“A Pụrụ Ime Ihe Nile n’Ebe Chineke Nọ”
1 Ọrụ bụ́ isi nke ọgbakọ ndị Kraịst bụ ikwusa ozi Alaeze ahụ n’ụwa nile. (Mat. 24:14) Nke ahụ bụ nnukwu ibu ọrụ. Nye ọtụtụ ndị na-ahụ ihe na-emenụ, o yiri ka ọ̀ na-achọ ikike karịrị nnọọ nke anyị nwere. Nye ndị ọzọ, ịrụzu ọrụ a fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a pụghị ichetụ ya n’echiche n’ihi na anyị na-enweta ịkwa emo, mmegide, na mkpagbu. (Mat. 24:9; 2 Tim. 3:12) Ndị na-arụ ụka kwenyere na ọrụ a bụ ihe a na-apụghị ịrụzu arụzu. Otú ọ dị, Jisọs kwuru, sị: “A pụrụ ime ihe nile n’ebe Chineke nọ.”—Mat. 19:26.
2 Ihe Nlereanya Ndị Dị Mma Iṅomi: Jisọs malitere ozi ya dị ka otu onye nke na-eche ụwa dum ihu. Iji gbalịa igbochi ya inwe ihe ịga nke ọma, ndị mmegide tinyere ya ná mweda n’ala ọ bụla a pụrụ ichetụ n’echiche, n’ikpeazụ, mee ka ọ nwụọ ọnwụ ihe mgbu. Ma, n’ikpeazụ, Jisọs ji obi ike kwupụta, sị: “Mụ onwe m emeriwo ụwa.” (Jọn 16:33) N’ezie, ọ bụ ihe ịtụnanya ka ọ rụzuru!
3 Ndị na-eso ụzọ Jisọs gosipụtara otu mmụọ nke inwe obi ike na ịnụ ọkụ n’obi dị otú ahụ n’ozi ndị Kraịst. A pịara ọtụtụ n’ime ha ihe, kụọ ha ihe, tinye ha n’ụlọ nga, ọbụnakwa gbuo ha egbuo. Ma, ha “na-aṅụrị na a gụrụ ha ná ndị kwesịrị ka e mee ha ihe ihere n’ihi Aha ahụ.” (Ọrụ 5:41) N’eyitụghị ka hà ga-enwe ihe ịga nke ọma, ha rụzuru ọrụ ahụ yiri ihe a na-apụghị ịrụ arụ nke bụ́ ikwusa ozi ọma ahụ ‘ruo ebe ụwa sọtụrụ.’—Ọrụ 1:8; Kọl. 1:23.
4 Ụzọ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma n’Oge Anyị: Anyị onwe anyị kwa ejiriwo ịnụ ọkụ n’obi nara ọrụ nkwusa Alaeze ahụ n’agbanyeghị na o yiri ihe a na-apụghị ịrụzu arụzu. N’agbanyeghị mmachibido iwu, mkpagbu, ịtụ mkpọrọ, na mgbalị ndị ọzọ e ji ime ihe ike na-eme iji kwụsị anyị, anyị na-enwe ihe ịga nke ọma. Olee otú nke a si na-ekwe omume? “Ọ bụghị site n’usuu ndị agha, ọ bụghịkwa site n’ike, kama ọ bụ site na Mmụọ m, ka Jehova nke usuu ndị agha sịrị.” (Zek. 4:6) Ebe Jehova na-akwado anyị, ọ dịghị ihe pụrụ ịkwụsị ọrụ anyị!—Rom 8:31.
5 Mgbe anyị na-eme nkwusa, ọ dịghị ihe mere anyị ga-eji na-eme ihere ma ọ bụ na-atụ egwu ma ọ bụ chee na anyị erughị eru. (2 Kọr. 2:16, 17) Anyị nwere ihe dị ukwuu mere anyị ga-eji gaa n’ihu n’ịgbasa ozi ọma Alaeze ahụ. Site n’enyemaka Jehova, anyị ga-arụzu “ihe a na-apụghị ime”!—Luk 18:27.