Nraranye nke Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower—Ememe E Meere Jehova
ERI oge ochie, ememe ndị na-enye ọṅụ abụwo akụkụ nke ezi ofufe. Ụfọdụ n’ime ememe ndị e mere n’Israel oge ochie were ọtụtụ ụbọchị, ọtụtụ puku ndị na-efe Jehova gakwara ha. Nraranye nke ụlọ nsọ ahụ Solomọn wuru were ụbọchị asaa, Ememe Ụlọ Ntu ahụ were otu izu sochikwara ya. Nke a nyere ụmụ Israel ohere ịtụgharị uche n’ụzọ dị ebube Jehova siworo mesoo ha ihe. Ha laghachiri n’ebe obibi ha “na-aṅụrị ọṅụ, obi dịkwa ha mma, n’ihi ezi ihe nile nke Jehova mere.”—1 Ndị Eze 8:66.
Ihe mere n’Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower dị na Patterson, New York, U.S.A., na May 17-22, 1999, chetaara ndị bịaranụ ememe ndị ahụ nyere obi ụtọ n’oge ochie. Nke a bụ izu nke ihe omume pụrụ iche bụ́ nke hiwere isi ná nraranye nke ihe owuwu ụlọ 28 mejupụtara bụ́ ndị e wuru iji kwalite nkụzi Bible zuru ụwa ọnụ. E mere ndokwa ka mmadụ 5,400 nile na-arụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn, Wallkill, nakwa Patterson gazuo ihe owuwu ndị ahụ dị na Patterson n’izu ahụ kwesịrị ncheta. Ndị so ná ndị bịaranụ bụ mmadụ 500 sobu na-arụ ọrụ n’ebe ahụ bụ́ ndị kerewooro òkè n’ọrụ ahụ n’oge a na-ewu ebe agụmakwụkwọ ahụ, ndị nnọchiteanya si n’alaka 23 nke Watch Tower Society, na ndị ọzọ si n’ọgbakọ ndị dị nso—ngụkọta nke mmadụ 8,100 ma ọ dịkarịa ala.
Ihe Ndị E Gosiri n’Oge Ngagharị Enye Ihe Mmụta
E mere ndokwa maka ihe ngosi ndị pụrụ iche, ihe nkiri vidio ndị na-ezi ihe, nakwa ngagharị mmadụ na-emere onwe ya, iji mee ka ndị nleta ahụ matazuo ebe agụmakwụkwọ ahụ. N’ebe bụ́ isi a na-anabata ndị ọbịa, otu ihe owuwu ihe atụ nke ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem n’oge ozi elu ala Jisọs dọọrọ mmasị ndị nleta ozugbo. Ihe ngosi ndị ọzọ mere ka akụkọ mmalite nke Watchtower Bible School of Gilead, mgbakọ ndị mere ihe akụkọ, nzukọ ọgbakọ, otú e si na-emeziwanye ọmụmụ Bible ebe obibi n’oge a—ndị a na-eduzi ọtụtụ nde n’ime ha kwa izu ugbu a—na ọrụ Ngalaba Okwu Ikpe na-arụ iji na-eme ka ụzọ ghere oghe maka ọrụ dị otú ahụ ná nrubeisi nye iwu Jisọs, pụta ìhè.—Matiu 28:19, 20.
N’ụlọ mgbakọ dị ya nnọọ nso, bụ́ nke na-abata mmadụ 1,700 nke ọma, e gosiri ndị ahụ bịara nleta n’oge ememe nraranye ahụ ihe nkiri vidio were minit 33 nke isiokwu ya bụ “Ọ Bụghị Site n’Ike—Ọ Bụ Site ná Mmụọ M!” Ihe nkiri vidio a gosiri otú Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower si malite. Ajụjụ ọnụ ndị a gbara kpughere ihe omume ndị na-egosi n’ụzọ doro anya nduzi Jehova n’ihe ndị e mere nakwa ngọzi ya ná mgbalị ndị e tinyere iji weta ọrụ a were afọ 15 ná njedebe n’ụzọ gara nke ọma. Ọtụtụ puku mmadụ keere òkè n’ọrụ ihe owuwu ahụ kpọmkwem. N’otu oge na 1994, e nwere ndị ọrụ dị 526 n’ebe ahụ a na-ewu ihe owuwu, gụnyere ndị ọrụ afọ ofufo oge nile dị 350, ndị ọrụ nwa oge dị 113, na mmadụ 63 bụ́ ndị na-abịa ma na-ala kwa ụbọchị iji nye aka. Ọtụtụ ndị ọzọ ji onyinye kwado ọrụ ahụ. Ha nile ghọtara na nke a agaraghị ekwe omume ma ọlị ma e wezụga mmụọ Jehova.—Zekaraịa 4:6.
Ndị mere ngagharị ahụ pụrụ ịhụ na e lekwasịrị anya n’ịkwalite izi ihe Chineke wee na-arụ ọrụ a na-arụ n’ebe agụmakwụkwọ ahụ. Ihe ngosi dị n’ebe e si abanye n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead bụ́ nke dị n’okpukpu nke mbụ nke ihe owuwu ụlọ akwụkwọ ahụ mere ka ihe nketa ime mmụọ bara ụba na akụkọ nke ụlọ akwụkwọ ahụ pụta ìhè. Kemgbe e nwere klas mbụ ya na 1943 n’ebe bụbu ogige ụlọ akwụkwọ ahụ na South Lansing, New York, Ụlọ Akwụkwọ Gilead azụọla ihe karịrị ụmụ akwụkwọ 7,000 maka ozi ala ọzọ. Ihe ngosi ndị dị n’okpukpu nke abụọ nke ihe owuwu ụlọ akwụkwọ ahụ gosiri ihe ndị a na-ahụ n’Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Òtù Kọmitii Alaka na Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Nlekọta Na-ejegharị Ejegharị, bụ́ ndị na-anọcha ebe ahụ amụ ihe. Kemgbe ọ malitere na November nke 1995, ụlọ akwụkwọ alaka ahụ enyela ndị òtù Kọmitii Alaka dị 360 bụ́ ndị si n’ala 106 ntụziaka bụ́ ịgba.
Ka ndị nleta ahụ nọ na-eme ngagharị, ha ghọtara ozugbo na n’ọtụtụ ebe, ha hụrụ ihe karịrị ihe ngosi e sere ese. Ha banyere kpọmkwem ná ngalaba dị iche iche, leta ọfịs na ebe ndị ọzọ a na-arụ ọrụ, ma hụ ọrụ a na-arụ nke ọma. Otu ebe dị ịrịba ama ha letara bụ ụlọ Ngalaba Na-ahụ Maka Tepụ na Vidio. Lee ngwá ọrụ magburu onwe ha e ji eme ihe n’ebe ahụ iji kwalite mmụta Bible! E ji ọtụtụ ihe ngosi ndị na-enye ihe ọmụma na ihe nkiri vidio ndị dị mkpirikpi nyere ndị ahụ bịaranụ aka ịghọta otú e si etinye olu n’ime tepụ na otú e si akwadebe ihe nkiri vidio. Ha mụtara ihe banyere oké nnyocha a na-eme n’ịkwadebe ngwongwo na uwe ndị e ji eme ihe nkiri. Ha hụrụ otú e si akwadebe ebe a na-anọ eme ihe nkiri, n’ọnụ ego dị ala ma na-ahụ na e jizuru nnọọ ihe nile dị mkpa mee ha. Ha hụrụ otú e si eji egwú eme ka ndị mmadụ nwee mmetụta na ha nọ n’ezie n’ebe ahụ ihe ahụ ha na-ekiri mere. Kemgbe 1990, Society emepụtala ihe nkiri vidio iri n’asụsụ 41, na-eme ka isiokwu dị iche iche nke Bible pụta ìhè, tinyere ihe nkiri vidio ndị e mepụtara maka ndị na-asụ Ụdị Asụsụ Ogbi nke America.
Ọtụtụ n’ime ndị mere ngagharị ahụ gara n’Ebe A Na-asa Foto, Ngalaba Ihe Osise, Ngalaba Ihe Ọmụma, bụ́ nke na-enye ọzụzụ na enyemaka banyere kọmputa, Ngalaba Ije Ozi, bụ́ nke na-elekọta ọrụ nke ọgbakọ 11,242 na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị 572, na Ngalaba Nderịta Akwụkwọ, bụ́ ebe a na-elebara ajụjụ dị ihe dị ka 14,000 anya kwa afọ. Ha nwere obi ụtọ ịhụ nnyocha a na-eme n’akwụkwọ ozi ndị a na-ezipụ na ezi nchegbu a na-egosipụta n’ebe ndị ajụjụ ha na-enye ihe àmà na ha na-agbalị ịnagide nsogbu ndị siri ike nọ.
Ọtụtụ ìgwè nke ndị ahụ na-eme ngagharị, nọgidere na-enubanye ná Ngalaba Ije Ozi Maka Nsụgharị. O juru ha anya ịmata na n’ime afọ ise gara aga, a tụkwasịrị asụsụ 102 ọzọ n’ọnụ ọgụgụ nke asụsụ ndị Society na-ebipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Bible na ha. Gburugburu ụwa, ihe dị ka pasent 80 nke Ndịàmà Jehova na-agụ akwụkwọ Society n’asụsụ ndị na-abụghị Bekee. Iji gboo mkpa ha, e nwere ihe karịrị ndị ọrụ afọ ofufo 1,700 na-arụ ọrụ nsụgharị na 100 mba. E nwere ihe ngosi nke Ụlọ Nche n’asụsụ dịgasị iche nke kọntinent ndị dị n’America, nke mba ndị dị na Europe, Esia, nakwa n’Africa. Ndị nleta pụrụ ịhụ Bible New World Translation n’asụsụ 31 ahụ e bipụtarala ya. Ha matara na mbipụta dị iche iche nke Watch Tower dị ugbu a n’asụsụ 332 nakwa na e bipụtala broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? n’asụsụ 219 n’ime ha.
E gosiri ndị letara Ngalaba Okwu Ikpe ọrụ dị iche iche bụ́ ndị na-achọ ka e lebara ha anya n’ụzọ iwu gburugburu ụwa. N’otu ihe nkiri vidio, ha hụrụ nnọkọ ikpe mere eme nke ọkàiwu bụ́ Onyeàmà nọ na ya na-arụ ụka n’okwu metụtara mmịnye ọbara. Ha matakwara ihe a na-eme iji mee ka ụzọ ghere oghe maka nkwusa ozi ọma ihu ọha. (Ndị Filipaị 1:7) A dọọrọ uche gaa ná mkpebi ụlọikpe etiti mere na March nke afọ a, na-enye obodo Oradell, New Jersey, U.S.A., ntụziaka ịgbanwe iwu ya nke chọrọ ka Ndịàmà Jehova bụ́ ndị chọrọ ikere òkè n’ozi ihu ọha ha site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’ógbè ahụ na-enweta akwụkwọ ikike ma na-eyi baajị.
Nke a abụtụghị nanị ihe ndị ọbịa ahụ hụrụ. Ha nyochara ihe ngosi ihe owuwu dị n’Ebe A Na-awụ Ihe Ọwụwụ, letakwa Ebe A Na-etinye Ọgwụ ná Mmiri E Jirila Mee Ihe, Ụlọ Injin Na-enye Ọkụ, Ebe A Na-ahụ Maka Mmiri Ọṅụṅụ, na ọtụtụ ụlọ ọrụ nlekọta, tinyere ebe ndị ọzọ. Ọ bụ ohere pụrụ iche.
Usoro Ihe Omume Nraranye Emesie Nkụzi Chineke Ike
Na Wednesday, May 19, malite n’elekere anya 4:00 nke ehihie, ka e mere nke bụ́ usoro ihe omume nraranye ahụ. Ndị ọrụ nke isi ụlọ ọrụ, ndị ọbịa Society, na mmadụ 372 gbakọtara n’alaka Canada, bụ́ ebe e ji ígwè eletronic mee ka ndị nọ ebe ahụ na-ekiri ihe a na-eme, so n’ìgwè mmadụ 6,929 ahụ nwere ọṅụ.
N’ezie, obi dị ndị ahụ na-ege ntị ụtọ ịnụ okwu nnabata na-enye obi utọ nke Milton G. Henschel, bụ́ onyeisi oche nke Watch Tower Society. Theodore Jaracz, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, bụrụkwa onyeisi oche nke ihe omume ahụ, kpọpụtaziri William Malenfant. N’ikwu okwu n’isiokwu bụ́ “Ihe Ndị Pụtara Ìhè n’Ọrụ Ihe Owuwu Ahụ,” ọ gbara ụmụnna nwoke atọ ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị keere òkè dị ịrịba ama ná nchepụta, ise ụkpụrụ, na owuwu nke Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower ahụ. N’oge a na-agba ajụjụ ọnụ ahụ, e kwuru na n’afọ ndị ahụ a rụrụ ọrụ ihe owuwu ahụ kpọmkwem, ndị ọrụ nwa oge karịrị 8,700 bịara ná mmefu nke onwe ha ịrụ ọrụ n’ihe owuwu ahụ. Lee akaebe nke a na-agbara ịdị n’otu na mmesapụ aka bụ́ nke izi ihe Chineke mere ka o kwe omume!
Ihe sochiri nke ahụ bụ usoro isiokwu nke isiokwu ya bụ “Nkụzi Chineke n’Ọ̀tụ̀tụ̀ Zuru Ụwa Ọnụ.” Ọ bụ mmadụ anọ so n’Òtù Na-achị Isi kwuru ya. John E. Barr mesiri ya ike na nkụzi Chineke na-adabere n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, nke na-agba ndị Kraịst ume ‘ịmị mkpụrụ n’ezi ọrụ nile ọ bụla, na-abakwa ụba n’ime mmazu nke Chineke.’ (Ndị Kọlọsi 1:10) Daniel Sydlik kwuru otú e si ahazi nkụzi Chineke n’ụzọ ọchịchị Chineke site n’onyeisi nke ọgbakọ ndị Kraịst, bụ́ Jisọs Kraịst, gbadata ruo n’onye ọ bụla so n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ. (1 Ndị Kọrint 12:12-27) Akụkụ abụọ ndị ikpeazụ nke usoro isiokwu ahụ, bụ́ ndị Gerrit Lösch na Carey Barber kwuru, gosiri otú nkụzi Chineke si eme ka ndị ozi ruo eruo ịgakwuru ndị mmadụ n’ebe nile ma kụziere ha ihe ka ha onwe ha kwa wee nwee ike ije ije n’ụzọ nke Chineke.—Aịsaịa 2:1-4; 2 Ndị Kọrint 3:5.
Iji mee ka ndị na-ege ntị mara banyere ụlọ akwụkwọ dị iche iche a na-enwe n’ebe agụmakwụkwọ a, a gbara ndị nkụzi nakwa ndị ọzọ na-ahụ maka ha ajụjụ ọnụ ma soro ha kwurịta okwu. E gosipụtara òkè ụlọ akwụkwọ nke ọ bụla na-ekere n’ime ka usoro ihe omume nkụzi Chineke gaa n’ihu n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ. A kọwapụtara na Ụlọ Akwụkwọ Gilead na-elekwasị anya n’ihe ọmụmụ nke akwụkwọ nke ọ bụla dị na Bible, n’akụkọ ihe mere eme nke oge a nke ndị Jehova, nakwa ná nkwadebe maka ozi ala ọzọ. Ụlọ akwụkwọ alaka bụ ihe ọmụmụ sara mbara n’ụzọ magburu onwe ya banyere ọtụtụ ọrụ dị iche iche ndị so na Kọmitii Alaka na-arụ. Ọ bụghị nanị iji gboo mkpa nke ụmụnna na-ejegharị ejegharị ka e ji dokwaa Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Nlekọta Na-ejegharị Ejegharị kamakwa iji kwadebe ha inye ụdị enyemaka ime mmụọ nke ga-abara ọgbakọ uru karịsịa.
Iji weta ọmarịcha usoro ihe omume ahụ ná njedebe, Lloyd Barry nke so n’Òtù Na-achị Isi kwuru okwu nraranye ahụ n’isiokwu bụ́ “Iso Onye Okike Ukwu Anyị Na-ewu Ihe.” Ọ kọwapụtara na Onye Okike, bụ́ Jehova, nwere mmasị n’ihe nile o kere eke ma na-akpọ anyị òkù iso ya ṅụrịa ọṅụ. (Aịsaịa 65:18) Ebe ọ bụ na “Onye rụrụ ihe nile bụ Chineke,” otuto kasị ukwuu maka ihe owuwu a nile na-agara Jehova Chineke. (Ndị Hibru 3:4) Mgbe o kwupụtasịrị echiche ndị dị otú ahụ, ọkà okwu ahụ kpere ekpere sitere n’ala ala obi, na-arara Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower ahụ nye Jehova, bụ́ Onye Okike Ukwu anyị.a
Obi abụọ adịghị ya na ndị bịaranụ agaghị echefu ngwa ngwa ememe ahụ were otu izu dum. Gịnị ma i mee ndokwa ileta Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower ahụ? Anyị ji n’aka na ileta na ịgagharị na ya ga-abụrụ gị ihe agbamume ná mgbalị ndị ị na-eme iji mụtakwuo banyere Onye Okike anyị na-ahụ n’anya na iji bie ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume ya.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Nwanna Barry jesịrị ozi elu ala ya n’ikwesị ntụkwasị obi na July 2, 1999. Lee Ụlọ Nche, October 1, 1999, peji nke 16.
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Ụlọ mgbakọ nke jupụtara ná mmadụ nakwa ndị na-ege ntị ọ na-abaghị nọ n’ụlọ iri ihe
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Ngagharị ahụ bụ akụkụ na-enye ọṅụ karịsịa