Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 8/1 p. 8-9
  • Ha Anaghịzi Atụ Ụjọ Ọgwụgwụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Anaghịzi Atụ Ụjọ Ọgwụgwụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere Ndụ Anyị Ji Nwee Isi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ọrịa AIDS—Ntiwapụ Ọrịa ahụ Na-aga n’Ihu
    Teta!—1998
  • Ihe Onyeàmà Jehova na Onye Agbata Obi Ya Kparịtara—Jizọs Ọ̀ Bụ Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Igwu Wayo—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 8/1 p. 8-9

Ha Anaghịzi Atụ Ụjọ Ọgwụgwụ

N’AGBATA afọ 1976 na afọ 1979, o doro Gary na Karen anya na ọgwụgwụ adịla nso. N’ihi ya, ha si n’obodo mepere emepe kwaga n’ime obodo ma kpebie na ha ga-eji aka ha na-emepụta ihe ọ bụla ha chọrọ. Ha chọrọ ịlanahụ.

Iji mụta nkà ndị ga-adị ha mkpa, ha zụrụ akwụkwọ dị iche iche, gaa ọmụmụ ihe dị iche iche, ma jụta mmadụ niile ha nwere ike ịjụta ihe ihe ụfọdụ. Ha kọrọ ubi ma kụọ osisi iri ise na-amị mkpụrụ. Ha kwakọbara mkpụrụ akụ́kụ́ na ngwá ọrụ. Ha mụtara otú e si akọpụta nri na otú e si echekwa ha. Otu enyi ha kụziiri ha otú e si egbu anụ na otú e si echekwa ya. Karen mụtara otú e si amata ahịhịa ndị dị n’ọhịa, bụ́ ndị e nwere ike iri eri na ihe ọkụkụ ndị dị ka karọt na ji nwannu ka ha nwee ike iri ha ma nri ha gwụ. Gary mụtara otú e si eji ọka emepụta mmanụ ụgbọala, otú e si arụ stovu nkụ, na otú e si arụ obere ụlọ.

Karen kwuru, sị: “N’ihi otú ụwa si jọgbuo onwe ya n’oge ahụ, m chere na ụwa ga-agwụ n’oge na-adịghị anya.” Gary kọrọ, sị: “Dị ka ụmụ okorobịa ndị ọzọ, m nọ na-agba mbọ ịkwụsị ịkpa ókè agbụrụ, Agha Vietnam, na nrụrụ aka. Ma n’oge na-adịghị anya, obi dara m mbà. O yiri m ka ụmụ mmadụ hà na-aga ibibi onwe ha.”

Gary kwuru, sị: “Otu abalị, m nwetatụrụ ohere, n’ihi ya, eweere m Baịbụl gụọ site na Matiu ruo Mkpughe. N’ime abalị anọ ndị sochirinụ, agụrụ m ya ọzọ. N’ụtụtụ abalị nke ise, m gwara Karen, sị: ‘Anyị bi n’oge ikpeazụ. N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eme ka ụwa dị ọcha. Anyị kwesịrị ịchọta ndị ga-alanahụ.’” Gary na Karen malitere isi n’otu okpukpe gaa n’ọzọ, na-achọ ndị chọrọ ịkwadebe maka ọgwụgwụ.

N’oge na-adịghị anya, Onyeàmà Jehova bịara n’ụlọ ha, a malitekwara ịmụrụ ha Baịbụl. Karen chetara oge ahụ ma kwuo, sị: “Obi tọrọ m ezigbo ụtọ n’ihi na a na-akọwara m Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Ihe m nọ na-achọ kemgbe bụ eziokwu banyere oge ọgwụgwụ, emechaakwala m chọta ya. Anyị nwere nnọọ ike inwe olileanya. Ma, nke ka nke ahụ bụ na amalitere m ịghọ enyi nke Nna m nke eluigwe, Onye Okike na Chineke nke eluigwe na ala.”

Gary kwuru, sị: “Ndụ m bịara nwee nnọọ isi. Ozugbo m malitere ịmụ Baịbụl, o kweghị m nkwụsị. Agụrụ m amụma ndị dị na Baịbụl, tụlee ihe ndị na-egosi na ha ga-emezu, ya edookwa m anya na Chineke ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya. Echere m, sị, ‘Ndị mmadụ kwesịrị ịkwadowe maka ụdị ndụ nke Chineke chọrọ ka anyị bie, ọ bụghị maka ọdachi.’” Gary na Karen malitere inwe olileanya maka ọdịnihu. Kama ichegbuwe onwe ha maka ọgwụgwụ ụwa, obi siri ha ike na Chineke ga-ewepụ nsogbu ndị na-echi ụmụ mmadụ ọnụ n’ala ma mee ka ụwa ghọghachi paradaịs.

Gịnị ka Gary na Karen na-eme ugbu a mgbe ihe dị ka iri afọ abụọ na ise gaferela? Karen kwuru, sị: “M ka na-eme ka ịhụnanya na okwukwe m nwere n’ebe Jehova Chineke nọ sikwuo ike, m na-agbalịkwa inyere ndị ọzọ aka imekwa otú ahụ. Mụ na Gary na-akwado ibe anyị ma na-eme ka ezinụlọ anyị nọgide na-akwụsi ike ma na-adị n’otu n’ofufe Chineke. Anyị na-agbalị ịhazi ndụ anyị nke ọma, na-agbalịkwa izere ndụ gbalụ gbalụ iji nwee ike ilekwasị anya n’ebe ndị ọzọ nọ nakwa n’igboro ha mkpa ha.”

Gary kwukwara, sị: “M na-ekpe ekpere mgbe niile ka Alaeze Chineke bịa ma mee ka ọtụtụ nde mmadụ nwere onwe ha. Mgbe ọ bụla m na-ezi ndị ọzọ ozi ọma banyere Alaeze Chineke, m na-ekpe ekpere ka m nwee ike ime ma ọ́ dịghị ihe ọzọ ka otu onye nwetụ olileanya site na Baịbụl. Kemgbe ihe karịrị iri afọ abụọ na ise, Jehova azala m nnọọ ekpere ahụ. Mụ na Karen kweere na Jehova ga-agbanwe ụwa kpamkpam n’oge na-adịghị anya, ma anyị anaghịzi atụ ụjọ ọgwụgwụ.”—Matiu 6:9, 10; 2 Pita 3:11, 12.

[Foto dị na peeji nke 9]

Gary na Karen na-enyeziri ndị ọzọ aka inweta olileanya site n’ozi Baịbụl

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya