Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 10/1 p. 26-31
  • Olee Mgbe E Bibiri Jeruselem Oge Ochie?—Agba nke Mbụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Mgbe E Bibiri Jeruselem Oge Ochie?—Agba nke Mbụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Afọ Iri Asaa” Maka Ole Ndị?
  • Olee Mgbe “Afọ Iri Asaa” ahụ Malitere?
  • Olee Mgbe “Afọ Iri Asaa” ahụ Gwụrụ?
  • Ihe Ndị Ọkọ Akụkọ Ihe Mere Eme Oge Ochie Dere Hà Bụcha Eziokwu?
  • Ihe Ptolemy Dere
  • Gịnị Ka Ihe A Niile Anyị Tụlere Na-egosi?
  • Olee Mgbe E Bibiri Jeruselem Oge Ochie?—Agba nke Abụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Eze Abụọ Na-alụ Ọgụ
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Ndekọ Oge
    Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • Cuneiform Mgbe Ochie na Baịbụl
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 10/1 p. 26-31

Olee Mgbe E Bibiri Jeruselem Oge Ochie?​—Agba nke Mbụ

Gịnị Mere Ịmata Mgbe E Bibiri Ya Ji Dị Mkpa? Gịnịkwa Ka Ihe Ndị A Chọpụtarala Na-egosi?

Isiokwu a bụ nke mbụ n’ime isiokwu abụọ ga-agba n’Ụlọ Nche. Ha abụọ ga-eleba anya n’ajụjụ ụfọdụ ndị ọkà mmụta jụrụla banyere oge e bibiri Jeruselem oge ochie. E mere ezigbo nnyocha dee ha abụọ iji zaa ajụjụ ndị na-agbagwoju ụfọdụ ndị anya, e sikwa na Baịbụl zaa ajụjụ ndị ahụ.

“Ọtụtụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie na-ekwu na ọ bụ n’afọ 586 ma ọ bụ 587 T.O.A. ka e bibiri Jeruselem.a Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji ekwu na ọ bụ n’afọ 607 T.O.A.? Gịnị ka unu gbakwasịrị ụkwụ na-ekwu otú ahụ?”

NKE A bụ ajụjụ otu onye na-agụ akwụkwọ anyị jụrụ. Ma, gịnị mere o ji dị mkpa ka ị mata kpọmkwem afọ eze Babịlọn, bụ́ Nebukadneza nke Abụọ, bibiri Jeruselem? Ihe mbụ mere o ji dị mkpa bụ na mbibi ahụ e bibiri Jeruselem gbanwere nnukwu ihe ná ndụ ndị Chineke. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru na mbibi ahụ kpatara “nsogbu na-enweghị atụ.” Ọ bụ n’afọ ahụ ka e bibiri ụlọ nsọ dị na Jeruselem, bụ́ ebe a nọ kemgbe ihe karịrị narị afọ anọ na-efe Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Otu ọbụ abụ bere ákwá, sị: “Chineke, . . . ha emerụwo ụlọ nsọ gị; ha emewo ka Jeruselem bụrụ mkpọmkpọ ebe.”—Abụ Ọma 79:1.

Ihe nke abụọ mere ọ ji dị mkpa bụ na ọ bụrụ na ị mata kpọmkwem afọ ‘nsogbu ahụ na-enweghị atụ’ malitere ma ghọta otú mbido e bidoghachiri ife Chineke na Jeruselem si mezuo amụma Baịbụl, ọ ga-eme ka obi sie gị ike na ihe e dere na Baịbụl bụ eziokwu. Ajụjụ bụzi, gịnị mere Ndịàmà Jehova ji ekwusi ike na e bibiri Jeruselem na 607 T.O.A., bụ́ nke ji afọ iri abụọ dị iche n’afọ ọtụtụ ndị na-ekwu na e bibiri ya? N’igbu ya ná nkenke, ọ bụ n’ihi na Baịbụl gosiri na ọ bụ n’afọ ahụ.

“Afọ Iri Asaa” Maka Ole Ndị?

Ọtụtụ afọ tupu e bibie Jeruselem, otu onye amụma bụ́ onye Juu, nke aha ya bụ Jeremaya, kwuru ihe ga-enyere anyị aka ịmata mgbe Baịbụl kwuru na njinji ahụ ga-eji. Ọ dọrọ “ndị niile bi na Jeruselem” aka ná ntị, sị: “Ala a dum ga-aghọ ebe a lara n’iyi . . . , mba ndị a ga-ejere eze Babịlọn ozi ruo afọ iri asaa.” (Jeremaya 25:1, 2, 11) Onye amụma ahụ mechakwara kwuo, sị: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘M ga-elebara unu anya mgbe afọ iri asaa zuru na Babịlọn, m ga-eme ka okwu dị mma m kwuru mezuo n’isi unu site n’ịkpọlata unu ebe a.’” (Jeremaya 29:10) Gịnị ka “afọ iri asaa” ahụ na-egosi anyị? Oleekwa otú afọ iri asaa ahụ ga-esi enyere anyị aka ịmata afọ e bibiri Jeruselem?

Otú e si sụgharịa amaokwu a n’ọtụtụ Baịbụl bụ afọ iri asaa “maka Babilọn,” kama ịsụgharị ya afọ iri asaa “na Babịlọn.” (Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) N’ihi ya, ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu na ndị a na-ekwu okwu ha mgbe a na-ekwu banyere afọ iri asaa ahụ bụ Alaeze Ukwu Babịlọn. Akwụkwọ dị iche iche ndị ọkà mmụta dere kwuru na ndị Babịlọn chịrị ala Juda na Jeruselem oge ochie ihe dị ka afọ iri asaa, malite n’ihe dị ka afọ 609 T.O.A. ruo 539 T.O.A. bụ́ mgbe ndị agha mba ọzọ weghaara isi obodo Babịlọn.

Ma, Baịbụl gosiri na afọ iri asaa ahụ bụ oge Chineke ga-ata ndị bi na Juda na Jeruselem ahụhụ, bụ́ ndị kwuru na ha ga-erubere Chineke isi mgbe ha na ya gbara ndụ. (Ọpụpụ 19:3-6) Mgbe ha jụrụ ịkwụsi omume ọjọọ ha na-eme, Chineke kwuru, sị: “M ga-eziga kpọọ . . . Nebukadneza, bụ eze Babịlọn . . . imegide ala nke a, na imegide ndị bi ya, na imegide mba niile ndị a nọ ya gburugburu.” (Jeremaya 25:4, 5, 8, 9, Baibul Nsọ [Ndezigharị Ọhuru]) Ọ bụ eziokwu na Babịlọn ga-ebibikwa mba ndị gbara Jeruselem gburugburu, Jeremaya sịrị na mbibi a ga-ebibi Jeruselem na ndọrọ a ga-adọrọ ndị bi na ya n’agha gaa Babịlọn, bụ́ ebe ha ga-anọ afọ iri asaa, bụ ‘ntaramahụhụ a ga-enye ndị ya’ n’ihi na ‘njehie ndị bi na Jeruselem dị ukwuu.’—Abụ Ákwá 1:8; 3:42; 4:6.

N’ihi ya, Baịbụl gosiri na afọ iri asaa ahụ bụ oge Chineke ji taa Juda ahụhụ, ọ bụkwa ndị Babịlọn ka o ji taa ha ahụhụ ahụ. Ma, Chineke gwara ndị Juu, sị: ‘Mgbe afọ iri asaa zuru, m ga-akpọlata unu ebe a,’ ya bụ, ala Juda na Jeruselem.—Jeremaya 29:10.

Olee Mgbe “Afọ Iri Asaa” ahụ Malitere?

Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme nke aha ya bụ Ezra, bụ́ onye biri ndụ mgbe afọ iri asaa ahụ Jeremaya buru amụma ya gaferala, si n’ike mmụọ nsọ dee banyere Eze Nebukadneza, sị: “Ọ kpụkwaara ndị mma agha gbufọrọ laa Babịlọn. Ha wee bụrụ ndị na-ejere ya na ụmụ ya ozi ruo mgbe alaeze Peshia malitere ịchị; iji mezuo ihe Jehova kwuru site n’ọnụ Jeremaya, ruo mgbe ala ahụ debezuru ụbọchị izu ike o ji ụgwọ ya. O debere ụbọchị izu ike n’ụbọchị niile ọ tọgbọrọ n’efu ruo mgbe afọ iri asaa zuru.”—2 Ihe E Mere 36:20, 21.

N’ihi ya, afọ iri asaa ahụ bụ mgbe ala Juda na ala Jeruselem ga-edebe “ụbọchị izu ike.” Ihe nke a pụtara bụ na a gaghị akọ ihe n’ala ahụ, a gaghị agha mkpụrụ na ya ma ọ bụ kwachaa ubi vaịn ndị dị na ya. (Levitikọs 25:1-5) Ahụhụ Chineke tara ndị ya maka inupụrụ ya isi bụ na o mere ka ala ha tọgbọrọ n’efu ruo afọ iri asaa n’enweghị onye rụrụ ọrụ na ya. O nwere ike ịbụ na otu n’ime mmehie ndị ha mere bụ na ha jụrụ idebe afọ izu ike niile ha kwesịrị idebe.—Levitikọs 26:27, 32-35, 42, 43.

Olee mgbe ala Juda ghọrọ ebe tọgbọọrọ n’efu nke a na-arụghị ọrụ na ya? N’eziokwu, mgbe Nebukadneza na-achị Babịlọn, ndị Babịlọn bịara agha na Jeruselem ugboro abụọ. Ihe dị ka afọ iri ha bịachara nke mbụ, ha abịaghachi. Olee mgbe afọ iri asaa ahụ malitere? O doro anya na ọ bụghị n’oge mbụ ahụ Nebukadneza bịara agha na Jeruselem. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na mgbe Nebukadneza nọchibidoro Jeruselem na nke mbụ ahụ ọ bịara, ọ kpọọrọ ọtụtụ ndị Juu gaa Babịlọn, ma ọ hapụrụ ndị ọzọ ka ha nọrọ n’ala ahụ. Ọ kwatughịkwa obodo ahụ mgbe ahụ. Ndị ahụ ọ hapụrụ n’ala Juda, bụ́ “ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha,” nọkwa na-akọ nri n’ala ha ruo ọtụtụ afọ. (2 Ndị Eze 24:8-17) Ma ihe mechara gbanwee.

Ndị Juu ahụ a hapụrụ nupụụrụ ndị Babịlọn isi, nke a emee ka ndị Babịlọn bịaghachi Jeruselem. (2 Ndị Eze 24:20; 25:8-10) Ha gbara ma obodo ahụ ma ụlọ nsọ dị na ya ọkụ, kpọrọkwa ọtụtụ n’ime ndị obodo ahụ laa Babịlọn. N’ime ọnwa abụọ, ‘ndị Juda niile [ya bụ, ndị nke ahụ a hapụrụ n’ala Juda], onye ukwu na onye nta, ma ndị isi agha tụrụ ụjọ, gbaa ọsọ gbalaga Ijipt, n’ihi na ha tụrụ ụjọ ihe ndị Babịlọn ga-eme ha.’ (2 Ndị Eze 25:25, 26, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ọ bụ naanị mgbe ahụ, ya bụ, n’ọnwa asaa nke ndị Juu, bụ́ ọnwa Tishri (Septemba/Ọktoba) n’afọ ahụ, ka e nwere ike ikwu na ala ahụ atọgbọrọla n’efu n’enweghị onye na-arụ ọrụ na ya, ya bụ, na ọ malitela idebe ụbọchị izu ike ya. Chineke si n’ọnụ Jeremaya gwa ndị Juu ahụ gbagara Ijipt, sị: “Unu onwe unu hụrụ ọdachi dum m mere ka ọ dakwasị Jeruselem na obodo niile dị na Juda, lee, taa, ha bụ ebe a lara n’iyi, ọ dịghịkwa onye bi n’ime ha.” (Jeremaya 44:1, 2) N’ihi ya, ọ ga-abụ mgbe ihe a mere ka afọ iri asaa ahụ malitere. Oleekwanụ afọ ihe a mere? Ihe ga-enyere anyị aka ịmata azịza ya bụ ibugodị ụzọ mata mgbe afọ iri asaa ahụ gwụrụ.

Olee Mgbe “Afọ Iri Asaa” ahụ Gwụrụ?

Daniel onye amụma, bụ́ onye dịrị ndụ ruo “mgbe alaeze Peshia malitere ịchị,” nọ na Babịlọn gbakọọ mgbe afọ iri asaa ahụ ga-agwụ. O dere, sị: “Mụ onwe m, Daniel, ghọtara site n’akwụkwọ dị iche iche afọ ole Jeruselem ga-atọgbọrọ n’efu, ya bụ, afọ iri asaa nke Jehova gwara Jeremaya onye amụma okwu ya.”—Daniel 9:1, 2.

Ezra chebaara amụma ndị Jeremaya buru echiche ma ghọta na “afọ iri asaa” ahụ gwụrụ mgbe “Jehova kpaliri mmụọ Saịrọs eze Peshia. O wee mee ka a kpọsaa n’alaeze ya dum [na ndị Juu enwerela onwe ha ịlaghachi n’ala ha].” (2 Ihe E Mere 36:21, 22) Olee mgbe a gwara ndị Juu na ha nwere ike ịlawa? Ọ bụ “n’afọ mbụ nke ọchịchị Saịrọs eze Peshia” ka e nyere iwu na ha nwere ike ịlawa. Ihe a mere n’afọ Saịrọs malitere ịchị, mgbe o merichara Babịlọn n’afọ 539 T.O.A. (Gụọ igbe bụ́ “Afọ E Nwere Ike Isi na Ya Mata Mgbe Ihe Ndị Ọzọ Mere.”) N’ihi ya, mgbe ọ na-erula ngwụcha afọ 537 T.O.A., ndị Juu alaghachila Jeruselem ma maliteghachi ife Chineke n’ebe ahụ.—Ezra 1:1-5; 2:1; 3:1-5.

Nke a pụtara na otú e si gụkọọ oge na Baịbụl na-egosi anyị na afọ iri asaa ahụ bụ afọ iri asaa nkịtị nke gwụrụ n’afọ 537 T.O.A. Ọ bụrụ na a gụọ ya laghachi azụ, afọ iri asaa ahụ malitere n’afọ 607 T.O.A.

Ma, ọ bụrụ na Akwụkwọ Nsọ e ji ike mmụọ nsọ dee gosiri na ọ bụ n’afọ 607 T.O.A. ka e bibiri Jeruselem, gịnịzi mere ọtụtụ ndị ọkà mmụta ji ekwu na ọ bụ n’afọ 587 T.O.A.? Ọ bụ n’ihi ihe ndị ha gụtara n’ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke oge ochie dere nakwa n’ihe Ptolemy dere. Ihe ndị ahụ ha dere hà bụ eziokwu karịa ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ? Ka anyị hụ.

Ihe Ndị Ọkọ Akụkọ Ihe Mere Eme Oge Ochie Dere Hà Bụcha Eziokwu?

Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme, bụ́ ndị dịrị ndụ obere oge ka e bibichara Jeruselem, enweghị otu olu n’ihe ha dere banyere ndị eze chịrị Babịlọn mgbe Babịlọn na-achị ụwa.b (Gụọ igbe bụ́ “Ndị Eze Chịrị Babịlọn Mgbe Babịlọn Na-achị Ụwa.”) Oge ndị ha kwuru na ihe ụfọdụ mere ekwekọghị n’oge Baịbụl kwuru na ihe ndị ahụ mere. Ma, ihe ndị ahụ ha dere hà bụcha eziokwu?

Otu nwoke a na-akpọ Berossus so ná ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme mbụ dịrị ndụ obere oge Babịlọn chịchara ụwa. Ọ bụ onye Babịlọn, bụrụkwa “onye nchụàjà Bel.” Akwụkwọ o ji aka ya dee n’afọ 281 T.O.A., nke bụ́ Babyloniaca, adịkwaghị, naanị ihe fọrọ na ya bụ iberibe ya ụfọdụ nke ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme ndị ọzọ degharịrị n’akwụkwọ nke ha. Berossus kwuru na ya si “n’akwụkwọ ndị e ji nlezianya chekwaa na Babịlọn” nweta ihe ya dere.1 Ma, ihe niile Berossus dere hà bụcha eziokwu? Ka anyị tụlee otu ihe atụ.

Berossus dere na eze ndị Asiria bụ́ Senakerib chịrị mgbe “nwanne [ya] nwoke chịchara”; mgbe Senakerib chịchara, nwa ya [bụ́ Isahadọn chịrị] afọ asatọ; mgbe [Isahadọn] chịchara, Sammuges [Shamash-shuma-ukin] achịa afọ iri abụọ na otu.” (Babyloniaca nke Atọ, 2.1, 4) Ma, ihe ndị Babịlọn dere ogologo oge tupu a mụọ Berossus kwuru na Senakerib bidoro ịchị mgbe nna ya, bụ́ Sagọn nke Abụọ, chịchara, ọ bụghị mgbe nwanne ya nwoke chịchara; Isahadọn chịrị afọ iri na abụọ, ọ bụghị afọ asatọ; Shamash-shuma-ukin chịkwara afọ iri abụọ, ọ bụghị afọ iri abụọ na otu. Ọkà mmụta bụ́ R. J. van der Spek kwetara na Berossus leere anya n’ihe odide ndị Babịlọn dee nke ya, ma o dere, sị: “Nke a egbochighị ya itinye nnu na ose n’ihe ndị o dere nakwa ịkọwa ihe ụfọdụ otú masịrị ya.”2

Olee otú ndị ọkà mmụta ndị ọzọ si ele Berossus anya? S. M. Burstein, bụ́ onye nyochara ihe dị iche iche Berossus dere, kwuru, sị: “N’oge gara aga, a na-ewere na Berossus bụ ọkọ akụkọ ihe mere eme.” Ma, o kwukwara, sị: “E lewe ihe ndị o dere, a ga-asị na o rughị eru ịbụ ọkọ akụkọ ihe mere eme. N’agbanyeghị na ọ bụ ibé akwụkwọ ole na ole fọrọ n’akwụkwọ ahụ o dere, a hụla ọtụtụ ihe o dere na ha bụ́ ndị doro onye ukwu na onye nta anya na ha abụghị eziokwu . . . Ọkọ akụkọ ihe mere eme ekwesịghị idehie ihe otú ahụ, ma ihe Berossus bu n’obi dee ihe ndị ahụ abụghị ka ha bụrụ akụkọ ihe mere eme.”3

Gịnị ka ihe ndị a anyị lebarala anya na ha na-egosi? È kwesịrị iwere ya na oge Berossus kwuru na ihe ndị ọ kọrọ akụkọ ha mere bụcha mgbe ha ji mee? Oleekwanụ maka ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme ndị ọzọ e nwere n’oge ochie, bụ́ ndị leere anya n’ihe Berossus dere gbakọọ oge ihe ụfọdụ mere n’oge ochie? È nwere ike ikwu na oge ndị ha kwuru na ihe ndị ahụ mere bụ mgbe ha mere n’eziokwu?

Ihe Ptolemy Dere

E nwere otu nwoke bụ́ ọkà mmụta na-enyocha mbara igwe nke aha ya bụ Claudius Ptolemy. Ihe nwoke a dere banyere ndị eze so n’ihe mere e ji ekwu na ọ bụ n’afọ 587 T.O.A. ka e bibiri Jeruselem. Ndị ọkà mmụta anaghị eji ihe ahụ Ptolemy dere egwuri egwu ma ha gbakọwa oge ihe dị iche iche ji mee n’oge ochie nakwa n’oge Babịlọn na-achị ụwa.

Mgbe Ptolemy dere ihe ndị ahụ, ndị Babịlọn achịchaala, ihe dị ka narị afọ isii agafeekwa. Oleezi otú o si mata mgbe eze mbụ ọ kọrọ akụkọ ya malitere ịchị? Ptolemy kọwara na mgbe ya na ndị òtù ya ji ihe ndị na-eme na mbara igwe na ihe ụfọdụ ha chọpụtara banyere oge ndị chi jiri n’ehihie gụkọọ oge, ha “chọpụtara oge Nabonassar malitere ịchị,” bụ́ eze mbụ ọ kọrọ akụkọ ya.4 N’ihi nke a, Christopher Walker, bụ́ onye na-arụ n’Ebe A Na-edebe Ihe Ndị Mgbe Ochie na Briten, kwuru na ihe Ptolemy dere “bụ ihe ga-enyere ndị na-enyocha mbara igwe aka ịgụkọ oge, ọ bụghị ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme ga-eji amata kpọmkwem mgbe ndị eze dị iche iche malitere ịchị na mgbe ha nwụrụ.”5

Otu n’ime ndị na-akwado nnọọ ihe Ptolemy dere, onye aha ya bụ Leo Depuydt, dere, sị: “Ọ dịla anya a matara na ihe o dere bụ eziokwu ma a bịa n’ihe metụtara ihe ndị dị na mbara igwe, ma nke a apụtaghị na ihe o dere banyere ihe ndị mere eme bụcha eziokwu.” Prọfesọ Depuydt dekwara banyere ndị eze Ptolemy kọrọ akụkọ ha, sị: “Banyere ndị eze ahụ [ma ndị nke chịrị Babịlọn mgbe Babịlọn na-achị ụwa], e kwesịrị ile ihe ndị e dere n’ụrọ n’oge ochie iji mata ma ihe ndị Ptolemy dere banyere ndị eze ahụ hà bụkwa eziokwu.”6

Gịnị bụ “ihe ndị ahụ e dere n’ụrọ n’oge ochie” nke ga-enyere anyị aka ịmata ma ihe ndị Ptolemy dere hà bụ eziokwu? Ụfọdụ n’ime ha bụ ihe ndị Babịlọn dere, ebe e depụtara aha ndị eze, na ihe ndị e dere banyere azụmahịa. Ndị dere ihe ndị a bụ ndị odeakwụkwọ ndị biri ndụ mgbe Babịlọn na-achị ụwa, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ ndị nke biri ndụ obere oge Babịlọn chịchara.7

Gịnị ka a chọpụtara mgbe e lere ihe ndị e dere n’ụrọ iji mata ma ihe Ptolemy dere ọ̀ bụkwa eziokwu? N’igbe bụ́ “Olee Ọdịiche Dị n’Ihe Ptolemy Dere na Ihe E Dere n’Ụrọ n’Oge Ochie?” (nke dị n’okpuru), e depụtara ụfọdụ aha ndị eze e dere n’ụrọ n’oge ochie, depụtakwa aha ndị eze Ptolemy dere. Ị̀ hụrụ na Ptolemy dere naanị aha ndị eze anọ n’agbata aha eze Babịlọn bụ́ Kandalanu na aha eze Babịlọn ọzọ bụ́ Nabonidus? Ma, n’otu ihe e dere n’ụrọ, nke a kpọrọ Ndị Eze Chịrị Uruk, e nwere ndị eze asaa n’agbata ndị eze abụọ ahụ. Ọ̀ ga-abụ na ndị eze ahụ chịrị obere oge nke na ọ dịghị mkpa ikwutewe okwu ha? Otu ihe e dere n’ụrọ, nke kọrọ banyere azụmahịa, gosiri na otu n’ime ndị eze ahụ chịrị afọ asaa.8

Otu n’ime ihe e dere n’ụrọ gosiri na tupu Nabopolassar (bụ́ eze mbụ chịrị Babịlọn mgbe Babịlọn na-achị ụwa) amalite ịchị, e nwere eze (bụ́ Ashur-etel-ilani) chịrị afọ anọ na Babịlonia. E nwekwara mgbe a na-enweghị eze n’ala ahụ ruo otu afọ.9 Ma, Ptolemy ekwuteghị okwu oge ndị a n’ihe ahụ o dere.

Gịnị mere Ptolemy ji hapụ idenye aha ụfọdụ ndị eze? O nwere ike ịbụ maka na o cheghị na ha bụ ezigbo ndị eze chịrị Babịlọn.10 Dị ka ihe atụ, o denyeghị aha Labashi-Marduk, bụ́ otu n’ime ndị eze chịrị Babịlọn mgbe Babịlọn na-achị ụwa. Ma ihe ndị e dere n’ụrọ gosiri na ndị eze ahụ Ptolemy hapụrụ ide aha ha chịrị Babịlonia n’eziokwu.

E nwere ike ikwu na o nweghị ihe dị oké njọ n’ihe Ptolemy dere. Ma, ebe ọ bụ na e nwere ihe ndị ọ na-edenyeghị, è kwesịrị ịgbakwasị ụkwụ n’ihe ahụ o dere kwubie mgbe ihe dị iche iche mere n’oge ochie ji mee?

Gịnị Ka Ihe A Niile Anyị Tụlere Na-egosi?

N’igbu ya ná nkenke: Baịbụl kwuru hoo haa na ndị Juu nọrọ afọ iri asaa na Babịlọn mgbe a dọọrọ ha n’agha. E nwere ezigbo ihe gosiri na ndị Juu ahụ laghachiri n’ala ha n’afọ 537 T.O.A., ọtụtụ ndị ọkà mmụta kwetakwara na nke a bụ eziokwu. Ọ bụrụ na anyị amalite n’afọ ahụ gụrụ laghachi azụ, anyị ga-achọpụta na e bibiri Jeruselem n’afọ 607 T.O.A. Ọ bụ eziokwu na ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke oge gboo dere na ihe Ptolemy dere gosiri na ọ bụghị mgbe ahụ, a na-enyo ụfọdụ ihe ndị ahụ ha dere enyo. N’eziokwu, ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme ahụ dere na ihe Ptolemy dere enweghị nke kwuru ezigbo ihe gosiri na oge Baịbụl kwuru na ihe ndị ahụ mere abụghị eziokwu.

Ma, a ka nwere ajụjụ ndị ọzọ fọrọnụ. Ọ̀ bụ eziokwu na e nweghị ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwurula bụ́ ndị kwadoro na e bibiri Jeruselem n’afọ 607 T.O.A. dị ka Baịbụl gosiri? Ebe ọ bụ na e nwere ihe ndị e dere n’ụrọ, bụ́ ndị a ma mgbe e dere ha, bụ́kwa nke ndị dere ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ji anya ha hụ mgbe ihe ndị ha dere mere, gịnị ka a chọpụtara n’ihe e dere n’ụrọ ndị ahụ? Anyị ga-eleba anya n’ajụjụ ndị a n’Ụlọ Nche ọzọ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ụfọdụ akwụkwọ ndị ọkà mmụta dere kwuru na e bibiri Jeruselem n’afọ 586 T.O.A., ụfọdụ ekwuo na ọ bụ n’afọ 587 T.O.A. Ma, nke anyị ga-ede n’isiokwu a na nke ga-eso ya bụ afọ 587 T.O.A. T.O.A. pụtara “Tupu Oge Anyị.”

b Onye mbụ ná ndị eze chịrị mgbe Babịlọn na-achị ụwa bụ nna Nebukadneza, bụ́ Nabopolassar, ebe onye nke ikpeazụ bụ Nabonidus. Oge ndị eze ahụ chịrị dị ndị ọkà mmụta mkpa n’ihi na ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ n’ime afọ iri asaa ahụ Jeruselem tọgbọọrọ n’efu ka ha niile chịrị.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 28]

AFỌ E NWERE IKE ISI NA YA MATA MGBE IHE NDỊ ỌZỌ MERE

E ji ihe ndị a na-esonụ mata na ọ bụ n’afọ 539 T.O.A. ka Saịrọs nke Abụọ meriri Babịlọn:

▪ Ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme dere n’oge ochie nakwa ihe ndị e dere n’ụrọ: Diodorus nke Sisili (onye dịrị ndụ n’ihe dị ka afọ 80-20 T.O.A.) dere na Saịrọs ghọrọ eze Peshia “afọ atọ tupu afọ a ga-enwe egwuregwu Olimpik nke Iri Ise na Ise.” (Akwụkwọ bụ́ Historical Library, Book 9, 21) Afọ ahụ bụ 560 T.O.A. Herodotus, bụ́ onye Grik bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme, (onye dịrị ndụ n’ihe dị ka afọ 485-425 T.O.A.) kwuru na e gburu Saịrọs “mgbe ọ chịchara afọ iri abụọ na itoolu,” nke pụtara na ọ nwụrụ n’afọ nke iri atọ nke ọchịchị ya, ya bụ, n’afọ 530 T.O.A. (Histories, Book 1, Clio, 214) Ihe ndị e dere n’ụrọ gosiri na Saịrọs chịrị ebe ahụ bụ́bu Alaeze Ukwu Babịlọn afọ itoolu tupu ya anwụọ. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ebido mgbe Saịrọs nwụrụ n’afọ 530 T.O.A. gụwa, ma gbakwunye ya afọ itoolu, ihe ọ pụtara bụ na ọ bụ laghachi azụ n’afọ 539 T.O.A. ka o meriri Babịlọn.

Ihe otu ihe e dere n’ụrọ na-egosi: Otu ihe ndị Babịlọn na-enyocha mbara igwe dere n’ụrọ (BM 33066) gosikwara na ọ bụ n’afọ 530 T.O.A. ka Saịrọs nwụrụ. N’agbanyeghị na ihe ụfọdụ e dere n’ụrọ ahụ banyere ebe ihe ndị dị na mbara igwe dị abụghị eziokwu, ụrọ ahụ kọrọ banyere ugboro abụọ chi jiri n’ehihie, bụ́ nke o kwuru mere n’afọ nke asaa nke ọchịchị Cambyses nke Abụọ, bụ́ nwa Saịrọs nke malitere ịchị mgbe Saịrọs nwụrụ. E kwuru na chi ahụ jiri na Babịlọn na Julaị 16, 523 T.O.A., nakwa na Jenụwarị 10, 522 T.O.A. Nke a gosiri na ọ bụ ná mbido afọ 523 T.O.A. ka afọ nke asaa nke ọchịchị Cambyses malitere. Nke a pụtara na ọ bụ n’afọ 529 T.O.A. ka ọ malitere ịchị. N’ihi ya, afọ ikpeazụ Saịrọs chịrị ga-abụ afọ 530 T.O.A., nke pụtara na afọ 539 T.O.A. bụ afọ mbụ ọ malitere ịchị ebe ahụ bụ́bu Alaeze Ukwu Babịlọn.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mbadamba ụrọ: © The Trustees of the British Museum

[Igbe dị na peeji nke 31]

ISI IHE NDỊ ANYỊ TỤLERE N’ISIOKWU A

▪ Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwukarị na ọ bụ n’afọ 587 T.O.A. ka e bibiri Jeruselem.

▪ Ihe ndị a kọrọ na Baịbụl gosiri nnọọ na ọ bụ n’afọ 607 T.O.A. ka e bibiri ya.

▪ Ebe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke oge a na-agbakwasịkarị ụkwụ ekwu na ọ bụ n’afọ 587 T.O.A. ka e bibiri Jeruselem bụ n’ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke oge gboo dere nakwa n’ihe Ptolemy dere.

▪ Ọtụtụ ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke oge gboo dere abụghị eziokwu, e nwekwara ebe ihe ndị e dere n’ụrọ na ihe ndị ha dere na-abụghị otu.

[Igbe dị na peeji nke 31]

Ebe A Kọwakwuru Ihe Ụfọdụ

1. Babyloniaca, (Chaldaeorum Historiae), Book One, 1.1.

2. Studies in Ancient Near Eastern World View and Society, peeji nke 295.

3. The Babyloniaca of Berossus, peeji nke 8.

4. Almagest, nke Atọ, 7, nke G. J. Toomer sụgharịrị, nke dị n’akwụkwọ bụ́ Ptolemy’s Almagest. E bipụtara ya n’afọ 1998, peeji nke 166. Ptolemy maara na ndị na-enyocha mbara igwe na Babịlọn ji ihe ha maara banyere mgbakọ na mwepụ “gbakọọ” oge ndị chi jiburu n’ehihie nakwa oge ndị chi ka ga-eji n’ehihie. Otú ha si mata nke a bụ na ha chọpụtara na otú chi na-esi eji n’ehihie kwa afọ iri na asatọ ọ bụla na-abụ otu.—Almagest, nke Anọ, 2.

5. Mesopotamia and Iran in the Persian Period, peeji nke 17-18.

6. Journal of Cuneiform Studies, Nke 47, 1995, peeji nke 106-107.

7. Otú ndị odeakwụkwọ oge ochie si ede ihe n’ụrọ bụ na ha na-eji ihe dị ka osisi pịrị ọnụ akanye ihe n’ụrọ mgbe ụrọ ahụ na-akpọbeghị.

8. Sin-sharra-ishkun chịrị afọ asaa, o nwekwara mbadamba ụrọ iri ise na asaa ndị kọrọ banyere ahịa ndị ọ zụrụ n’oge ọ na-achị. A malitere ide ihe ndị ahụ n’afọ o bidoro ịchị ruo afọ asaa ọ chịrị. Gụọ Journal of Cuneiform Studies, Nke 35, 1983, peeji nke 54-59.

9. E kwuru na e dere mbadamba ụrọ bụ́ C.B.M. 2152, bụ́ nke kọrọ banyere azụmahịa, n’afọ nke anọ nke ọchịchị Ashur-etel-ilani. (Akwụkwọ bụ́ Legal and Commercial Transactions Dated in the Assyrian, Neo-Babylonian and Persian Periods—Chiefly From Nippur, nke A.T. Clay dere n’afọ 1908, peeji nke 74.) N’ihe odide bụ́ Harran Inscriptions of Nabonidus, (H1B), I, ahịrị nke 30, aha Nabopolassar na-esote nke Ashur-etel-ilani. (Anatolian Studies, Nke 8, 1958, peeji nke 35, 47.) Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmara banyere oge a na-enweghị eze na Babịlọn, gụọ Chronicle 2, ahịrị nke 14, n’akwụkwọ bụ́ Assyrian and Babylonian Chronicles, peeji nke 87-88.

10. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-ekwu na e nwere ndị eze Ptolemy hapụrụ ide aha ha maka na a kpọrọ ha ‘Ndị Eze Asiria.’ Ọ dị ka Ptolemy ò dere naanị aha ndị eze Babịlọn. Ma, ị ga-ahụ n’igbe dị na peeji nke 30, na e nwere ọtụtụ eze ndị Ptolemy dere aha ha, ma a kpọkwara ha ‘Ndị Eze Asiria.’ Mbadamba ụrọ ndị e dere banyere azụmahịa na ha, akwụkwọ ozi ndị e dere n’ụrọ, na ihe ndị ọzọ gosichara na ndị eze bụ́ Ashur-etel-ilani, Sin-shumu-lishir, na Sin-sharra-ishkun chịrị Babịlonia.

[Okwu nkọwa dị na peeji nke 31]

A natara Ebe A Na-edebe Ihe Ndị Mgbe Ochie na Briten ikike see foto a

[Okwu nkọwa dị na peeji nke 29]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

NDỊ EZE CHỊRỊ BABỊLỌN MGBE BABỊLỌN NA-ACHỊ ỤWA

Ọ bụrụ na ihe niile ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme ndị a dere bụcha eziokwu, gịnị mere na ha enweghị otu olu?

BEROS- POLYHIS- JOSE- PTOL-

SUS TOR PHUS EMY

ihe dị 105-? 37-?100 ihe dị

ka afọ T.O.A. O.A. ka afọ

350-270 100-170

T.O.A. O.A.

Ndị Eze

Nabopo

lassar 21 20 — 21

Nebukad

neza nke Abụọ 43 43 43 43

Amel-

Marduk 2 12 18 2

Neri

glissar 4 4 40 4

Labashi-

Marduk ọnwa 9 — ọnwa 9 —

Naboni

dus 17 17 17 17

Afọ ole ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme n’oge ochie kwuru na eze nke ọ bụla chịrị

[Ebe E Si Nweta Foto]

A natara Ebe A Na-edebe Ihe Ndị Mgbe Ochie na Briten ikike see foto a

[Chaatị/​Foto ndị dị na peeji nke 30]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

OLEE ỌDỊICHE DỊ N’IHE PTOLEMY DERE NA IHE E DERE N’ỤRỌ N’OGE OCHIE?

E nwere ndị eze Ptolemy hapụrụ ide aha ha. Gịnị kpatara ya?

IHE PTOLEMY DERE

Nabonassar

Nabu-nadin-zeri (Nadinu)

ukin-zeri na Pul

Ululayu (Shalmaniza nke Ise) “Eze Asiria”

Merodak-baladan

Sagọn nke Abụọ bụ́ “Eze Asiria”

Oge Mbụ A Na-enweghị Eze n’Ala Ahụ

Bel-ibni

Ashur-nadin-shumi

Nergal-ushezib

Mushezib-Marduk

Oge nke Abụọ A Na-enweghị Eze n’Ala Ahụ NDỊ EZE CHIRI URUK

Isahadọn bụ́ “Eze Asiria” BỤ́ NDỊ E DERE AHA HA

Shamash-shuma-ukin N’ỤRỌ N’OGE OCHIE

Kandalanu Kandalanu

Sin-shumu-lishir

Sin-sharra-ishkun

Nabopolassar Nabopolassar

Nebukadneza Nebukadneza

Amel-Marduk Amel-Marduk

Neriglissar Neriglissar

Labashi-Marduk

Nabonidus Nabonidus

Saịrọs

Cambyses

[Foto]

Ihe ndị Babịlọn dere so n’ihe ndị e dere n’ụrọ bụ́ ndị na-enyere anyị aka ịmata ma ihe Ptolemy dere ọ̀ bụkwa eziokwu

[Ebe E Si Nweta Foto]

A natara Ebe A Na-edebe Ihe Ndị Mgbe Ochie na Briten ikike see foto a

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 31]

Photograph taken by courtesy of the British Museum

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya