ike. N’ịtụkwasị Chineke obi, anyị malitere ọrụ njegharị ahụ, ọ dịtụghịkwa mgbe Jehova, n’ezi ịhụnanya ya, mechuru anyị ihu.
Ije Ozi n’Agbanyeghị Ihe Isi Ike Nile
Ọ bụ ezie na e nwere ihe isi ike nke ọnọdụ akụ̀ na ụba, anyị gara n’ihu, Jehova nyekwara anyị ihe ndị dị anyị mkpa. Ná mmalite, ana m agbara obere ọgba tum tum eje eleta ọgbakọ, na-agazu ihe ruru kilomita 500. Ọtụtụ mgbe ihe siiri m ike, enwekwara m ihe mberede ole na ole. Mgbe m si n’otu ọgbakọ na-alọta n’otu oge oyi, ọgba tum tum ahụ nyụrụ ọkụ ka m na-agafere otu nnukwu iyi na-asọsi ike, mmiri dekwara m ruo n’ikpere. Taya ọgba tum tum ahụ adazie afọ. Onye na-agafe agafe nwere ihe e ji agbanye ya ikuku nyeere m aka, esikwa m otú a nwee ike iru n’obodo nta dịkarịsịrị nso bụ́ ebe m rụziri taya ahụ. Emesịrị m laruo ụlọ n’elekere atọ nke ụtụtụ, oké oyi jidere m, ike agwụsịakwa m.
N’oge ọzọ, ka m si n’otu ọgbakọ na-aga n’ọzọ, ihe chịịrị ọgba tum tum ahụ, ya daakwa m n’ikpere. N’ihi ya, traụza m dọkara, ọbara edeekwa ya. Enweghị traụza ọzọ, ya mere n’uhuruchi ahụ eyi m traụza nwanna nwoke ọzọ, nke dị m owoghoro nke ukwuu, kwuo okwu. Ma, ọ dịghị ihe isi ike ọ bụla ga-eme ka ọchịchọ m nwere ijere Jehova na ụmụnna m m hụrụ n’anya ozi jụọ oyi.
N’ihe mberede ọzọ, emerụrụ m ahụ nke ukwuu, gbajie aka ma kụjasịa eze ihu m. Ọ bụ mgbe ahụ ka nwanne m nwanyị nke na-abụghị Onyeàmà bi na United States letara m. Lee ahụ efe ọ bụụrụ m mgbe o nyeere m aka ịzụta ụgbọala! Mgbe ụmụnna ndị nọ n’alaka Atens nụrụ banyere ihe mberede m, ha ziteere m akwụkwọ ozi na-agba ume, tinyere ihe ndị ọzọ, ha hotara okwu ndị ahụ dị na Ndị Rom 8:28, nke akụkụ ya ụfọdụ na-ekwu, sị: “[Chineke na-eme ka] ihe nile na-arụkọ ọrụ iwetara ndị hụrụ Chineke n’anya ezi ihe.” Ugboro ugboro, mmesi obi ike a mezuru nnọọ ná ndụ m!
Ihe Ịtụnanya Obi Ụtọ
Na 1963, mụ na otu ọsụ ụzọ pụrụ iche na-eje ozi n’otu obodo nta ebe ndị mmadụ na-adịghị anabata ozi ọma. Anyị kpebiri ịrụ iche iche, onye nke ọ bụla ana-arụ otu akụkụ nke okporo ámá ahụ. N’otu ụlọ, ozugbo m kụrụ aka n’ọnụ ụzọ, otu nwanyị dọkpụbara m n’ime ụlọ ngwa ngwa ma gbachigide m ụzọ. O juru m anya, m na-eche ihe na-aganụ. Ntakịrị oge mgbe nke a gasịrị, ọ kpọbatakwara ọsụ ụzọ pụrụ iche ahụ ngwa ngwa n’ime ụlọ ahụ. Nwaada ahụ gwaziri anyị, sị: “Mechienụ ọnụ! Unu emegharịdịla ahụ!” Mgbe obere oge gasịrị, anyị nụrụ olu iwe dị iche iche n’èzí. Ndị mmadụ na-achọgharị anyị. Mgbe ebe nile dajụlatara, nwaada ahụ gwara anyị, sị: “Emere m nke a iji chebe unu. Ana m akwanyere unu ùgwù n’ihi na ekwere m na unu bụ ezi ndị Kraịst.” Anyị kelere ya nke ọma ma pụọ, na-ahapụrụ ya ọtụtụ akwụkwọ.
Afọ 14 nke a gasịrị, mgbe m nọ n’otu mgbakọ distrikti e nwere na Gris, otu nwanyị bịakwutere m ma sị: “Nwanna, ì chetara m? Abụ m nwanyị ahụ chebere unu pụọ n’aka ndị mmegide mgbe unu bịara ịgba àmà n’obodo anyị.” Ọ kwagawo Germany, mụọ Bible, ma soro ndị Jehova na-akpakọrịta. Ugbu a, ezinụlọ ya nile nọ n’eziokwu.
N’ezie, n’ime afọ ndị a nile, e jiriwo ọtụtụ “akwụkwọ ozi ime ka mmadụ mara anyị” gọzie anyị. (2 Ndị Kọrint 3:1) Ọtụtụ n’ime ndị anyị nwere ihe ùgwù nke inyere aka inweta ihe ọmụma nke eziokwu Bible na-ejezi ozi dị ka ndị okenye, ndị ohu na-eje ozi, na ndị ọsụ ụzọ. Lee ihe na-eme obi ụtọ ọ bụ ịhụ ka ndị nkwusa ole na ole nọ na sekit m jere ozi na ya laa azụ ná mmalite afọ ndị 1960 mụbaworo ruo ihe karịrị 10,000 ndị na-efe Jehova! Otuto nile na-agara Chineke anyị nke ezi ịhụnanya, bụ́ onye na-eji anyị eme ihe n’ụzọ ya.
“N’elu Ihe O Ji Dinaa Mgbe Ahụ Na-adịghị Ya Ike”
N’afọ ndị anyị nọrọ n’ọrụ njegharị, Martha bụụrụ m onye inyeaka pụrụ iche, na-enwe omume ọṅụ mgbe nile. Otú ọ dị, n’October 1976, ọ dara oké ọrịa, a waakwa ya ahụ na-egbu mgbu. N’ikpeazụ ọ ghọrọ onye akụkụ ahụ ya site n’úkwù gbadata nwụrụ anwụ nke na-eji oche nkwagharị aga. Olee otú anyị pụrụ isi nagide ego ọ ga-efu na ahụhụ mmetụta uche ya na ya so? N’ịtụkwasị Jehova obi ọzọ, anyị nwetara ịhụnanya na mmesapụ aka ya. Mgbe m pụrụ ije ozi na Masedonia, Martha nọrọ n’ụlọ otu nwanna nwoke n’Atens maka usoro ọgwụgwọ anụ ahụ. Ọ na-akpọ m na fon gwa m okwu ndị a na-agba ume: “Ahụ dị m. Jisie ike, mgbe ahụ gbasiri m ike ijegharị ọzọ, m ga-esonyere gị n’oche nkwagharị m.” Nke ahụ bụkwa kpọmkwem ihe o mere. Ezi ụmụnna anyị ndị nọ na Betel ziteere anyị ọtụtụ akwụkwọ ozi agbamume. Ugboro ugboro e chetaara Martha okwu ndị ahụ dị n’Abụ Ọma 41:3: “Jehova ga-akwagide ya n’elu ihe o ji dinaa mgbe ahụ na-adịghị ya ike: ihe ndina ya nile ka Ị gbanweworo n’ọrịa ya.”
N’ihi oké nsogbu ahu ike ndị a, na 1986 e kpebiri na ọ ga-ekwesị ekwesị ka m na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche na Kaválla, bụ́ ebe m bidewere ezinụlọ nwa anyị nwanyị. Martha m hụrụ n’anya nwụrụ n’ọnwa March gara aga, o kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ. Tupu ya nwụọ, mgbe ụmụnna jụrụ ya, sị: “Olee otú ị dị?” ọ na-azakarị, sị: “Ebe m nọ Jehova nso, ahụ dị m nnọọ mma!” Mgbe anyị na-akwadebe maka nzukọ ma ọ bụ nata ọkpụkpọ òkù ije ozi n’ebe owuwe ihe ubi hiri nne, Martha naara ekwu, sị: “John, ka anyị gaa jee ozi n’ebe mkpa ka ukwuu.” Ọ dịtụghị mgbe o kwere ka mmụọ ịnụ ọkụ n’obi ya jụọ oyi.
Afọ ole na ole gara aga, mụ onwe m kwa aghaghị ịnagide otu oké nsogbu ahụ ike. Na March 1994, a chọpụtara na m nwere ọrịa obi na-eyi ndụ egwu, ọ dịkwa mkpa ka a waa m ahụ. Ọzọkwa enwere m mmetụta na aka ịhụnanya Jehova na-akwagide m n’oge siri oké ike. Agaghị m echezọ ekpere otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kpere n’akụkụ àkwà m mgbe e si n’ebe a na-elekọta ọnọdụ chọrọ ime ihe ngwa ngwa kpọpụta m, gụnyere Ememe Ncheta m duziri, nke mụ na ndị ọrịa anọ gosiri mmasị n’eziokwu ahụ nọrọ kpọmkwem n’ọnụ ụlọ nke ụlọ ọgwụ ebe ahụ mee.
Jehova Abụwo Onye Inyeaka Anyị
Oge na-agafere ngwa ngwa, ike na-agwụwanyekwa anụ ahụ anyị, ma ọmụmụ ihe na ije ozi na-eme ka mmụọ anyị na-adịghachi ọhụrụ. (2 Ndị Kọrint 4:16) O ruola afọ 39 ugbu a kemgbe m kwuru, sị, “Lee m; ziga m.” Ọ bụwo ndụ na-eju afọ, nke obi ụtọ, na nke na-akwụghachi ụgwọ. Ee, mgbe ụfọdụ ana m enwe mmetụta nke ịbụ “onye e wedara n’ala na ogbenye,” ma m ka pụrụ iji obi ike gwa Jehova, sị: “Onye inyeaka m na Onye na-eme ka m gbapụ ka Ị bụ.” (Abụ Ọma 40:17) N’ezie, ọ bụworo m Chineke nke ezi ịhụnanya.
[Foto dị na peeji nke 25]
Mụ na Martha na 1956
[Foto dị na peeji nke 26]
Ọdụ ụgbọ mmiri dị na Kaválla
[Foto dị na peeji nke 26]
Mụ na Martha na 1997