Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w09 6/1 p. 5-7
  • Ihe Mere Baịbụl Ji Baa Uru n’Oge Anyị A

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mere Baịbụl Ji Baa Uru n’Oge Anyị A
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Na-eme Ka Anyị Mara Ihe Ndị Bara Uru Anyị Ga-achụso
  • Otú Baịbụl Si Eme Ka Ndị Mmadụ Gbanwee Ndụ Ha
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Jiri Okpukpe Kpọrọ Ihe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Bible—Ihe Nduzi Dị Irè Maka Mmadụ Oge A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Akwụkwọ Dị Irè Maka Ibi Ndụ n’Oge A
    Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile
  • Ntụziaka Bụ́ Ịgba Maka Ịzụ Ụmụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
w09 6/1 p. 5-7

Ihe Mere Baịbụl Ji Baa Uru n’Oge Anyị A

“Akwụkwọ nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke ma baa uru . . . iji ya duzie ndụ ndị mmadụ.”—2 TIMOTI 3:16, The Jerusalem Bible.

KEMGBE ọtụtụ narị afọ, Baịbụl enyerela ndị si n’obodo dị iche iche aka ịgbanwe ndụ ha ma mee ka ọ ka mma. Amaokwu Baịbụl ahụ e depụtara n’elu gosiri ihe mere Baịbụl ji enwe ike ime nke a. Ọ bụ n’ihi na amamihe dị na ya si n’aka Chineke. Ọ bụ ezie na e ji ụmụ mmadụ dee Baịbụl, ihe dị n’ime ya bụ uche Chineke. Baịbụl kwuru, sị: “Ndị mmadụ kwuru ihe Chineke mere ka ha kwuo mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.”—2 Pita 1:21.

Ọ dịkarịa ala, e nwere ụzọ ihe abụọ mere Baịbụl ji bụrụ ezi ihe nduzi. Nke mbụ, ọ na-eme ka anyị mata nnọọ ụzọ ka mma isi bie ndụ. Nke abụọ, o nwere ikike ịkpali ndị mmadụ ịgbanwe àgwà ha iji biwe ụdị ndụ ahụ. Ka anyị tụlee ụzọ ihe abụọ a Baịbụl na-eme.

Ọ Na-eme Ka Anyị Mara Ihe Ndị Bara Uru Anyị Ga-achụso

N’ime Baịbụl, Chineke kwere anyị nkwa a: “M ga-eme ka i nwee nghọta, zikwa gị ụzọ ị ga-eso. M ga-enye gị ndụmọdụ, anya m ga-adị n’ebe ị nọ.” (Abụ Ọma 32:8) Ị ga-ahụ n’amaokwu a na ọ bụghị naanị ndụmọdụ ka Chineke na-enye anyị, kama, ọ na-emekwa ka anyị nwee nghọta, nke bụ́ inwe ike ileru ihe anya ma ghọta ya nke ọma. Inwe ike ịghọta ihe ndị dị mkpa anyị ga-eji ndụ anyị achụso ga-eme ka anyị ghara iji ndụ anyị na-achụ ihe ndị na-abaghị uru.

Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-eji ndụ ha niile achụso ihe ga-eme ka ha ghọọ ndị a ma ama ma baa ọgaranya. Akwụkwọ ndị mmadụ ji enyere onwe ha aka nwere ọtụtụ ndụmọdụ banyere otú mmadụ nwere ike isi ka ndị ọzọ mma ma ghọọ onye a ma ama ma ọ bụ baa ọgaranya. Ma, Baịbụl na-agwa anyị, sị: ‘Ịmarịta aka bụ ịchụso ifufe.’ “Ego agaghịkwa eju onye ọ bụla nke hụrụ akụ̀ n’anya afọ.” (Ekliziastis 4:4; 5:10) Ndụmọdụ a ọ̀ ga-abara anyị uru taa?

Iji hụ otú ndụmọdụ Baịbụl si baa uru, ka anyị tụlee ihe mere Akinori, bụ́ onye bi na Japan. N’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ndị ha na Akinori na-ama aka n’ụlọ akwụkwọ, o mechara nweta ihe ọ chọrọ nke bụ́ ịgụcha akwụkwọ na mahadum kasị ewu ewu n’obodo ya na inweta ọrụ n’ụlọ ọrụ a ma ama. O yiri ka ihe niile ọ̀ dịrịla ya mma. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ịga nke ọma ya emeghị ka o nweta obi ụtọ ahụ ọ tụrụ anya ya. Kama nke ahụ, nchekasị na oké ike ọgwụgwụ mere ka ọ daa ọrịa. Ndị enyi ya n’ebe ọrụ enyereghị ya aka. Ebe ọ dara mbà n’obi, ọ malitere ịṅụbiga mmanya ókè ma cheedị echiche igbu onwe ya. Ndịàmà Jehova maliteziri ịmụrụ ya Baịbụl. Ihe ndị ọ mụtara mere ka ọ gbanwee echiche ya banyere ihe ndị o chere dị mkpa ná ndụ. N’oge na-adịghị anya, ọrịa ndị nchekasị kpataara ya malitere ịla. Kama okomoko na oké ọchịchọ ịchị ndụ Akinori, ihe a ilu Baịbụl kwuru mezuru ná ndụ ya: “Obi dị jụụ na-enye anụ ahụ́ ndụ.”—Ilu 14:30, The Holy Bible—New International Version.

Olee ihe i chere kasị mkpa mmadụ kwesịrị ịchụso ná ndụ? Olee ihe ọ ga-abụ i nweta gị enwee ezi obi ụtọ? Ọ̀ bụ alụmdi na nwunye na-agazi agazi? Ka ọ̀ bụ ịtọrọ ụmụ gị ezi ntọala ná ndụ? Inwe ọtụtụ ndị enyi? Ibi ndụ obi ụtọ? Ịchụso ihe ndị a dịcha mma. N’ezie, Baịbụl gbara anyị ume ka anyị chụsoo ihe ndị a, ma ọ bụghị ka ha bụrụ isi ihe anyị ga-achụso ná ndụ. Baịbụl gwara anyị isi ihe ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ ná ndụ, sị: “Tụọ egwu ezi Chineke, debekwa ihe o nyere n’iwu. N’ihi na ọ bụ ya bụ ọrụ dum dịịrị mmadụ.” (Ekliziastis 12:13) Ọ bụrụ na anyị eleghara ọrụ a dịịrị anyị anya, ndụ anyị agaghị enwe isi, ahụ́ agaghị eru anyị ala, anyị agaghịkwa enwe obi ụtọ. Ma, Baịbụl mesiri anyị obi ike, sị: “Obi ụtọ na-adịkwara onye tụkwasịrị Jehova obi.”—Ilu 16:20.

Otú Baịbụl Si Eme Ka Ndị Mmadụ Gbanwee Ndụ Ha

Pọl onyeozi dere, sị: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.” Dị ka mma agha ihu abụọ dị nkọ, o nwere ike iru n’ala ala obi mmadụ ma chọpụta ihe onye ahụ na-eche na ihe o bu n’obi. (Ndị Hibru 4:12) Baịbụl nwere ikike ịgbanwe otú ndị mmadụ si ebi ndụ n’ihi na ọ na-enyere ha aka ịhụ onwe ha otú ha dị kama ịhụ onwe ha otú o yiri ka hà dị. N’ihi ya, ndị nwere obi eziokwu nwere ike ịhụ na ọ dị mkpa ka ha gbanwee ihe ụfọdụ ná ndụ ha. Dị ka ihe atụ, Pọl kwuru banyere ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst dị na Kọrịnt oge ochie bụ́ ndị bụ́bu ndị ohi, ndị aṅụrụma, ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, na ndị na-eme ụdị ihe ọjọọ ndị ọzọ, sị: “Nke ahụ bụkwa ihe ụfọdụ n’ime unu bụbu. Ma a sachawo unu . . . site ná mmụọ nke Chineke anyị.” (1 Ndị Kọrịnt 6:9-11) Mmụọ nsọ Jehova ka na-akpa nnọọ ike otú ahụ taa, o nwekwara ike inyere ndị mmadụ aka ịgbanwe ndụ ha.

Mario, bụ́ onye bi na Europe, bụ nwoke na-eme ihe ike nke na-ese igbo, na-erekwa ya ere. Otu ụbọchị, mgbe otu onye uwe ojii bukọọrọ ọgwụ ọjọọ ọ na-aṅụ, o were iwe ọkụ nke na ọ bara onye uwe ojii ahụ ọgụ ma bibie ụgbọala ya. E wezụga nke ahụ, Mario enwekwaghị ọrụ, o jikwa ọtụtụ ndị ụgwọ. Mgbe ọ chọpụtara na ya agaghị emerili nsogbu ya n’onwe ya, o kwere ka a mụwara ya Baịbụl. Ka Mario na-aghọtakwu ihe ọ na-amụ na Baịbụl, ọ gbanwere otú o si eji ejiji, kwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ na ire ya ere, kwụsịkwa ime ihe ike. Nke a juru ọtụtụ ndị maara otú o sibu akpa àgwà anya. Ha na-akwụsị ya n’ụzọ, na-ajụ ya, sị, “Mario, ọ̀ bụ gị bụ onye a?”

Olee ihe na-akpali ndị dị ka Akinori na Mario ịgbanwe ndụ ha ma nweta ezi obi ụtọ ná ndụ? O doro anya na ọ bụ ihe ọhụrụ ndị ha mụtara na Baịbụl banyere Chineke. Ọ bụ naanị Chineke nwere ike inye anyị ndụmọdụ ga-eme ka anyị nwee ihe ịga nke ọma ná ndụ ugbu a ma nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. Dị ka Nna, Jehova Chineke si na Baịbụl na-agwa anyị, sị: “Nwa m, nụrụ, nabatakwa ihe m na-ekwu. Afọ ndụ gị ga-adịkwa ọtụtụ. . . . Mgbe ị na-eje ije, ijeụkwụ gị agaghị enwe ihe mgbochi; ọ bụrụkwa na ị na-agba ọsọ, ị gaghị asụ ngọngọ. Jisie ịdọ aka ná ntị ike; ahapụla ya. Chekwaa ya, n’ihi na ọ bụ ya bụ ndụ gị.” (Ilu 4:10-13) Ò nwere ndụmọdụ ga-abara anyị uru karịa ịgwa anyị ka anyị na-achọ nduzi nke Onye kere anyị?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

Ndụmọdụ Ndị Bara Uru Taa

Baịbụl nwere ụkpụrụ ndị bara uru nwere ike iduzi anyị n’ihe ọ bụla anyị na-eme ná ndụ taa. Ụfọdụ n’ime ha bụ:

• Anyị na ndị ọzọ ịdị ná mma

“Ya mere, ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.”—Matiu 7:12.

“Onye na-eme onwe ya dị ka onye ka nta n’etiti unu niile bụ onye dị ukwuu.”—Luk 9:48.

“Na-elenụ ọbịa.”—Ndị Rom 12:13.

• Ịkwụsị àgwà ọjọọ

“Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.”—Ilu 13:20.

“Anọla n’etiti ndị na-aṅụ oké mmanya.”—Ilu 23:20.

“Abụla enyi onye ọ bụla nke na-ewekarị iwe.”—Ilu 22:24.

• Inwe ezigbo alụmdi na nwunye

“Ka onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya dị ka ọ hụrụ onwe ya n’anya; n’aka nke ọzọ, onye bụ́ nwunye kwesịrị ịdị na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.”—Ndị Efesọs 5:33.

“Yirinụ obi ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi, dị ka uwe. Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam.”—Ndị Kọlọsi 3:12, 13.

• Inyere ụmụ gị aka

“Zụlite nwata dị ka ụzọ kwesịrị ya si dị; ọbụna mgbe o mere okenye, ọ gaghị ahapụ ya.”—Ilu 22:6.

“Unu ndị bụ́ nna, unu emela ụmụ unu ihe iwe, kama na-azụlitenụ ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.”—Ndị Efesọs 6:4.

• Izere esemokwu

“Azịza dị nro na-eme ka ọnụma laa, ma okwu ọjọọ na-akpasu iwe.”—Ilu 15:1.

“N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.”—Ndị Rom 12:10.

Ya bụrụgodị na ndị mekọrọ ihe ego bụ enyi na enyi, a na-ezerekarị esemokwu ma ọ bụrụ na ha edee ihe ha kpebiri edee. N’ihi ya, ohu Chineke bụ́ Jeremaya dere, sị: “M wee dee ya n’akwụkwọ nkwekọrịta, kaakwa ya akara, m kpọkwara ndị akaebe mgbe m na-atụ ego ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀.”—Jeremaya 32:10.

• Ịmụta ịkpa ezi àgwà

“Ihe ọ bụla nke bụ́ eziokwu, . . . nke na-akpali ịhụnanya, . . . nke a na-ekwu okwu ọma banyere ya, omume ọma ọ bụla dịnụ na ihe ọ bụla dịnụ nke kwesịrị otuto, na-echebaranụ ihe ndị a echiche.”—Ndị Filipaị 4:8.

Baịbụl gwara anyị ka anyị ghara ịnọgide na-eche ihe ọjọọ nakwa ka anyị ghara ịbụ “ndị na-eme mkpesa banyere ọnọdụ ha ná ndụ.” Ọ sịrị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’olileanya ahụ.”—Jud 4, 16; Ndị Rom 12:12.

Ọ bụghị naanị na ịgbaso ụkpụrụ ọma ndị a ga-eme ka anyị nwee udo na obi ụtọ ugbu a, kama ọ ga-emekwa ka anyị mee ihe Chineke chọrọ ma nweta ngọzi ya. Baịbụl kwuru, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Mgbe Akinori bụ onye ọchụnta ego (n’aka ekpe) na ebe ya na nwunye ya na-akụziri ndị ọzọ eziokwu Baịbụl taa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya