“Otu n’Ime Ụbọchị Ndị Kasị Mma ná Ndụ M”
BEYONDBLUE, bụ́ òtù gọọmenti Australia na-akwado, na-ekwu, sị: “Ịda mbà n’obi bụ nsogbu uche ndị na-eto eto na-akọkarị na ha nwere, o nwekwara ike ịbụ ya bụ nke a kasị kwesị ilebara anya ngwa ngwa.” Nnyocha ndị e mere na-ekpughe na ihe dị ka otu narị puku ndị Australia na-eto eto na-enwe nsogbu nke ịda mbà n’obi kwa afọ.
Ịda mbà n’obi na-emetụtakwa Ndị Kraịst na-eto eto. Otú ọ dị, okwukwe ha nwere n’ebe Jehova nọ enyerela ọtụtụ n’ime ha aka ịnagide echiche ndị na-ezighị ezi, na inwe ihe ịga nke ọma n’oge ntorobịa ha. Site n’ime otú ahụ, ha na-adọta mmasị ndị ọzọ. N’ụzọ dị aṅaa?
Tụlee ahụmahụ Claire bụ́ onye dị afọ 18. Ya na mama ya na-aga nzukọ Ndịàmà Jehova na Melbourne. Mgbe nna Claire gbahapụrụ ezinụlọ ahụ, Claire dara mbà n’obi. Ma ọ nọgidere na-enwe okwukwe siri ike n’ebe Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova, nọ. Otu ụbọchị, dọkịta ezinụlọ ha, bụ́ Lydia, gara n’ụlọ Claire ịhụ nne Claire, bụ́ onye ahụ́ na-adịghị. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ gwara Claire ka ya nyere ya aka kwọga ya ahịa. Mgbe ha na-aga, ọ jụrụ Claire ma ò nwere enyi nwoke. Claire kọwara na ebe ọ bụ na ya bụ Onyeàmà Jehova, ya na ụmụ nwoke adịghị akpa n’enweghị ezi ihe kpatara ya. Nke a tụrụ dọkịta ahụ n’anya. Claire kọwaziri otú Bible si nyere ya aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha ná ndụ. N’ikpeazụ, Claire kwere nkwa iwetara dọkịta ahụ otu akwụkwọ e ji amụ Bible bụ́ nke nyewooro ya aka nke ukwuu. Aha akwụkwọ ahụ bụ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè.
Ụbọchị atọ ka o nwetasịrị akwụkwọ ahụ, Lydia kpọrọ mama Claire na fon ịgwa ya obi ụtọ o nwere ịgụ akwụkwọ ahụ. Ọ rịọziri ka e zitekwuoro ya mkpụrụ isii nke akwụkwọ ahụ maka ndị ọrụ ibe ya. Mgbe Claire wegaara ya akwụkwọ ndị ahụ, dọkịta ahụ kọwara otú okwukwe Claire si masị ya. Claire jụrụ ya ma ọ̀ ga-achọ ka ya duziwere ya ọmụmụ Bible, dọkịta ahụ kwetara.
Ruo ọnwa ole na ole, Claire nọ na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ mgbe dọkịta ahụ na-anọghị n’ọrụ n’oge ehihie. Lydia jụziri Claire ma ọ̀ ga-achọ ikwu okwu banyere ịda mbà n’obi nke ndị ntorobịa n’otu nzukọ ọmụmụ ihe ha ga-enwe. Ọ bụ ezie na ụjọ tụrụ Claire, o kwetara. Ihe karịrị mmadụ 60 bịara nzukọ ọmụmụ ihe ahụ. Ndị ọkachamara anọ n’ihe metụtara ọrịa uche—ndị tochara eto—kwuru okwu ná nnọkọ ahụ. Oge ruziri ka Claire kwuo okwu nke ya. O mere ka ọ pụta ìhè mkpa ọ dị ndị na-eto eto ịbụ ndị enyi Chineke. Ọ kọwara na Jehova Chineke na-eche nnọọ banyere ndị na-eto eto ma na-enyere ndị nile na-abịakwute ya maka nkwado na nkasi obi aka. Tụkwasị na nke ahụ, o kwuru na ya kwenyesiri ike na n’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ekpochapụ ụdị nile nke ọrịa anụ ahụ́ na nke uche. (Aịsaịa 33:24) Gịnị si n’ezi àmà a pụta?
Claire kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị bịakwutere m mgbe a gbasara ịgwa m na obi dị ha ụtọ ịnụ ka onye na-eto eto na-ekwu banyere Chineke. Enyefere m mkpụrụ 23 nke akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị. Ụmụ agbọghọ atọ bịara nnọkọ ahụ nyere m nọmba telifon ha. Otu n’ime ụmụ agbọghọ ndị a na-amụ Bible ugbu a. Ọ bụ otu n’ime ụbọchị ndị kasị mma ná ndụ m.”