Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 12/15 p. 25
  • Ha Nwere Nkwuwa Okwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Nwere Nkwuwa Okwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Nkwuwa Okwu Na-ekwusa Ozi Ọma Ka Jizọs
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • ‘Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ị̀ Na-eji Nkwuwa Okwu Eme Nkwusa?
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Nọgide Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu
    Ozi Alaeze Anyi—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 12/15 p. 25

Ha Nwere Nkwuwa Okwu

Ọ NAGHỊ adị mfe mgbe nile inwe nkwuwa okwu iji mee nkwusa. N’ezie, Pọl onyeozi sịrị na n’otu oge, o mere otú ahụ “n’oké mgba.” (1 Ndị Tesalọnaịka 2:2) ‘Ịgba mgba’ iji mee nkwusa ò kwesịrị mgbalị e mere? E jighị n’aka na a ga-enwe ahụmahụ ndị bụ́ ịgba, ma ndị Chineke na-enwekarị ọṅụ na ha nwere nkwuwa okwu. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

Otu nwata nwanyị dị afọ asatọ aha ya bụ́ Tara gere ntị nke ọma ka onye nkụzi ya na-agwa ndị klas ya na n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, ndị nọ n’ogige ịta ahụhụ ndị Juu aghaghị iyi uwe nwere akara Star of David na-acha odo odo ka e wee mata ha. Tara chere echiche ma ò kwesịrị ikwupụ okwu. “Eghewere m anya m oghe kpee ekpere,” ka ọ na-echeta. E mesịa, o weliri aka ya ma kwuo na Ndịàmà Jehova so nọrọ n’ogige ịta ahụhụ ahụ, ha aghaghịkwa iyi uwe nwere akara purple triangle. Nke a masịrị onye nkụzi ahụ, o wee kelee ya. Okwu Tara meghere ụzọ maka ya na onye nkụzi ahụ inwekwu nkwurịta okwu, bụ́ onye mesịrị ọbụna gosi ndị klas ya nile vidio ahụ bụ́ Jehovah’s Witnesses Stand Firm Against Nazi Assault.

Na Guinea, n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, otu onye nkwusa a na-emebeghị baptism nke aha ya bụ́ Irène chọrọ inwe ọganihu n’ozi ya. Onye ozi ala ọzọ na-amụrụ ya Bible gbara ya ume ịgbalị inyefe ụmụ akwụkwọ ibe ya magazin Ụlọ Nche na Teta! n’ụlọ akwụkwọ. Obi akaghị Irène n’ihi na ụmụ klas ya adịghị aṅa ntị. Otú ọ dị, n’ịbụ onye agbamume onye ozi ala ọzọ ahụ kwaliri, Irène kpebiri ibu ụzọ gakwuru nwa akwụkwọ nke yiri ka ọ bụ ya kasị eguzogide ya. N’ụzọ juru Irène anya, nwa agbọghọ ahụ gere ntị ma jiri oké mmasị nara magazin ndị ahụ. Ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ mekwara otú ahụ. Irène nyefere magazin ka ọtụtụ n’ọnwa ahụ karịa ka o merela ma a gụkọta ọnwa ise ndị bu ya ụzọ.

Na Trinidad, obi akaghị otu okenye ijekwuru onyeisi nke otu ụlọ akwụkwọ iji gosi ya uru Teta! bara n’ihe banyere mmụta. Ka o sina dị, o kwuwara okwu. Ọ na-ekwu, sị: “Ekpere m ekpere ka m banyere n’ogige ahụ. O juru m anya mgbe onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ nwere obi ụtọ pụrụ iche.” Ọ naara mbipụta Teta! ahụ bụ́ “Olileanya Dị Aṅaa Dịịrị Ndị Ntorobịa nke Taa?” ọbụnakwa kweta iji ya na-akụzi ihe na klas. Kemgbe ahụ, ọ narawo magazin 40 ndị metụtara isiokwu dị iche iche.

Dị ka onye ntorobịa, ọ na-esikarịrị Vaughn ike ime nkwusa. “Ụjọ ga-abịa m, ọbọ aka m ana-agba ọsụsọ, m ga na-ekwukwa okwu ọsọ ọsọ—apụghị m iji nwayọọ.” Ka o sina dị, ọ ghọrọ onye ozi oge nile. Ma, ọ dịghịrị ya mfe mgbe nile ikwupụ okwu. Otu oge, mgbe ụbọchị na-akụda mmụọ nke ịchọ ọrụ gasịrị, ọ chọrọ ịgbara otu onye àmà n’ụgbọ okporo ígwè, “ma ọ dịghị ihe ọzọ, ka e nweenụ ezi ihe ụfọdụ a rụpụtara n’ụbọchị ọjọọ.” Ma ọdịdị ndị oké ozu nke ndị ọchụ ntá ego nọ n’ụgbọ okporo ígwè okpuru ala ahụ menyere ya ụjọ. N’ikpeazụ, o nwetara nkwuwa okwu ịgwa otu agadi nwoke nọdewere ya okwu. Nke ahụ rụpụtara nkwurịta okwu dị ogologo. “I nwere nnọọ ezigbo ajụjụ ndị karịrị onye na-eto eto inwe,” ka onye ọchụ ntá ego ahụ sịrị, na-ajụ sị, “Ị̀ bụ ọkà mmụta okpukpe?” Vaughn zaghachiri, sị, “Ee e, abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova.” “Ohoo,” ka nwoke ahụ kwuru n’imụmụ ọnụ ọchị. “Ugbu a ka o doro m anya.”

Ndịàmà nile a—na imerime ndị ọzọ—nwere obi ụtọ na ha nwere nkwuwa okwu ime nkwusa. Ị̀ ga-eme otu ihe ahụ?

[Foto dị na peeji nke 25]

Tara

[Foto dị na peeji nke 25]

Vaughn

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya