Ọrịa AIDS—Ntiwapụ Ọrịa ahụ Na-aga n’Ihu
KAREN tolitere n’ebe ọdịda anyanwụ United States.a Dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ nọgidere na-enwe ụkpụrụ omume ọma dị elu n’oge ntorobịa ya. Na 1984, mgbe ọ gbara afọ 23, ọ lụrụ Bill, bụ́ onye bụworo Onyeàmà ruo nanị afọ abụọ. E ji ụmụ abụọ gọzie ha, otu nwoke na otu nwanyị.
Ka ọ na-erule 1991 ịhụnanya ha adịwo omimi karị, ha nwekwara afọ ojuju na obi ụtọ. Ná ngwụsị afọ ahụ, Bill nwere ntụpọ na-acha ọcha n’ire ya bụ́ nke na-ekweghị ala ala. O jere hụ dọkịta.
Nwa mgbe nta mgbe nke ahụ gasịrị, Karen na ụmụ ha nọ n’èzí na-azachasị ahịhịa. Bill nọdụrụ ala n’elu steepụ nke ọnụ ụzọ ụlọ ma kpọọ Karen òkù ka ọ bịa nọdụ ala n’akụkụ ya. O konyere ya aka n’úkwù ma jiri anya mmiri kwuo na ya hụrụ ya n’anya, chọọkwa ka ya na ya biri ruo mgbe ebighị ebi. Gịnị meziri o ji na-ebe ákwá? Dọkịta chere na Bill ebutewo nje HIV, bụ́ nje virus na-akpata ọrịa AIDS.
E nyochara ọbara nke ezinụlọ ahụ. Ihe a chọpụtara na nke Bill na Karen gosiri na ha bu nje HIV. Bill ebutewo ya tupu ọ ghọọ otu n’ime ndị Ndịàmà Jehova; n’aka nke ya, o bufewo Karen ọrịa ahụ. Ihe a chọpụtara na nke ụmụ ha gosiri na ha ebughị ya. N’ime afọ atọ, Bill nwụrụ. Karen kwuru, sị: “Amaghị m otú m ga-esi kọwaa ihe ọ dị ka ya ịnọ na-ele ka nwoke maburu mma ị hụrụ n’anya ma chọọ ka gị na ya biri ruo mgbe ebighị ebi ji nke nta nke nta pụọ ná mmadụ ma ghọọ ọkpụkpụ. Ebere m ákwá ọtụtụ abalị. Ọ nwụrụ mgbe ọ fọrọ ọnwa atọ ka ọ bụrụ afọ iri anyị gbara akwụkwọ. Ọ bụ ezigbo nna na ezigbo di.”
Ọ bụ ezie na otu dọkịta gwara Karen na ọ ga-eso di ya nwụọ n’oge na-adịghị anya, ọ ka dị ndụ. Ọrịa ahụ agawo n’ihu ruo n’ọnọdụ ndị mbụ nke ọrịa AIDS.
Karen bụ nanị otu n’ime ihe dị ka nde mmadụ 30 bu nje HIV/AIDS ugbu a, ọnụ ọgụgụ dị ukwuu karịa ọnụ ọgụgụ ndị bi na Australia, Ireland, na Paraguay ma e jikọta ha ọnụ. Atụmatụ ndị e mere na-egosi na Africa nwere nde mmadụ 21 n’ime ndị a buteworo ya. Dị ka ọnụ ọgụgụ nke Mba Ndị Dị n’Otu na-egosi, ka ọ na-erule mmalite nke narị afọ nke 21, ọnụ ọgụgụ ahụ pụrụ ịrị elu ruo nde mmadụ 40. Otu akụkọ UN na-ekwu na ọrịa ahụ hà ka ntiwapụ ọrịa ndị kasị ukwuu n’akụkọ ihe mere eme. Banyere ndị toruworo ogo inwe mmekọahụ gbara afọ 15 ruo 49 n’ụwa nile, otu onye n’ime 100 mmadụ ebuteworị nje HIV. N’ime ndị a, nanị otu onye n’ime mmadụ 10 na-amata na ya bu ya. N’akụkụ ụfọdụ nke Africa, pasent 25 nke ndị toruworo ogo mmadụ bu ya.
Eri mgbe ọrịa ahụ tiwapụrụ na 1981, ihe e mere atụmatụ ya ịbụ nde mmadụ 11.7 anwụwo n’ihi ọrịa AIDS. A na-eme atụmatụ na na 1997 nanị, ihe dị ka nde mmadụ 2.3 lara n’iyi. Ka o sina dị, e nwere ihe ndị ọhụrụ mere a ga-eji nwee nchekwube n’ọgụ a na-alụso ọrịa AIDS. N’ime afọ ole na ole gara aga, e nwewo ndalata n’ọnụ ọgụgụ ndị ọhụrụ na-ebute ọrịa AIDS ná mba ndị bara ọgaranya. Tụkwasị na nke a, ọgwụ ndị yiri ka ha ga-agwọta ya na-enye olileanya nke ahụ ike ka mma na ndụ a gbatịrị agbatị.
Olee otú ị pụrụ isi chebe onwe gị pụọ n’ọrịa AIDS? Gịnị bụ ihe ọhụrụ ndị pụtaworo n’ihe banyere ọgwụgwọ na ọgwụ mgbochi ọrịa? Ọ̀ dị mgbe a ga-emeri ọrịa ahụ kpam kpam? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu ndị na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha ha.