Kpọọ Ha Òkù Ka Ha Bịa
1 A na-akpọsa ugbu a otu òkù a kpọrọ ọtụtụ narị afọ gara aga n’ala 233 n’ụwa nile: “Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova, . . . Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfoḍụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ Ya nile.” (Aịsa. 2:3) Iduzi ndị mmadụ gaa ná nzukọ Jehova bụ otu n’ime ụzọ kasị mma anyị pụrụ isi nyere ha aka inwe ọganihu ime mmụọ nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi.
2 Ndị nkwusa ụfọdụ pụrụ ịlatụ azụ n’ịkpọ ndị mmadụ òkù ịbịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ruo mgbe ha nwere ọganihu pụtara ìhè n’ọmụmụ Bible ebe obibi. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ ndị mmadụ na-amalite ịga nzukọ ọgbakọ ọbụna tupu a malitere ha ọmụmụ Bible. Anyị ekwesịghị igbu oge n’ịkpọ ndị mmadụ òkù n’ụzọ na-ekpo ọkụ na ịgba ha ume ịbịa nzukọ.
3 Ihe A Ga-eme: Jiri mpempe akwụkwọ ịkpọ òkù mee ihe n’ụzọ dị mma iji gwa ndị mmadụ banyere nzukọ ọgbakọ anyị. Kwuo na nzukọ ndị ahụ bụ n’efu na a dịghịkwa ana ụtụ. Kọwaa otú e si eduzi nzukọ ndị ahụ. Kọwapụta na ha bụ usoro ọmụmụ Bible n’ezie nakwa na a na-enwe akwụkwọ a na-amụ ka mmadụ nile wee na-esonye. Dọrọ uche gaa n’ụdị ndị dị iche iche na-abịanụ na ọkwá ha ná ndụ. Kwuo na ha bụ ndị si n’ógbè ahụ nakwa na ụmụaka nọ n’afọ ndụ nile nweere onwe ha ịbịa. Anyị kwesịrị ịkpọ ndị anyị na-amụrụ ihe òkù, na-ekwe nkwa inyere ha aka n’ụzọ ọ bụla iji bịa.
4 Otu n’ime ihe ndị ikpeazụ e dekọrọ na Bible bụ ọkpụkpọ òkù na-ekpo ọkụ ikere òkè ná ndokwa Jehova maka ndụ: “Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asịkwa, Bịa. . . . Onye akpịrị na-akpọkwa nkụ, ya bịa: onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpu. 22:17) Ọ dịghị ihe ga-anọchi anya ịkpọ ndị ọzọ òkù ịbịa nzukọ anyị.
5 N’ụzọ amụma, Aịsaịa 60:8 na-egosi ọtụtụ narị puku ndị ọhụrụ na-enye otuto na-abata ugbu a n’ọgbakọ ndị Chineke dị ka nduru “na-efe efe dị ka igwe ojii, ndị na-efekwa dị ka nduru si efe ruo windo ha.” Anyị nile pụrụ ịkpọ ndị ọhụrụ òkù ịbịa nzukọ anyị na ime ka ahụ ruo ha ala. N’ụzọ dị otú a, anyị ga-eso Jehova na-arụkọ ọrụ ka ọ na-eme ka ọrụ nchịkọta ahụ na-aga ọsọ ọsọ.—Aịsa. 60:22.