Ọ̀ Dị Ihe E Nwere Ike Ikwu na “Ọ Gaghị Ekwe Omume”?
N’AFỌ 1912, e wepụtara otu nnukwu ụgbọ mmiri a kpọrọ Taịtanik. Ọ bụ ụgbọ mmiri kacha ibu na nke kacha mma e nwere n’oge ahụ. N’ihi ihe ọgbara ọhụrụ ndị e ji rụọ ụgbọ ahụ, e kwuru na ‘o nweghị ihe ga-eme ka o kpuo.’ Ma njinji mechara jie. Na njem mbụ ụgbọ mmiri ahụ mere, ọ gara kụọ ná nnukwu snoo kpụkọrọ n’Oké Osimiri Atlantik ma gbuo ihe dị ka otu puku mmadụ na narị mmadụ ise ná ndị nọ n’ime ya. N’ime awa ole na ole, ụgbọ ahụ e kwuru na o nweghị ihe ga-eme ka o kpuo mikpuru n’ala ala oké osimiri.
E nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike iche na ha agaghị ekwe omume. Ọ bụrụ na e nwere ihe anyị chere na anyị agaghị emeli ma ọ bụ na anyị agaghị edili ma ọ bụ na anyị agaghị aghọtali, anyị nwere ike iche na ihe ahụ agaghị ekwe omume. E nwere ọtụtụ ihe ndị ọkà mmụta sayensị merela n’oge a, ma o nwere mgbe e chere na ha agaghị ekwe omume. Ihe kpatara ya bụ na n’oge ahụ, ụmụ mmadụ amaghị otú e si eme ihe ndị ahụ, ha ekwetaghịdị na o nwere mgbe ihe ndị ahụ ga-ekwe omume. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ bụ iziga ndị mmadụ n’ọnwa, isi n’ụwa zipụ ụgbọ ga-abanye n’ime ígwé ma nọrọ n’ụwa na-agwa ya ihe ọ ga-eme, nakwa mmadụ ịnọ n’ụlọ ya na-ege ma na-ekiri ihe ndị na-eme n’ebe ọzọ n’ụwa mgbe ihe ndị ahụ na-eme. Ihe ọzọ ha chọpụtara bụ ihe mere mmadụ ji eyi ndị mụrụ ya. N’ihe dị ka afọ iri ise gara aga, o nweghị onye ga-ekweta na ihe ndị a ga-ekwe omume. Onye bụ́bu onyeisi ala Amerịka, nke aha ya bụ Ronald Reagan, kwuru ihe gosiri na nke a bụ eziokwu mgbe ọ gwara ndị ọkà mmụta sayensị bi n’Amerịka okwu. Ọ sịrị ha: “Unu bụ́ ndị ọkà mmụta sayensị emeela ka ihe ndị e chere n’oge gara aga na ha agaghị ekwe omume ghọọ ihe na-eme eme n’oge a.”
N’ihi ọtụtụ ihe dị ịtụnanya a na-emepụta n’oge a, otu ọkà mmụta aha ya bụ John Brobeck, kwuru, sị: “E nweghịzi ọkà mmụta sayensị nke nwere ike ikwu hoo haa na o nwere ihe na-agaghị ekwe omume. Naanị ihe o nwere ike ikwu bụ na o nwere ike ọ gaghị eme. Ọ bụrụ na o kwuo na ihe agaghị ekwe omume, ihe ọ na-ekwu bụ na a gaghị emeli ihe ahụ ugbu a n’ihi na ndị ọkà mmụta amabeghị otú e si eme ya.” Ọkà mmụta ahụ kwukwara na ọ bụrụ na e nwere ihe dị anyị ka ọ gaghị ekwe omume, “e nwere ikike anyị na-amaghị nke ga-eme ka ihe ahụ kwe omume. Akwụkwọ Nsọ kwuru na ikike ahụ bụ ike Chineke.”
Ihe Niile Kwere Omume n’Ebe Chineke Nọ
Ogologo oge gara aga tupu John Brobeck ekwuo ihe a o kwuru, Jizọs onye Nazaret, bụ́ nwoke kacha ukwuu nke dịtụrụla ndụ n’ụwa, kwuru, sị: “Ihe na-ekweghị omume n’ebe ụmụ mmadụ nọ kwere omume n’ebe Chineke nọ.” (Luk 18:27) Mmụọ nsọ Chineke bụ ike kacha ike niile e nwere ma n’eluigwe ma n’ụwa. Mmadụ enweghị ike ịmata otú ike a haruru. Mmụọ nsọ nwere ike ime ka anyị mee ihe ndị na-agaghị ekwe anyị omume.
Ọtụtụ mgbe, o nwere nsogbu ndị ọ na-abụ ha bịara anyị, ya adị anyị ka anyị agaghị edili ha. Dị ka ihe atụ, onye anyị hụrụ n’anya nwere ike ịnwụnahụ anyị ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na mmadụ na di ya ma ọ bụ nwunye ya na-esekarị okwu ma ọ bụkwanụ na otú anyị si ebi ndụ na-akpatara anyị nsogbu. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee, ike ụwa nwere ike ịgwụ anyị, anyị agaghịkwa ama ma ọ bụ anyị gawa ihu ma ọ bụ anyị gawa azụ. Ma, gịnị ka anyị nwere ike ime ma ụdị ihe a mee?
Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na mmadụ nwere okwukwe na Chineke, na-agbalịkwa ike ya niile ime uche ya ma na-ekpe ekpere ka o nye ya mmụọ nsọ ya, Chineke ga-enyere onye ahụ aka idi nsogbu ndị onye ahụ chere na ọ gaghị edili. Jizọs kwuru ihe a na-akasi obi: “N’ezie, ana m asị unu na onye ọ bụla nke sịrị ugwu a, ‘Ka e bulie gị tụba gị n’oké osimiri,’ ọ bụrụkwa na o nweghị obi abụọ n’ime obi ya, kama nwee okwukwe na ihe o kwuru ga-eme, ọ ga-emere ya otú ahụ.” (Mak 11:23) O nweghị nsogbu anyị na-agaghị edili ma ọ bụrụ na anyị ekwere ka Okwu Chineke na mmụọ nsọ ya na-edu anyị.
Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwoke ọrịa kansa gburu nwunye ya. Ya na nwunye ya lụkwaranụ kemgbe iri afọ atọ na asatọ. Ọnwụ nwunye ya gbawara ya obi. Ọ bịara dị ya ka ọ gaghị edili ya. O nwere oge ọ na-adị ya ka ya nwụọ kama ịnọrọ ndụ. Ọ na-adị ya mgbe ahụ ka ọ̀ nọ na “ndagwurugwu gbara oké ọchịchịrị.” (Abụ Ọma 23:4) O kwuru na ihe mechara nyere ya aka idi ihe ahụ o chere na ya agaghị edili bụ ekpere niile o ji anya mmiri kpegara Chineke na Baịbụl ọ nọ na-agụ kwa ụbọchị, nakwa arịrịọ ọ rịọsiri Chineke ike ka o nye ya mmụọ nsọ ya.
O nwekwara otu di na nwunye na-esekarị okwu. Nke nwoke na-ewe iwe ọkụ, nweekwa ọtụtụ àgwà ọjọọ ndị ọzọ. Ike ụwa gwụrụ nwunye ya, ya achọọkwa igbu onwe ya. Nwoke ahụ na Ndịàmà Jehova mechara malite ịmụ Baịbụl. Ihe ndị ọ mụtara nyeere ya aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị ọ na-akpa, kwụsịkwa iwe iwe ọkụ. Nke a tụrụ nwunye ya n’anya n’ihi na o chere na di ya emekataghị kwụsị àgwà ọjọọ ndị ahụ ọ na-akpa.
E nwere otu nwoke ọzọ nke na-aṅụ ọgwụ ike ma na-ebi ndụ rụrụ arụ. Nwoke ahụ kwuru na ya dị ka onye mmiri na-eri. Ọ sịrị: “Ọ bịara dị m ka o nwekwaghị uru m bara ná ndụ.” O kpesiri ekpere ike, gwa Chineke, sị: “Onyenwe m, ama m na ị dị adị. Biko, nyere m aka!” Obere oge o kpechara ekpere ahụ, ya na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Ihe ndị ọ mụtara na Baịbụl mere ka ọ kwụsị ndụ ọjọọ ahụ ọ na-ebi. O kwuru, sị: “Ọtụtụ mgbe, obi m na-ama m ikpe, ọ na-adịkwa m ka o nweghị uru m bara. Mgbe ụfọdụ, obi na-ajọ m ezigbo njọ. Ma, Okwu Chineke enyerela m aka iwepụ echiche ọjọọ ndị a n’obi m. Mgbe ọ bụla ụra na-ekweghị atụ m n’abalị, m na-echeta amaokwu Baịbụl ndị m bu n’isi ma na-agụgharị ha n’obi m. Otú a m si na-ewepụ echiche ọjọọ n’obi m abaarala m ezigbo uru.” Nwoke a alụọla nwaanyị ugbu a, ya na nwunye ya bikwa n’udo. Ya na nwunye ya na-enyere ndị ọzọ aka ka ha mụta Okwu Chineke ma hụ otú o si akpa ike. Ọ na-abụ nwoke a cheta otú ọ dị ya mgbe ọ bụ nwa okorobịa, ọ naghị ekweta na ndụ ya nwere ike ịdị otú ọ dị ugbu a.
Ihe ndị a anyị kọrọ na-egosi na Okwu Chineke na-akpa ike nakwa na mmụọ nsọ Chineke nwere ike ime ihe anyị chere na “ọ gaghị ekwe omume” ná ndụ anyị. Ma i nwere ike ịsị, “Ihe a emekataghị mee ọ gwụla ma mmadụ o nwere okwukwe.” Nke ahụ bụ eziokwu. Baịbụl kwuru na ‘ọ bụrụ na okwukwe adịghị, ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị Chineke ezi mma.’ (Ndị Hibru 11:6) Weregodị ya na ezigbo enyi gị nke nwere ezigbo ego gwara gị, sị: “Echegbula onwe gị. Ọ bụrụ na o nwere ihe dị gị mkpa, bịa gwa m, m ga-emere gị ya.” O doro anya na ihe a o kwuru ga-eme ka obi sie gị ike. Ma, ọ naghị adịrị ụmụ mmadụ mfe imezu ihe niile ha kwuru. Ihe nwere ike isiri enyi gị ahụ ike nke na ọ gaghị emezu nkwa ahụ o kwere gị. Ọnwụ nwekwara ike igbu ya. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị Chineke n’ihi na o nweghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ na-eme ụmụ mmadụ nke nwere ike ime Chineke. Baịbụl gwara anyị, sị: “Ọ dịghị ihe nyịrị Chineke ime.”—Luk 1:37, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.
“Ì Kweere Nke A?”
Baịbụl kọrọ ọtụtụ ihe na-egosi na ọ dịghị ihe nyịrị Chineke. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha.
Otu nwaanyị dị afọ iri itoolu, nke aha ya bụ Sera, chịrị ọchị mgbe a gwara ya na ọ ga-amụ nwa nwoke. Ọ bụ nwa ahụ mechara mụta ndị a na-akpọ ụmụ Izrel. Otu nnukwu azụ̀ loro otu nwoke, ya anọrọ n’afọ azụ̀ ahụ abalị atọ. O mechara pụta n’afọ azụ̀ ahụ ma dee ihe ahụ mere ya n’akwụkwọ. Aha nwoke ahụ bụ Jona. Luk, onye bụ́ dọkịta, kọrọ banyere otu nwa okorobịa aha ya bụ Yutikọs nke nwụrụ mgbe o si na windo otu ụlọ elu daa. Luk kwuru na a kpọlitere nwa okorobịa ahụ n’ọnwụ. Ebe ọ bụ na Luk bụ dọkịta, o doro anya na ọ ma na ọ bụ ọnwụ ka nwa okorobịa ahụ nwụrụ. Akụkọ ndị a abụghị akụkọ ifo. Ọ bụrụ na ị gụọ ebe a kọrọ akụkọ ndị a na Baịbụl ma mee nchọnchọ n’akwụkwọ ndị ọzọ, ị ga-achọpụta na ha mere eme.—Jenesis 18:10-14; 21:1, 2; Jona 1:17; 2:1, 10; Ọrụ 20:9-12.
Jizọs gwara enyi ya Mata ihe a yiri ihe na-agaghị ekwe omume: “Onye ọ bụla nke dị ndụ ma nwee okwukwe n’ebe m nọ agaghị anwụ ma ọlị.” Mgbe o kwuchara ya, ọ jụrụ ya ajụjụ a dị ezigbo mkpa: “Ì kweere nke a?” Anyị kwesịkwara ichebara ajụjụ a echiche n’oge a.—Jọn 11:26.
Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’Ụwa Ọ̀ Ga-ekwe Omume?
Mgbe ndị ọkà mmụta mechara otu nnyocha, ha dere, sị: “N’oge na-adịghị anya, anyị nwere ike ịna-adị ogologo ndụ karịa ka anyị na-adị ugbu a, anyị nwedịrị ike ịdị ndụ ebighị ebi.” Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica kwuru na ihe mere ndị mmadụ ji anwụ abụghị na ike agwụla ihe ndị na-arụ ọrụ n’ahụ́ ha, kama o yiri ka ọ̀ bụ ihe ọzọ anyị na-aghọtabeghị na-eme ka ahụ́ mmadụ kwụsị ịrụ ọrụ.a Akwụkwọ ahụ kwuru na ndị ọkà mmụta sayensị kwetara na e nwere ihe mere anyị ji aka nká, ma ha na-agbalị ka ha kwụsị ihe ahụ mere anyị ji aka nká.
N’agbanyeghị na ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu na mmadụ nwere ike ịdị ndụ ebighị ebi, Baịbụl gwara anyị ezigbo ihe mere anyị ga-eji ekwere na ndị mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi. Onye kere anyị, bụ́ Jehova Chineke, kwere nkwa na “ọ ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 36:9; Aịzaya 25:8) Ì kweere na ọ ga-eme ya? Onye kwere nkwa a bụ Jehova, onye na-apụghị ịgha ụgha.—Taịtọs 1:2.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ebe a kọwara ihe mere mmadụ ji aka nká na afọ ole mmadụ nwere ike ịdịru ndụ, gụọ isiokwu ndị bụ́ “Ị̀ Ga-ezeteli Ịka Nká?,” “Gịnị Mere Anyị Ji Aka Nká?,” na “Afọ Ole Ka Ị Pụrụ Ịdịru Ndụ?” Isiokwu ndị a gbara na Teta! July–September 2006. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]
“Ihe ndị e chere n’oge gara aga na ha agaghị ekwe omume [aghọọla] ihe na-eme eme n’oge a.”—RONALD REAGAN
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 28]
Mgbe nsogbu i chere na ị gaghị edili bịaara gị, ònye ka ị na-agakwuru ka o nyere gị aka?
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 27]
NASA photo