Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/98 p. 1
  • Anyị Aghaghị Ịga Ugboro Ugboro

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Anyị Aghaghị Ịga Ugboro Ugboro
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Anyị Arụọla Ókèala Anyị Ọtụtụ Ugboro!”
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Anọgide Na-alaghachi?
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Ihe Mere Anyị Ji Agaghachi Ugboro Ugboro
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Olee Otú Ha Ga-esi Anụ?
    Ozi Alaeze Anyi—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 12/98 p. 1

Anyị Aghaghị Ịga Ugboro Ugboro

1 Ị̀ ṅara ntị mgbe mbụ mmadụ gwara gị okwu banyere ozi ọma ahụ? Ọ bụrụ na ị ṅaghị ntị, ị ghaghị inwe ekele na Ndịàmà Jehova bịara ugboro ugboro ruo mgbe i mesịrị kwere ka e duziere gị ọmụmụ Bible. Ọ dị mma ịdị na-eche banyere nke ahụ mgbe ị na-arụ ókèala e kenyere gị ugboro ugboro.

2 Ndụ ndị mmadụ na-agbanwe agbanwe mgbe nile. Ha na-eche nsogbu ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọhụrụ ihu, na-anụ banyere ihe omume ndị na-akpata nchegbu na-eme n’ógbè ma ọ bụ n’ụwa, na-enwe ndọghachi azụ n’ụzọ akụ̀ na ụba, ma ọ bụ na-enwe ọrịa ma ọ bụ ọnwụ mmadụ n’ezinụlọ ha. Ihe ndị dị otú ahụ pụrụ ime ka ha chọọ ịmata ihe kpatara nsogbu ndị a. Anyị aghaghị ịghọta ihe ndị na-akpatara ndị mmadụ obi erughị ala ma jiri ozi na-enye nkasị obi jekwuru ha.

3 Ihe A Bụ Ọrụ Nnapụta: Chee echiche banyere ndị ọrụ nnapụta n’ebe e nwere ọdachi. Ọ bụ ezie na ụfọdụ pụrụ ịdị na-achọgharị ndị mmadụ n’ebe a na-achọta mmadụ ole na ole dị ndụ, ha adịghị adala azụ wee kwụsị n’ihi na ndị ọrụ ibe ha nọ n’ebe ọzọ na-achọta ndị dị ndụ karị. Ọrụ nnapụta anyị na-arụ akwụsịbeghị. Kwa afọ, a na-achọta ọtụtụ narị puku mmadụ ndị chọrọ ịlanarị ‘oké mkpagbu ahụ.’—Mkpu. 7:9, 14.

4 “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya.” (Rom 10:13-15) Okwu ndị a kwesịrị ime ka onye ọ bụla n’ime anyị mata mkpa ọ dị ịnọgide na-eme nkwusa. Eri oge mbụ a malitere ịrụzu ókèala anyị, ụmụaka etowo ma ruo ogo ichere onwe ha echiche ugbu a banyere ọdịnihu ha na nzube nke ndụ. Ọ dịghị ụzọ anyị pụrụ isi mara onye ga-emesịa gee ntị. (Ekli. 11:6) Ọtụtụ ndị bụbu ndị mmegide anatawo eziokwu ahụ. Ọrụ anyị abụghị ikpe ndị mmadụ ikpe, kama ịnọgide na-enye ha ohere ịnụrụ na ịbụ ndị e si n’ụwa ochie a napụta. Dị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs nke oge mbụ mere, anyị aghaghị ‘ịnọgide na-ejekwuru’ ndị mmadụ ma gbalịa ịkpali mmasị ha n’ozi Alaeze ahụ.—Mat. 10:6, 7.

5 Eziokwu ahụ bụ́ na ohere ka dịịrị anyị ime nkwusa bụ ngosipụta nke ebere Jehova. (2 Pita 3:9) Ka anyị na-enye ndị ọzọ ohere ịnụ ozi ahụ ugboro ugboro, anyị na-eme ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè, n’ụzọ dịkwa otú a anyị na-enye ya otuto.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya