Igbe Ajụjụ
◼ Olee akwụkwọ anyị kwesịrị isoro ndị ọhụrụ mụọ tupu e mee ha baptism?
Tupu mmadụ enwee ike ịrara ndụ ya nye Jehova, e meekwa ya baptism, ọ ghaghị inwe ezi ihe ọmụma. (Jọn 17:3) Ọ ga-enweta ihe ọmụma dị ya mkpa site n’ịmụ ma broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. N’ihe ka n’ọtụtụ ọnọdụ a ga-ebu ụzọ mụọ broshuọ Na-achọ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na e ji akwụkwọ Ihe Ọmụma malite ọmụmụ ihe ahụ, e kwesịrị ịmụ broshuọ Na-achọ mgbe a mụsịrị akwụkwọ ahụ. N’ihi gịnị ka nke a ji dị mkpa?
Broshuọ Na-achọ na-enye nchịkọta nke ozizi ndị bụ́ isi nke Bible. Ọ bụrụ na e buru ụzọ mụọ ya, ọ ga-eme ka onye a na-amụrụ ihe nwee nghọta bụ́ isi nke ihe ndị a chọrọ iji mee ihe na-atọ Jehova ụtọ. Ọ bụrụ na a mụọ ya n’ikpeazụ, ọ ga-abụ ntụleghachi dị mma nke ihe ndị a mụrụ n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. N’ọnọdụ nke ọ bụla, gbaa onye ahụ a na-amụrụ ihe ume ịgụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-akwado ihe a na-ekwu na ịtụgharị uche na ha. Jide n’aka ịkọwa ihe osise ha, ebe ha bụ ihe izi ihe ndị dị irè.—Lee Ụlọ Nche, January 15, 1997, peji nke 16-17.
Ozugbo onye a na-amụrụ Bible mụsịrị akwụkwọ abụọ ahụ, ọ pụrụ inwe ike ịza ajụjụ nile ndị okenye ga-eso ya tụlee n’ịkwadebe maka baptism. Ọ bụrụ otú ahụ, o nwere ike ọ gaghị adị mkpa iji akwụkwọ ọzọ duziere ya ọmụmụ ihe, ọ bụ ezie na onye na-amụrụ ya ihe ga-anọgide na-enwe ezi mmasị n’ọganihu ya.—Lee Ụlọ Nche, January 15, 1996, peji nke 14, 17.
N’aka nke ọzọ, a pụrụ ikwe ka onye a na-amụrụ ihe nke na-agụghị akwụkwọ nke ọma mee baptism mgbe ọ mụsịrị broshuọ Na-achọ, ọ bụrụgodị na ọ mụchabeghị akwukwọ Ihe Ọmụma. Otú ọ dị, o kwesịrị ịmụta eziokwu ahụ nke ọma iji nwee ike ghọta ma zaa ajụjụ ndị dị ná ngwụsị nke akwụkwọ Ozi Anyị maka ndị chọrọ ka e mee ha baptism. Mgbe ọ dị otú ahụ, e kwesịrị ịga n’ihu n’ọmụmụ ihe a haziri ahazi nke akwụkwọ Ihe Ọmụma ruo mgbe a mụsịrị ya ọ bụrụgodị na e mesịwo ya baptism.