Nzukọ Ije Ozi Maka January
Izu Na-amalite January 1
Abụ 133 (68)
7 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara site n’Ozi Alaeze Anyị.
13 min: “Jiri Nghọta Kwusaa.” Tụlee isi ihe nile, meekwa otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ. Mee ka ọgbakọ mara akwụkwọ ndị ochie e nwere ugbu a.
25 min: “Nwee Obi Ụtọ, Bụrụkwa Onye A Haziri Ahazi.” Okwu na-ekpo ọkụ nke onye okenye ga-ekwu site n’Ụlọ Nche nke April 1, 1993, peji nke 28-31. N’okwu mmeghe dị mkpirikpi, kọwaa ihe mere o ji bụrụ ihe ịma aka inwe obi ụtọ ma bụrụkwa ndị a haziri ahazi n’ihe nile anyị na-eme. Zoo aka n’ebe Jehova na Ọkpara ya, Jisọs Kraịst, nọ, dị ka ihe atụ nke obi ụtọ na nhazi n’ihe omume ha nile. Mgbe ahụ mee ka isi ihe ndị na-esonụ pụta ìhè: (1) Emesola Onwe Gị Omume n’Ụzọ Enweghị Obi Ebere. (2) Nkịta Dị Ndụ ka ọ bụ Ọdụm Nwụrụ Anwụ? (3) Na-emeso Onwe Gị Ezi Ihe. (4) Na-emeso Ndị Ọzọ Ezi Ihe. (5) Ichebara Onye Ọ Bụla Echiche. (6) Nọrọ Ìgwè Atụrụ ahụ Nso. Gụọ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a họọrọ nke ọma ma tinye ha n’okwu n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Mechie site n’agbamume ịhụnanya ka mmadụ nile gbalịsie ike imeri ihe ịma aka nke ma ịbụ ndị a haziri ahazi ma inwe obi ụtọ.
Abụ 28 (5) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite January 8
Abụ 138 (71)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee ná mkpirikpi nsogbu na-arị elu nke anọghị n’ụlọ. Gbaa ndị nkwusa ume ịgbara oge ahụ site n’ibute ụzọ n’ịgakwuru ndị pụrụ ịdị na-agafe, na-eguzo n’akụkụ ụzọ, ma ọ bụ nọdụ n’ụgbọ ala.
15 min: Uru Nchebe nke Kaadị Advance Medical Directive/Release. Onye okenye esoro ọgbakọ tụlee mkpa nke onye ọ bụla idejupụta kaadị Advance Medical Directive/Release nke ọma na iji ya mgbe nile na mkpa ọ dị ka ụmụaka jiri Identity Card mgbe nile. Dị ka aha kaadị ahụ na-egosi, ọ na-enye ihe ịrịba ama n’oge banyere ihe a chọrọ (ma ọ bụ ghara ịchọ) banyere nlekọta ahụ ike. N’ihi gịnị ka e ji eme nke a kwa afọ? Kaadị ọhụrụ na-enwe ike karịa nke a pụrụ ile anya dị ka ihe oge ya gafeworo ma ọ bụ nke na-adịkwaghị egosipụta nkwenye mmadụ. Kaadị ahụ na-ekwu ọnụ gị ma ọ bụrụ na i nweghị ike ikwuru onwe gị. A ga-eke kaadị n’uhuruchi a. E kwesịrị iji nlezianya dejupụta ha n’ụlọ, ma a gaghị abịanye aka na ha. Dị ka e meworo maka afọ abụọ gara aga, a ga-eme mbịanye aka na ịgba akaebe n’ebe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ dị iche iche, n’okpuru nlekọta nke ndị nduzi ọmụmụ akwụkwọ. Ndị na-abịanye aka dị ka ndị akaebe kwesịrị iji anya ha hụ ka onye ji kaadị ahụ bịanyere aka na kaadị ahụ. A ga-eme nke a mgbe a gbasara ọmụmụ akwụkwọ n’ime izu nke January 15. Ndị nkwusa nile e mere baptism pụrụ idejupụta kaadị Advance Medical Directive/Release. Ndị nkwusa a na-emebeghị baptism, site n’iji okwu ndị sitere na kaadị a mee ihe n’ikwekọ n’ọnọdụ na nkwenye ha, pụrụ ịchọ idepụta ntụziaka nke ha. Ndị nne na nna pụrụ inyere ụmụ ha a na-emebeghị baptism aka idejupụta Identity Card ahụ.
20 min: “Bụrụnụ Ndị Na-eme Eme—Ọ Bụghị Nanị Ndị Na-anụ Anụ.” Ajụjụ na azịza. Dị ka oge nyere ohere ya, tụlee mkpa nke nrubeisi, na-adabere n’akwụkwọ Insight, Mpịakọta nke 2, peji nke 521, paragraf nke 1 na 2.
Abụ 70 (39) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite January 15
Abụ 77 (41)
12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Nye ịja ama kwesịrị ekwesị maka nkwado ego nke ọrụ ọgbakọ na nke zuru ụwa ọnụ nke ịhụ na e kwusara ozi ọma ahụ.
15 min: Mkpa ọgbakọ. (Ma ọ bụ “Chebe Echiche nke Ịdị Ngwa Gị,” okwu dabeere n’Ụlọ Nche, October 1, 1995, peji nke 25-28.)
18 min: “Laghachi Iji Zọpụta Ụfọdụ.” Tụlee ụzọ ijekwu ndị mmadụ a tụrụ aro ha. Wepụta ihe mgbaru ọsọ nke ịmalite ọmụmụ ihe n’akwụkwọ ọhụrụ ahụ, bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi.
Abụ 156 (68) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite January 22
Abụ 200 (108)
5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
20 min: “Rite Uru Site n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 1996—Akụkụ 1.” Okwu onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekwu. Tụlee ntụziaka ndị e nyere maka ihe omume ndị mmụta ná ntụziaka Maka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, nke pụtara n’Ozi Alaeze Anyị nke December 1995.
20 min: “Jiri Obi Ike Kwuo Okwu.” Okwu na mkparịta ụka nke onye okenye ga-eme. Tụlee ndokwa ije ozi na Sunday nke e nwere n’ọgbakọ. Nye ịja mma maka nkwado dị mma, tụọkwa aro n’ebe imeziwanye ihe dị mkpa.
Abụ 92 (51) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite January 29
Abụ 31 (62)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
15 min: “Ihe Mere na Òkè nke Onye Mkpesa Abụghị nke Obi Ụtọ.” Ntụle nke isiokwu dị n’Ụlọ Nche nke March 15, 1993, peji nke 19-22. E kwesịrị ịtụlezu isiokwu ahụ nke ọma. Gosipụta site n’isiokwu ahụ ụzọ kwesịrị ekwesị a ga-agbaso n’ịhụ maka mkpesa ndị kwesịrị ekwesị. Ndị okenye kwesịrị ịmụrụ anya ma leruo anya ngwa ngwa ná mkpesa ndị siri ike. Kọwaa echiche Chineke maka ndị mkpesa na otú ụzọ ahụ pụrụ isi bụrụ ihe ize ndụ nye ndị mmadụ n’otu n’otu na nye ọgbakọ. Gbaa mmadụ nile ume ịrụsi ọrụ ike imeri mmụọ nke mkpesa. Mesie ike uru nke izere mmụọ na-egbu egbu nke ime mkpesa banyere òkè anyị ná ndụ. E kwesịrị ịgụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị metụtara isi ihe dị iche iche ma jiri ha kwuo okwu.
20 min: Nyefee Akwụkwọ Mmezu Mkpughe n’Ọnwa February. Kọwaa ihe mere e ji ele akwụkwọ Mkpughe anya eri ogologo oge dị ka ihe omimi anyị na-apụghị ịghọtali. Tụlee paragraf nke 6-9 na peji nke 8, na-egosi ihe mere akwụkwọ a ji dị mkpa. Gbaa ndị nkwusa ume iburu echiche ndị a n’uche ka ha wee nwee ebe mgbakwasị ụkwụ maka ihe ndị a ga-eji kwuo okwu n’ọnụ ụzọ. Zoo aka ‘n’Otú E Si Hazie Akwụkwọ Mkpughe’ nke dị na peji nke 98-99, gosikwa otú a pụrụ isi jiri nke a nye nkọwa elu elu zuru ezu nke akwụkwọ Mkpughe. Dọrọ uche gaa n’ihe osise ndị mara mma na peji ndị mbụ na ndị ikpeazụ na ụzọ a pụrụ isi jiri ha malite mkparịta ụka. Chetara mmadụ nile iwere ụfọdụ iji ha mee ihe n’ozi ná ngwụsị izu a.
Abụ 143 (76) na ekpere mmechi.