Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w00 10/1 p. 3
  • Ụwa—Ọ̀ Bụ Nanị Ebe Nnwale?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụwa—Ọ̀ Bụ Nanị Ebe Nnwale?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ka Uche Gị Meekwa n’Ụwa, Dị Ka Ọ Na-eme n’Eluigwe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Obi Ụtọ Ebighị Ebi—Ọ̀ Bụ n’Eluigwe Ka Ọ̀ Bụ n’Ụwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ụzọ Isi Laghachi Paradaịs
    Teta!—1997
  • Ndụ Ọhụrụ Maka Ndị Nna Nna Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
w00 10/1 p. 3

Ụwa—Ọ̀ Bụ Nanị Ebe Nnwale?

LEE ahụ efe ọ bụ! Ọ gafere. Nwa akwụkwọ nke gabigaworo izu abụọ na-agwụ ike nke ule mesịrị nweta akara ugo mmụta na-enye obi ụtọ. Ọ pụziri ịga rụwa ọrụ ọ nọworo na-achọ ịrụ.

Ọtụtụ ndị na-ele ndụ elu ala anya n’ụzọ yiri nke ahụ. Ha na-eche banyere ya dị ka nnwale bu ụzọ nke mmadụ nile na-aghaghị ịgabiga. Ndị “gafere” na-aga n’ihe ka mma n’ụdị ụfọdụ nke Ndụ Mgbe A Nwụsịrị. N’ezie, ọ ga-abụ ihe dị mwute ma ọ bụrụ na ndụ a dị ugbu a—ịdị adị nkịtị nye ọtụtụ ndị—bụ ihe kasị mma ndị mmadụ pụrụ ịtụ anya ya. N’agbanyeghị na nwoke ahụ a kpọrọ aha na Bible bụ́ Job nwere ahụ ike ma nwee ihe ịga nke ọma n’ihe ka ukwuu ná ndụ ya, o kwuru, sị: “Mmadụ nke nwanyị mụrụ, ụbọchị ndụ ya dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa ya n’ahụhụ.”—Job 14:1.

Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia gosipụtara echiche nke ọtụtụ ndị site n’ikwu, sị: “Ebube nke eluigwe bụ akara aka Chineke zubeere mmadụ. . . . A pụrụ ịhụ na obi ụtọ mmadụ dabeere na ya inweta ọṅụ zuru okè nke eluigwe.” Otu nnyocha e mere na Church of Christ na nso nso a na United States zọọrọ na pasent 87 nke ndị kwuru okwu kweere na o yikarịrị ka ha ga-aga eluigwe mgbe ha nwụsịrị.

Ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Kraịst nwekwara olileanya isi n’ụwa a pụọ gaa ebe ka mma mgbe ha nwụsịrị. Dị ka ihe atụ, ndị Alakụba na-enwe olileanya ịga paradaịs eluigwe. Ndị òtù nke ịrọ òtù bụ́ Ala Dị Ọcha nke okpukpe Buddha dị na China na Japan kweere na site n’ikwughachi “Amitabha,” bụ́ aha Buddha nke Ìhè A Na-akparaghị Ókè, n’akwụsịghị akwụsị, na a ga-amụ ha ọzọ n’Ala Dị Ọcha, ma ọ bụ Paradaịs Ebe Ọdịda Anyanwụ, bụ́ ebe ha ga-ebi n’obi ụtọ kasịnụ.

N’ụzọ na-akpali mmasị, Bible, bụ́ akwụkwọ nsọ a kasị asụgharị ma na-ekesa n’ụwa, egosipụtaghị ụwa dị ka ebe a pụrụ isi na ya gbapụ, dị ka ebe e si aga ebe ọzọ. Dị ka ihe atụ, ọ na-ekwu, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Ọ bụkwa n’ime Bible ka a na-achọta okwu Jisọs a ma ama, bụ́: “Ngọzi na-adịrị ndị dị umeala n’obi: n’ihi na ha ga-eketa ụwa.”—Matiu 5:5, King James Version.

Echiche zuru ebe nile bụ́ na obibi anyị bi n’ụwa bụ nke na-adịru nwa oge na-egosi na ọnwụ bụ ụzọ na-eduga ná ndụ nke ọṅụ zuru okè mgbe a nwụsịrị. Ọ bụrụ otú ahụ, mgbe ahụzi ọnwụ bụ ngọzi. Ma ndị mmadụ n’ozuzu ha hà na-ele ọnwụ anya n’ụzọ dị otú ahụ, ka hà na-agbalị ime ka ndụ ha dịkwuo ogologo? Ahụmahụ na-egosi na mgbe ndị mmadụ nwere ahụ ike na nchebe dịtụ mma, ha adịghị achọ ịnwụ.

Ka o sina dị, ebe ọ bụ na ihe ọjọọ na nhụjuanya jupụtara ná ndụ a na-adị n’ụwa, ọtụtụ ndị ka na-ele eluigwe anya dị ka nanị ebe a pụrụ ịchọta ezi udo na obi ụtọ. Eluigwe ọ̀ bụ nnọọ ebe a na-enwe udo nke ọṅụ zuru okè, ebe ihe ọjọọ na aghara na-adịtụdịghị? Ndụ Mgbe A Nwụsịrị ọ̀ ga-abụ nanị n’eluigwe? Azịza Bible ga-enye pụrụ iju gị anya. Biko gụrụ gawa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya