Ṅomienụ Okwukwe Ha
1 Pọl onyeozi kọwara okwukwe dị ka “ndabere nke ihe a na-ele anya, bụrụkwa nnwapụta nke ihe a na-ahụghị anya.” O kwukwara na “a sị na okwukwe adịghị ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ́ ime ihe ga-atọ Chineke ezi ụtọ.” (Hib. 11:1, 6) Pọl gbara anyị ume igosi okwukwe, ijubiga ókè n’ime ya, na ịgbaso ya.—2 Kọr. 4:13; Kọl. 2:7; 2 Tim. 2:22.
2 E nwere ọtụtụ ihe nlereanya ndị pụtara ìhè nke okwukwe a kọrọ n’ime Bible. Ná Ndị Hibru isi 11, Pọl na-enye ndepụta dị ogologo nke ndị àmà gosiri okwukwe a na-apụghị imebi emebi. Ebel, bụ́ onye mbụ e gburu n’ihi okwukwe ya, so ná ndepụta nke a. E depụtara Noa n’ihi na site n’okwukwe ya, o gosiri egwu Chineke dị mkpa iji zọpụta ezinụlọ ya. A jara Abraham mma n’ihi okwukwe na nrubeisi ya. E toro Mosis n’ihi na site n’okwukwe ya ọ nọgidesiri ike dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ nke a na-apụghị ịhụ ya anya. Ndepụta nke ihe nlereanya ndị ahụ toro ogologo nke na Pọl sịrị na oge ga-agwụnarị ya ma ọ bụrụ na ya agaa n’ihu ịkọ ha nile. Lee ekele anyị nwere na anyị pụrụ iwusi okwukwe anyị ike site n’ịtụleghachi ‘ibi obi nsọ nile na nsọpụrụ Chineke nile’ ha!—2 Pita 3:11.
3 Na narị afọ mbụ, Jisọs jụrụ ajụjụ, sị: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa, Ọ̀ ga-ahụ okwukwe n’elu ụwa?” (Luk 18:8) Ọ dị mma, mgbe ahụ ànyị nwere ihe nlereanya nke okwukwe n’etiti anyị taa? Ànyị na-ahụ ndị ikom na ndị inyom, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, ka ha na-egosi okwukwe na-apụghị ịma jijiji n’ebe Jehova nọ, dị ka ọ dị banyere ndị Chineke n’oge Bible?
4 Ihe Nlereanya Okwukwe Ndị nke Oge A: A ga-ahụ ihe nlereanya ndị pụtara ìhè nke okwukwe ka ha gbara anyị gburugburu! Okwukwe nke ndị nlekọta na-edu ndú n’etiti anyị kwesịrị nṅomi. (Hib. 13:7) Ma ọ bụghị nanị ndị a kwesịrị nlereanya n’okwukwe. E nwere ndị na-eguzosi ike n’ihe nọ n’ọgbakọ ọ bụla, bụ́ ndị jewooro Jehova ozi ruo ogologo oge, bụ́ nke a na-eje ọtụtụ mgbe n’okpuru ọnọdụ ndị siri oké ike.
5 Anyị aghaghị igosi mmasị n’ebe ụmụnna anyị ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi nọ, ndị tachiworo obi ná mmegide sitere n’aka ndị di na-emegide emegide ruo ọtụtụ afọ. Ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ aghaghị iche ihe ịma aka nke nanị ha ịzụlite ụmụ ihu. E nwere ndị agadi di ha nwụrụ n’etiti anyị bụ́ ndị na-anọ ya mgbe nile n’ọrụ dị iche iche nke ọgbakọ n’agbanyeghị na ha nwere ike ghara inwe ezinụlọ ga-enyere ha aka. (Tụlee Luk 2:37.) Anyị na-enwe ijuanya n’okwukwe nke ndị na-atachi obi ná nsogbu ahụ ike siri ike. Ọtụtụ nọgidere na-eje ozi n’agbanyeghị na ha nwere erughị eru ndị na-egbochi ha ịbụ ndị e kenyere ihe ùgwù ije ozi ndị ọzọ. E nwere Ndịàmà na-eto eto ndị jiworo obi ike gosi okwukwe n’agbanyeghị mmegide n’ụlọ akwụkwọ. Nsọpụrụ Chineke anyị na-esiwanye ike ka anyị na-ahụ ndị ọsụ ụzọ kwesịrị ntụkwasị obi ndị na-anọgidesi ike site n’afọ ruo n’afọ n’agbanyeghị nsogbu ndị siri oké ike. Dị nnọọ ka Pọl, oge ga-agwụnarị anyị ma ọ bụrụ na anyị anwaa ịkọ ahụmahụ nile dị n’ije ozi Alaeze na ọrụ okwukwe nke ụmụnna ndị ikom na ndị inyom ndị a rụworo!
6 Ihe nlereanya ndị a kwesịrị ntụkwasị obi na-akasi anyị obi, na-agbakwa anyị ume. (1 Tesa. 3:7, 8) Anyị ga-eme nke ọma iṅomi okwukwe ha n’ihi na “ndị ji eziokwu eme ihe bụ ndị ihe ha na-atọ [Jehova] ụtọ.”—Ilu 12:22.