Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 5/15 p. 6
  • “Ezigbo Onye Nlekọta na Ezigbo Enyi”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ezigbo Onye Nlekọta na Ezigbo Enyi”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọkwà Pụrụ Iche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • “Lee Anyị! Ziga Anyị”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Ndị Gụsịrị Akwụkwọ na Gilead Enweta ‘Ngọzi Ka Ukwuu n’Inye Ihe’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ndị Gụsịrị Akwụkwọ na Gilead Anata Ntụziaka Na-eru n’Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 5/15 p. 6

“Ezigbo Onye Nlekọta na Ezigbo Enyi”

JOHN (JACK) BARR, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, jechara ozi ya n’ụwa n’ụtụtụ Satọdee Disemba 4, 2010. Ọ dị iri afọ itoolu na asaa tupu ya anwụọ. E nweela onye kpọrọ ya “ezigbo onye nlekọta na ezigbo enyi.”

A mụrụ Nwanna Jack Barr n’Abadin, nke dị na Skọtland. Ọ bụ ọdụdụ nwa n’ime ụmụ atọ nne ya na nna ya mụrụ. Nne ya na nna ya bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ. Nwanna Barr na-ejikarị obi ụtọ ekwu banyere otú nne ya na nna ya si zụlite ya; obi dị ya ụtọ na ezigbo nne ya na nna ya setịpụụrụ ya ihe nlereanya magburu onwe ya.

Mgbe Jack gafere afọ iri, ịgwa ndị ọ na-amabughị okwu malitere isiri ya nnọọ ike. Ma, ọ gbasiri mbọ ike ka ọ kwụsị ime nke a. Otu ehihie Sọnde n’afọ 1927, mgbe ọ dị afọ iri na anọ, ọ gwara papa ya na ya chọrọ isoro ya gaa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Otú a ka o si malite. Malite ụbọchị ahụ ruo ụbọchị ọ nwụrụ, ọ nọgidere na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ozi ọma.

Mgbe Jack dị obere, otu ihe mberede nke fọrọ obere ka ọ taa isi mama ya mere ka Jack chebara ndụ echiche. Nke a mere ka ọ rara ndụ ya nye Jehova n’afọ 1929, e meekwa ya baptizim mgbe ohere ya dapụtara n’afọ 1934. Ọ malitere ije ozi na Betel dị na Lọndọn, Ingland n’afọ 1939. Otú a ka o siri bido ozi oge niile nke o jere iri afọ asaa na otu.

N’Ọktoba 29, n’afọ 1960, Nwanna Barr banyere n’ihe ọ kpọrọ “mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa” mgbe ọ lụrụ Mildred Willett, bụ́ onye ozi ala ọzọ ji ịnụ ọkụ n’obi jee ozi ọtụtụ afọ. Nwanna Barr na nwunye ya bụ ezi ihe nlereanya, ha nọgidekwara na-ejekọ ozi ọnụ ruo mgbe Mildred jechara ozi ya n’ụwa n’Ọktoba afọ 2004. Mgbe Nwanna Barr na nwunye ya nọ ndụ, ha na-agụkọ Baịbụl ọnụ kwa ụbọchị.

Ndị ma Jack Barr ga na-echeta ezigbo ndụmọdụ ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ o ji obiọma enye. Ọ na-arụsi ọrụ ike mgbe ọ nọ ndụ, ọ bụ onye nlekọta hụrụ ndị ọ na-elekọta n’anya, bụrụkwa ezigbo enyi ndị mmadụ. Otú o si aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, otú o si ezi ihe n’ọmụmụ ihe, nakwa otú o si ekpe ekpere gosiri na o ji eziokwu kpọrọ ihe nakwa na ya na Jehova dị n’ezigbo mma.

Ọ bụ eziokwu na anyị agaghịzi ahụ Nwanna Barr, obi dị anyị ụtọ na ọ gaala ebe ọ na-agaghị anwụ anwụ, bụ́ ihe ùgwù ọ tụsiri anya ya ike ma na-ekwukarị okwu ya. O jighị ya gwuo egwu.—1 Kọr. 15:53, 54.a

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ị chọọ ịgụ akụkọ ndụ John E. Barr, gaa n’Ụlọ Nche nke July 1, 1987, peeji nke 26 ruo nke 31.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya