Rite Uru Site n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 1996—Akụkụ 1
1 Ị̀ gụwo ntụziaka ndị e nyere ‘n’Usoro Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 1996’? Ị̀ rịbara mgbanwe ụfọdụ ama? Malite January ruo April, Ihe Omume nke 3 ga-adabere n’Isi-Okwu Di Iche Iche nke Bible Maka Nkwurita-Okwu, malitekwa May ruo December, ọ ga-adabere n’akwụkwọ Ihe Ọmụma e wepụtara ọhụrụ. Ihe Omume nke 4 ga-abụ okwu banyere akụkọ Bible dị iche kwa izu.
2 Ihe Omume Ndị Mmụta: A ga-enye nwanna nwanyị Ihe Omume nke 3. Mgbe ọ dabeere n’Isi-Okwu Di Iche Iche nke Bible Maka Nkwurita-Okwu, ọnọdụ ihe omume ya kwesịrị ịgụnye ịgba àmà ọnụ ụzọ ruo ọnụ ụzọ ma ọ bụ ịgba àmà mberede. Mgbe ọ dabeere n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, e kwesịrị ime ya dị ka nletaghachi ma ọ bụ ọmụmụ Bible ebe obibi. Nke a kwesịrị ịbụ nnọọ ihe enyemaka, ebe a ga-eji akwụkwọ Ihe Ọmụma mee ihe nke ukwuu n’iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi.
3 Ọ bụrụ na ọnọdụ okwu bụ ọmụmụ Bible ebe obibi, ụmụnna nwanyị abụọ ahụ pụrụ ịnọdụ ala. Banye ozugbo n’ọmụmụ ihe ahụ site n’ikwu okwu mmepe dị mkpirikpi, wee jụọ ajụjụ ndị e bipụtara. E kwesịrị ime ọnọdụ nke onye nwe ụlọ kpọmkwem otú e si ahụ ya n’ezie. A pụrụ ịsapeta ma gụpụta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka dị ka oge nyere ohere. Nwanna nwanyị ahụ kwesịrị iji nkà izi ihe mee ihe site n’iji ajụjụ dọpụta uche onye ahụ nwe ụlọ na site n’ịtụgharị uche n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e jiri mee ihe.
4 Gịnị ka e kwesịrị ime ma ọ bụrụ na e zoro aka n’ọtụtụ akụkụ akwụkwọ nsọ karịa ka a pụrụ ịtụle na minit ise? Họrọ amaokwu ndị bụ isi na-ewepụta isi ihe ndị dị na ya. Ọ bụrụ na e nwere akụkụ akwụkwọ nsọ ole na ole, a pụrụ ịtụlekwu nke ọma isi ihe ndị dị n’ihe mmụta ahụ. Mgbe mgbe, a pụrụ ịgụpụta paragraf ma ọ bụ ahịrị okwu site n’akwụkwọ ahụ ma sorozie onye nwe ụlọ tụlee ya.
5 Onye nkwusa ihe omume ya gụnyere paragraf ikpeazụ nke isiakwụkwọ pụrụ ịtụle ná mkpirikpi igbe a kpọrọ “Nwalee Ihe Ọmụma Gị,” nke a na-achọta ná ngwụsị isiakwụkwọ nke ọ bụla nke akwụkwọ Ihe Ọmụma. A pụkwara ịtụle igbe ihe ọmụma ndị dabara n’etiti paragraf ndị e kenyere ekenye dị ka oge nyere ohere ya. Ọ bụrụ na igbe ihe ọmụma abata n’etiti ihe omume abụọ, nwanna nwanyị na-eme ihe omume nke mbụ pụrụ ịtụle ya. A pụrụ ikwu okwu banyere ihe osise ndị dị n’akwụkwọ ahụ mgbe ọ bụla ha dabara n’ihe a na-atụle.
6 Ihe Omume nke 4 kwesịrị ịdọrọ nnọọ mmasị ma dị irè. Kwa izu ọ ga-atụle otu akụkọ mere eme n’ezie site na Bible. Jiri nlezianya mụọ ihe akwụkwọ ndị ọzọ nke Society nwere ikwu banyere ebe ndị e kenyere. Wulite okwu ahụ gburugburu isiokwu ahụ, họrọkwa akụkụ Bible ndị bụ isi bụ́ ndị ga-enyere ndị na-ege ntị aka ịtụkwasị uche n’isiokwu ahụ na ihe mmụta ọ bụla anyị pụrụ ịmụta.
7 Ọ bụrụ na anyị ejiri ọzụzụ ụlọ akwụkwọ a na-enye mee ihe n’ụzọ zuru ezu, anyị ga-enwe ike karị ‘ikwusa okwu Ya’ n’ụzọ na-egosipụta ọmarịcha “nkà izi ihe” ahụ.—2 Tim. 4:2, NW.