Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-eme Okwu Chineke” nke Ndịàmà Jehova nke 2000
1 “M ga-ekele Gị n’etiti mkpọkọta bara ụba: n’etiti otu ndị nwere ume ka m ga-eto Gị.” (Abụ Ọma 35:18) Chee banyere ụdị obi ụtọ Devid gaara enwe taa ịhụ ọtụtụ puku mmadụ ka ha na-abịakọta ọnụ n’udo ná mgbakọ anyị iji nara ntụziaka sitere n’aka Chineke! Ì so na mmadụ 519,613 gara otu n’ime Mgbakọ Distrikti “Okwu Amụma nke Chineke”? Malite ná ngwụsị October 1999 ruo ná mmalite January 2000, e nwere ngụkọta nke mgbakọ distrikti 110 n’obodo 22 n’ime Nigeria. Mgbakọ distrikti anyị na 2000 ga-enye anyị ohere ọhụrụ isoro ndị ibe anyị na-eto Jehova gbakọta bụ́ ndị “maara mkpa nke ime mmụọ ha,” bụ́kwa ndị nwere obi ụtọ na oké mmasị ‘ịnụ ihe mmụọ nsọ na-agwa nzukọ Kraịst.’—Mat. 5:3, NW; Mkpu. 2:29.
2 Ntụziaka Maka Inweta Ebe Obibi: Anyị ga-agba mbọ inye ọgbakọ ọ bụla ọnụ ọgụgụ fọm Room Request ga-ezuru ha. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na e dejupụtara fọm Room Request nke ọ bụla e zigara nke ọma. EDELA nanị ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa chọrọ ebe obibi, dị ka “ndị nkwusa 50,” n’ohere e kwesịrị ide aha ndị a. A ghaghị idepụta ihe ọmụma nile nke ọma na n’ụzọ ga-ekwe ọgụgụ. Biko jidenụ n’aka na unu nyere ihe ọmụma zuru ezu banyere aha, afọ ndụ, nwoke ka ọ̀ bụ nwanyị, na ma onye ahụ na-etinye akwụkwọ maka ebe obibi ọ̀ bụ onye ọsụ ụzọ ka ọ̀ bụ onye nkwusa ọgbakọ. Denye aha ụmụaka ná ndepụta ahụ. N’oge ndị gara aga, ọgbakọ ụfọdụ depụtara nanị aha ndị toworo eto. Nke a na-eme ka o sie ike ime ndokwa maka ebe obibi zuru ezu. Ọ bụrụ na unu chọrọ ohere karịa nke e nyere na fọm ahụ, jirinụ mpempe akwụkwọ ọzọ mee ihe. Ọ bụrụ na e dere ihe karịrị aha otu onye na fọm ahụ, biko gosipụta ihe jikọrọ ndị ahụ na-etinye akwụkwọ maka ebe obibi n’ohere kwesịrị ekwesị. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na e dejupụtara fọm Room Request ahụ n’ụzọ ziri ezi tupu ọ na-ezipụrụ ya Ngalaba Ụlọ Obibi nke Mgbakọ.
3 Kwa afọ, anyị na-arịọ ụmụnna ka ha nye Ngalaba Ụlọ Obibi nke Mgbakọ nkwado. Ma ọ dịghị ihe ọzọ, a na-emezu ihe abụọ site n’ịṅa ntị ná ntụziaka a:
4 Ọ na-echekwara ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị ego: Mgbe anyị kwadoro ndokwa Society, ọnụ ahịa ụlọ na-adịrị ụmụnna anyị ala karị. Kama ego anyị ịga n’aka ndị nwe ụlọ, a pụrụ iji ya mee ihe ndị ka mma n’ịkwado ezinụlọ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị na ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ. Ọ bụrụgodị na anyị onwe anyị pụrụ ịkwụ ụgwọ maka ebe obibi ndị dị oké ọnụ karị, anyị kwesịrị ịkwado mgbalị nke Ngalaba Ụlọ Obibi na-eme. A kọwara mmụọ nke ichebara ndị ọzọ echiche dị otú a na 1 Jọn 3:17, ọ bụkwa ụkpụrụ dị ná 1 Ndị Kọrint 10:24.
5 Ọ na-egosipụta nrubeisi nye ntụzi Society: Nke a kwesịrị ịbụ otu n’ime isi nchegbu anyị. Ndị Hibru 13:17 na-asị: “[Na-ekwenyerenụ] ndị isi unu, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha: n’ihi na ndị ahụ na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi unu, dị ka ndị ga-aza ajụjụ banyere unu; ka ha wee were ọṅụ mee nke a, ghara ịsụ ude: n’ihi na nke a ga-abụ ihe [na-abaghịrị] unu uru.” Ka ụmụnna anyị na-eme ọtụtụ ndokwa maka mgbakọ distrikti anyị, anyị chọrọ ka ha nwee mmetụta na anyị na-akwado ha n’ụzọ zuru ezu. Ebe ọ bụ na a na-achọ nkwado anyị n’okwu a nanị maka ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ kwa afọ, nke a bụ ụzọ dị mma isi kwado mgbalị ha. Ọ bụrụgodị na ihe ga-amasị anyị dị iche, ezi ihe nlereanya anyị, dị ka ụmụnna anyị na ụwa si na-ahụ ya, na-akwalite mmụọ ịhụnanya, nke ịdị n’otu, na nke inye nkwado.—Fil. 2:1-4.
6 Mkpa Ndị Pụrụ Iche: Ndokwa a bụ nanị maka ndị chọrọ enyemaka pụrụ iche site n’aka ndị ọzọ n’ime ndokwa ha maka mgbakọ, karịsịa ndokwa maka ebe obibi. Ha pụkwara ịchọ enyemaka n’ụzọ ndị ọzọ, na-adabere n’ọnọdụ ha ndị pụrụ iche. Ọ bụ nanị ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ tinyere ụmụ ha na-akpa ezi àgwà, bụ́ ndị nwere mkpa pụrụ iche, bụ́kwa ndị Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwadoro, ruru eru inweta enyemaka ná ndokwa nke Mkpa Ndị Pụrụ Iche. Ndokwa ndị ọzọ iji lekọta ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche kwesịrị ka ọgbakọ ebe ha na-eje nzukọ mee ya, kama ịtụkwasị ibu ọrụ a n’isi ndị nhazi mgbakọ. Ndị okenye na ndị ọzọ maara banyere ọnọdụ onye ahụ pụrụ iji ịhụnanya nye aka. Nke a na-achọkarị ka ndị nkwusa tụlee mkpa nke ndị nọ n’ozi oge nile, ndị agadi, ndị ahụ na-esichaghị ike, na ma eleghị anya ndị ọzọ. Ndị nkwusa pụrụ inye aka site n’ịkpọrọ ndị dị otú ahụ ma ọ bụ site n’igbo mkpa ha n’ụzọ ndị ọzọ dị irè.—Jes. 2:15-17; 1 Jọn 3:17, 18.
7 N’ezie, Ngalaba Ụlọ Obibi ga-agba mbọ inye ndị nkwusa nwere mkpa ndị pụrụ iche ụlọ obibi ndị kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na ndị nọ n’ọgbakọ apụghị inyere ha aka. Ndị nkwusa a pụrụ isoro odeakwụkwọ ọgbakọ kwurịta ọnọdụ ha. Odeakwụkwọ kwesịrị isoro Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwurịta okwu iji hụ ma ọ̀ ga-ekwe ọgbakọ mee inyere ndị a aka ịhụ maka ụlọ obibi nke ha. Ọ bụrụ na ọgbakọ enweghị ike inye enyemaka dị mkpa, odeakwụkwọ pụrụ inye ndị dị otú ahụ otu fọm Room Request bụ́ nke o dekwasịworo n’ụzọ doro anya, n’elu peji nke mbụ, okwu ndị bụ́ “MKPA NDỊ PỤRỤ ICHE.” Ọ bụ nanị ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche kwesịrị idejupụta fọm a e dekwasịrị ihe n’ụzọ pụrụ iche. Ọ bụ onye ahụ na-achọ ka e nye ya ụlọ ga-edejupụta ya. E kwesịrị iweghachiri ya odeakwụkwọ, bụ́ onye ga-eleru ya anya iji hụ na e denyezuru ihe nile a chọrọ, na o ziri ezi, ma nwapụta ọnọdụ ndị mere ka onye ahụ ruo eruo maka nchebara echiche dị otú ahụ. Odeakwụkwọ GA-AKỌWA N’ỤZỌ ZURU EZU ọnọdụ ndị ahụ n’ohere e nyere n’azụ fọm ahụ. E kwesịrị ime ihe a nile n’ezi oge tupu mgbakọ eruo. Odeakwụkwọ ga-ezipụziri Ngalaba Ụlọ Obibi fọm ahụ. A ga-eme ka onye ahụ na-achọ ka e nye ya ụlọ kpọmkwem mara banyere ụlọ ahụ.
8 Ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche EKWESỊGHỊ ịga ná mgbakọ ma rịọ ka e nye ha ụlọ mgbe ha rutere, n’ihi na Ngalaba Ụlọ Obibi aghaghị inweta nnwapụta nke Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ.
9 Ọtụtụ ndị egosipụtawo ekele maka ndokwa ndị a na-eme maka ụlọ obibi n’oge mgbakọ. Ì so nwee ekele maka ọtụtụ ndokwa ndị e mere maka gị? Obi dị Society ụtọ inye ebe obibi ndị dị ntụsara ahụ, ndị aka pụrụ iru n’oge mgbakọ, na-enye anyị nile ohere itinye uche n’abamuru ime mmụọ nke mgbakọ ahụ na n’usoro ihe omume ya.
10 Ije Mgbakọ Ọzọ: A na-ekenye ọgbakọ ọ bụla mgbakọ kasị ya nso. Dabere n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa e kenyere ịga mgbakọ nke ọ bụla, Society na-eme atụmatụ ọnụ ọgụgụ ndị ga-abịa iji dokwaa maka oche, ụlọ, akwụkwọ na ihe ndị ọzọ ga-ezunụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na e nwere ezi ihe mere ị ga-eji gaa mgbakọ na-abụghị nke e kenyere gị ma chọọ ka e nye gị ụlọ, odeakwụkwọ ọgbakọ pụrụ inye gị otu fọm Room Request. Ị pụrụ idejupụta ya ma nye ya odeakwụkwọ ka ọ bịanye aka tupu i ziga ya ná mgbakọ nke ị chọrọ ịga.
11 Asụsụ Ogbi Maka Ndị Ntị Chiri: A ga-eme ndokwa ka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ruru eru sụgharịa usoro ihe omume nile n’Ụdị Asụsụ Ogbi nke America ná mgbakọ ndị na-esonụ: Ota 2, November 3-5, 2000; Kaduna 4, November 17-19, 2000; Uli 7, December 8-10, 2000; na Ubogo 9, January 5-7, 2001. A na-agba ndị ntị chiri nọ n’ọgbakọ nile na Nigeria ume ịmalite mewe atụmatụ ịga ma ọ dịkarịa ala otu n’ime mgbakọ ndị a. Ndị okenye kwesịrị ịgba mbọ iji jụọ onye ọ bụla ntị chiri nọ n’ọgbakọ ha bụ́ onye na-aghọta Ụdị Asụsụ Ogbi nke America iji jide n’aka na ha maara banyere ndokwa a na iji chọpụta ma hà ga-achọ enyemaka ọ bụla ka ha wee nwee ike ịga.
12 Ọ bụ nanị mgbakọ ndị a ga-enwe akụkụ dị iche e doweere ndị ntị chiri oche bụ́ ndị a ga-atụgharịrị usoro ihe omume ahụ n’asụsụ ogbi. A gaghị eme ndokwa maka ịtụgharị okwu n’asụsụ ogbi ná mgbakọ ọ bụla ọzọ. Ọ bụrụ na onye ntị chiri esoro onye ma asụ asụsụ ogbi jee mgbakọ ọ bụla ọzọ, a ga-ekwe ka a na-atụgharịrị nanị onye ahụ, mmadụ abụọ ahụ anọdewe onwe ha, ọ bụghị iguzo n’ihu otu onye ma ọ bụ karị.
13 Chekwaa Ego Maka Mgbakọ Ahụ: Tinyere ndokwa ndị ọzọ, UGBU A bụ oge a ga-amalite ichekwawa ego maka mgbakọ distrikti ahụ. Ụfọdụ bi n’ebe dịtụ anya site n’ebe a ga-enwe mgbakọ. Ọzọ, ụfọdụ nwere ezinụlọ ndị buru ibu. Ego dị ndị a, nakwa anyị nile mkpa maka inye onyinye, ịgba ụgbọ, iri ihe ná mgbakọ ahụ, na ihe ndị ọzọ pụrụ ịdapụta. Ọ dị ndị nwere ezinụlọ buru ibu mkpa ime atụmatụ tupu oge eruo na ichekwa ego ga-ezunụ ka ezinụlọ ahụ nile wee nwee ike ịga mgbakọ ahụ. Ụzọ dị irè pụrụ ịbụ ime atụmatụ maka ego nile a ga-achọ. Ọ bụ ihe amamihe imenye atụmatụ maka ịrị elu nke ọnụ ahịa ihe mgbe ị na-eme atụmatụ gị. Jiri ọnụ ọgụgụ ọnwa ndị dị site n’ugbu a ruo mgbe unu ga-enwe mgbakọ distrikti kee ego ole e mere atụmatụ ya. Nke a bụ ego ole dị gị mkpa ichekwa kwa ọnwa. Kwa ọnwa, mee ka ọ bụrụ iwu na ị ga-ebu ụzọ wepụ ego a iche dị ka ego mgbakọ. A pụrụ ịdị na-etinye nke a n’obere igbe ma ọ bụ envelopu. Otú ọ dị, a pụrụ ike ego ahụ a na-echekwa kwa ọnwa ụzọ anọ ma na-ewepụ ya iche kwa izu. Ihe dị mkpa bụ na i kwesịghị ichere ruo mgbe ọ fọrọ otu ọnwa ma ọ bụ abụọ ka mgbakọ malite tupu i chekwawa ego maka njem a a na-eme mgbe nile kwa afọ.—Ilu 21:5.
14 Mee Ndokwa Ịnọ Ya n’Ụbọchị Atọ ahụ Nile: Setan ọ̀ gbalịwo ịdọpụ uche gị n’ihe ime mmụọ? N’ụzọ dị mwute, nri ime mmụọ bara uru na-akwa ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị na ezinụlọ ha. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’agaghị nnọkọ Friday nke mgbakọ ahụ. N’ọnọdụ ụfọdụ, a chọpụtawo na ntụziaka ime mmụọ na mkpakọrịta ụmụnna nke a na-enweta ná nnọkọ Friday na-akwa ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ụmụnna anyị.
15 O yiri ka ọ̀ na-esiri ụfọdụ ụmụnna ike ịgakwuru ndị were ha n’ọrụ ịrịọ ka e nye ha oge maka ịga mgbakọ. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị? Gịnị ma i kpegara Jehova ekpere banyere nsogbu ahụ ma were obi ike kọwaara onye were gị n’ọrụ ọnọdụ gị? Cheta ezi ihe ọ rụpụtaara Nehemaịa, bụ́ onye nọ n’ọnọdụ yiri nke ahụ. (Neh. 2:1–6) Ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ nke aka gị, dịrị njikere ime ihe ọ bụla dị mkpa iji jezuo ụbọchị atọ ahụ nile. Nwee okwukwe n’ịdị njikere nke Nna anyị nke eluigwe inyere gị aka, na-amata na ọ bụrụ na i buru ụzọ chọọ ọdịmma nke Alaeze ya, ọ ga-enye gị ihe ndị dị mkpa ná ndụ.—Mat. 6:32b, 33.
16 Olee Otú Mgbakọ Anyị Si Emetụta Gị? Otu nwanna nwanyị gara otu n’ime mgbakọ ndị ahụ, dere sị: “Unu emeela nke ukwuu maka mgbakọ distrikti nke 1999. Isoro ụmụnna, bụ́ ndị m na-ahụ nanị otu ugboro n’afọ kpakọrịta na-enye m ọṅụ dị ukwuu. Anụrụ m eziokwu ahụ mgbe m bụ onye nọ n’afọ iri na ụma dị ime, ma m ka ji oké mmasị na-echeta mgbe onye na-eduziri m ọmụmụ Bible kpọọrọ m gaa mgbakọ mbụ m gara. Elegharịrị m anya gburugburu m n’ụlọ mgbakọ ahụ ka anyị na-abụ abụ Alaeze bụ́ ‘Ọtụtụ Ìgwè Ụmụnna,’ ebere m ákwá. ‘Ebe ọ bụ na e nwere mmadụ nile a mara mma gbara m gburugburu,’ ka m jụrụ onwe m, ‘olee otú Jehova ga-esi nwee mmasị n’ebe m nọ?’ N’ụbọchị ahụ, ekpebiri m ijere Jehova ozi n’ụzọ zuru ezu.” Lee ihe na-enye obi ụtọ ọ bụ! Ọ bụ nnọọ ihe na-enye obi ụtọ isoro ndị Jehova dị ọcha na-akpakọrịta, ọ̀ bụ na ọ bụghị?
17 Mgbakọ distrikti anyị na-enwe kwa afọ dị anyị mkpa ná ngwụsị mgbe ikpeazụ a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ọ bụ ndokwa sitere n’aka Jehova iji nọgide na-enwe ahụ ike ime mmụọ na nguzosi ike. N’ihi ya, kpebie ịgazu ụbọchị atọ nile nke Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-eme Okwu Chineke” nke afọ a. Olee otú ị pụrụ isi mezuo ihe i kpebiri? Gwa onye were gị n’ọrụ tupu oge eruo ka o nye gị ohere ka ị hapụ ọrụ iji gazuo mgbakọ ahụ nile. Ọ bụrụ na ego ị na-enweta ebughị ibu, malite ugbu a chekwawa ego ị chọrọ iji gaa. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka imeri ihe mgbochi ọ bụla. Ka ị na-eme otú ahụ, ị pụrụ inwe olileanya nke inweta ọṅụ ná mkpakọrịta na-enye obi ụtọ nke ụmụnna gị ndị nwoke na ụmụnna gị ndị nwanyị nakwa ịnụ okwu na-enye ndụ ebighị ebi site n’ọnụ Nna anyị na-ahụ n’anya nke eluigwe bụ́ Jehova.—Tụlee Jọn 6:68.
[Okwu Dịịrị Òtù Ndị Okenye: Ozugbo unu natara ihe ntinye a, biko maanụ n’ọkwa ná Nzukọ Ije Ozi nke so ya, nakwa n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ga-esochinụ, ebe na ụbọchị Society kenyere ọgbakọ unu. Ọ ga-adị mma ịka akara n’okpuru ebe na ụbọchị ndị e kenyere ọgbakọ unu ma mapawa akụkụ ihe ntinye ahụ na bọọdụ ịma ọkwa.
Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ime ihe omume na ịma ọkwa ndị metụtara mgbakọ ná nzukọ ndị a ga-enwe n’ọdịnihu. Ndị okenye nile ga-achọ inye nkwado zuru ezu iji hụ na e mere ihe ọsọ ọsọ, n’ịnụ ọkụ n’obi, nakwa n’ụzọ dị irè banyere ihe ndị metụtara mgbakọ.]
Igbe dị na peeji nke 3]
Oge Ihe Omume
Friday: 9:20 ụtụtụ – 4:40 uhuruchi
Saturday: 9:00 ụtụtụ – 4:20 uhuruchi
Sunday: 9:00 ụtụtụ – 3:20 ehihie