Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-ezi Okwu Chineke” nke Ndịàmà Jehova nke 2001
1 Aịsaịa onye amụma kọwara Jehova dị ka Onye Nkụzi Ukwu, bụ́ onye na-agba ume dị ka nna, sị: “Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya.” (Aịsa. 30:20, 21) Ma olee otú anyị si anụ ihe Jehova na-ekwu maka abamuru anyị? Jehova na-agwa ndị ya okwu site na Bible nakwa site n’akwụkwọ ndị dabeere na Bible, nzukọ, ihe omume sekit, na mgbakọ distrikti ndị “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” na-edokwa. (Mat. 24:45) Anyị pụrụ inwe ekele nye Jehova na ọ nọgidere na-eduzi anyị n’ụzọ anyị ga-ejeso.
2 Kwa afọ, mgbakọ distrikti na-enye anyị ohere isoro ndị kwere ekwe ibe anyị zukọta ma ṅaa ntị nke ọma ná ntụziaka Jehova. N’afọ gara aga, mmadụ 576,874 gara Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-eme Okwu Chineke,” bụ́ nke nyere ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ. Na 2001, a ga-enwe ná mba a dum Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-ezi Okwu Chineke,” nke ga-ewe ụbọchị atọ. Anyị maara na ị na-atụ anya ime ndokwa ịga, ya mere anyị na-enye ntụziaka ndị na-esonụ iji nyere gị aka.
3 Ntụziaka Maka Inweta Ebe Obibi: Anyị ga-agba mbọ inye ọgbakọ ọ bụla ọnụ ọgụgụ fọm Room Request ga-ezuru ha. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na e dejupụtara fọm Room Request nke ọ bụla e zigara nke ọma. EDELA nanị ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa chọrọ ebe obibi, dị ka “ndị nkwusa 50,” n’ohere ebe e kwesịrị ide aha ndị a. A ghaghị idepụta ihe ọmụma nile nke ọma na n’ụzọ ga-ekwe ọgụgụ. Biko jidenụ n’aka na unu nyere ihe ọmụma zuru ezu banyere aha, afọ ndụ, nwoke ka ọ̀ bụ nwanyị, nakwa ma onye ahụ na-etinye akwụkwọ maka ebe obibi ọ̀ bụ onye ọsụ ụzọ ka ọ̀ bụ onye nkwusa ọgbakọ. Denye aha ụmụaka n’ihe ndepụta ahụ. N’oge ndị gara aga, ọgbakọ ụfọdụ depụtara nanị aha ndị toworo eto. Nke a na-eme ka o sie ike ime ndokwa maka ebe obibi zuru ezu. Ọ bụrụ na unu chọrọ ohere karịrị nke e nyere na fọm ahụ, jirinụ mpempe akwụkwọ ọzọ dee ya. Ọ bụrụ na e depụtara ihe karịrị aha otu onye na fọm ahụ, biko gosipụta ihe jikọrọ ndị ahụ na-etinye akwụkwọ maka ebe obibi n’ohere kwesịrị ekwesị. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na e dejupụtara fọm Room Request ahụ n’ụzọ ziri ezi tupu ọ na-ezipụrụ ya Ngalaba Ụlọ Obibi nke mgbakọ. E kwesịrị izipụ fọm ahụ n’ezigbo oge tupu mgbakọ eruo.
4 Kwa afọ, anyị na-arịọ ụmụnna ka ha nye Ngalaba Ụlọ Obibi nke mgbakọ nkwado. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, a na-emezu ihe abụọ site n’ịṅa ntị ná ntụziaka a:
5 Ọ na-echekwara ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị ego: Mgbe anyị kwadoro ndokwa Society, ụlọ na-adịrị ụmụnna anyị ọnụ ala karị. Kama ego anyị ịgara ndị nwe ụlọ, a pụrụ iji ya mee ihe ndị ka mma n’ịkwado ezinụlọ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị na ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ. Ọ bụrụgodị na anyị onwe anyị pụrụ ịkwụ ụgwọ maka ebe obibi ndị dara ọnụ karị, anyị kwesịrị ịkwado mgbalị Ngalaba Ụlọ Obibi na-eme. A kọwara mmụọ nke ichebara ndị ọzọ echiche dị otú a na 1 Jọn 3:17, ọ bụkwa ụkpụrụ dị ná 1 Ndị Kọrint 10:24.
6 Ọ na-egosipụta nrubeisi nye ntụzi Society: Nke a kwesịrị ịbụ otu n’ime isi nchegbu anyị. Ndị Hibru 13:17 na-ekwu, sị: “[Na-ekwenyerenụ] ndị isi unu, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha: n’ihi na ndị ahụ na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi unu, dị ka ndị ga-aza ajụjụ banyere unu; ka ha wee were ọṅụ mee nke a, ghara ịsụ ude: n’ihi na nke a ga-abụ ihe [na-abaghịrị] unu uru.” Ka ụmụnna anyị na-eme ọtụtụ ndokwa maka mgbakọ distrikti anyị, anyị chọrọ ka ha nwee mmetụta na anyị na-akwado ha n’ụzọ zuru ezu. Ebe ọ bụ na a na-achọ nkwado anyị n’okwu a nanị maka ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ kwa afọ, nke a bụ ụzọ dị mma isi kwadoo mgbalị ha. Ọ bụrụgodị na ihe ga-amasị anyị dị iche, ezi ihe nlereanya anyị, dị ka ụmụnna anyị nakwa ụwa si na-ahụ ya, na-akwalite mmụọ ịhụnanya, nke ịdị n’otu, na nke inye nkwado.—Fil. 2:1-4.
7 Mkpa Ndị Pụrụ Iche: Ndokwa a bụ nanị maka ndị chọrọ enyemaka pụrụ iche site n’aka ndị ọzọ n’ime ndokwa ha maka mgbakọ, karịsịa ndokwa maka ebe obibi. Ha pụkwara ịchọ enyemaka n’ụzọ ndị ọzọ, na-adabere n’ọnọdụ ha ndị pụrụ iche. Ọ bụ nanị ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ bụ́ ezi ihe nlereanya, ndị nwere mkpa pụrụ iche, bụ́kwa ndị Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwadoro, tinyere ụmụ ha na-akpa ezi àgwà, ruru eru inweta enyemaka site ná ndokwa nke Mkpa Ndị Pụrụ Iche. Ọ bụ ọgbakọ ebe ha na-aga nzukọ kwesịrị ime ndokwa ndị ọzọ maka ilekọta ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche, kama ibokwasị ndị nhazi mgbakọ ibu ọrụ a. Ndị okenye na ndị ọzọ, bụ́ ndị maara ọnọdụ onye ahụ, pụrụ iji ịhụnanya nye aka. Nke a na-achọkarị ka ndị nkwusa tụlee mkpa nke ndị nọ n’ozi oge nile, ndị agadi, ndị ahụ na-esichaghị ike, na ma eleghị anya ndị ọzọ. Ndị nkwusa pụrụ inye aka site n’ịkpọrọ ndị dị otú ahụ ma ọ bụ site n’igbo mkpa ha n’ụzọ ndị ọzọ dị irè.—Jes. 2:15-17; 1 Jọn 3:17, 18.
8 N’ezie, Ngalaba Ụlọ Obibi ga-agba mbọ inye ndị nkwusa nwere mkpa ndị pụrụ iche ụlọ obibi ndị kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na ndị nọ n’ọgbakọ apụghị inyere ha aka. Ndị nkwusa a pụrụ isoro odeakwụkwọ ọgbakọ kwurịta banyere ọnọdụ ha. Odeakwụkwọ kwesịrị isoro Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwurịta okwu iji hụ ma ọ̀ ga-ekwe ọgbakọ mee inyere ndị a aka ịhụ maka ụlọ obibi nke ha. Ọ bụrụ na ọgbakọ enweghị ike inye aka ahụ dị mkpa, odeakwụkwọ pụrụ inye ndị dị otú ahụ fọm Room Request bụ́ nke o dekwasịworo n’ụzọ doro anya, n’elu elu nke peeji nke mbụ, okwu ndị bụ́ “MKPA NDỊ PỤRỤ ICHE.” Ọ bụ nanị ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche kwesịrị idejupụta fọm a e dekwasịrị ihe n’ụzọ pụrụ iche. Ọ bụ onye ahụ na-achọ ka e nye ya ụlọ ga-edejupụta ya. E kwesịrị iweghachiri ya odeakwụkwọ, bụ́ onye ga-eleru ya anya iji hụ na e denyezuru ihe nile a chọrọ, na o ziri ezi, nakwa nwapụta ọnọdụ ndị mere ka onye ahụ ruo eruo maka nchebara echiche dị otú ahụ. Odeakwụkwọ GA-AKỌWA N’ỤZỌ ZURU EZU ọnọdụ ndị ahụ n’ohere dị n’azụ fọm ahụ. E kwesịrị ime ihe a nile n’ezigbo oge tupu mgbakọ eruo. Odeakwụkwọ ga-ezipụziri Ngalaba Ụlọ Obibi fọm ahụ. A ga-eme ka onye ahụ na-achọ ka e nye ya ụlọ kpọmkwem mara banyere ụlọ ahụ.
9 Ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche EKWESỊGHỊ ịga ná mgbakọ ma rịọ ka e nye ha ụlọ mgbe ha rutere, n’ihi na Ngalaba Ụlọ Obibi aghaghị inweta nnwapụta nke Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ.
10 Ọtụtụ ndị egosipụtawo ekele maka ndokwa ndị a na-eme maka ụlọ obibi n’oge mgbakọ. Ì so na-enwe ekele maka ọtụtụ ndokwa ndị e mere maka gị? Obi dị Society ụtọ inye ebe obibi ndị dị ntụsara ahụ, ndị aka pụrụ iru n’oge mgbakọ, na-enye anyị nile ohere itinye uche n’abamuru ime mmụọ nke mgbakọ ahụ na n’usoro ihe omume ya.
11 Ije Mgbakọ Ọzọ: A na-ekenye ọgbakọ ọ bụla ịga mgbakọ kasị dịrị ya nso. Dabere n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa e kenyere ịga mgbakọ nke ọ bụla, Society na-eme atụmatụ ọnụ ọgụgụ ndị ga-abịa iji dokwaa maka oche, ụlọ, akwụkwọ na ihe ndị ọzọ ga-ezunụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na e nwere ezi ihe mere ị ga-eji gaa mgbakọ na-abụghị nke e kenyere unu ma chọọ ka e nye gị ụlọ, odeakwụkwọ ọgbakọ pụrụ inye gị otu fọm Room Request. Ị pụrụ idejupụta ya ma nye ya odeakwụkwọ ka ọ bịanye aka tupu i ziga ya ná mgbakọ nke ị chọrọ ịga.
12 Asụsụ Ogbi Maka Ndị Ntị Chiri: A ga-eme ndokwa ka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ruru eru sụgharịa usoro ihe omume ahụ nile n’Ụdị Asụsụ Ogbi nke America ná mgbakọ ndị na-esonụ: Ota 2, November 2-4, 2001; North 4, November 16-18, 2001; Uli 7, December 7-9, 2001; na Ubogo 10, January 11-13, 2002. A na-agba ndị ntị chiri nọ n’ọgbakọ nile na Nigeria ume ịmalite mewe atụmatụ ịga ma ọ dịkarịa ala otu n’ime mgbakọ ndị a. Ndị okenye kwesịrị ịgba mbọ jụọ onye ọ bụla ntị chiri nọ n’ọgbakọ ha bụ́ onye na-aghọta Ụdị Asụsụ Ogbi nke America iji jide n’aka na ha maara banyere ndokwa a na iji chọpụta ma hà ga-achọ enyemaka ọ bụla ka ha wee nwee ike ịga.
13 Ọ bụ nanị mgbakọ ndị a ga-enwe akụkụ dị iche e dowere oche maka ndị ntị chiri bụ́ ndị a ga-atụgharịrị usoro ihe omume ahụ n’asụsụ ogbi. A gaghị eme ndokwa maka ịtụgharị okwu n’asụsụ ogbi ná mgbakọ ọ bụla ọzọ. Ọ bụrụ na onye ntị chiri esoro onye na-asụ asụsụ ndị ogbi jee mgbakọ ọ bụla ọzọ, a ga-ekwe ka a na-atụgharịrị nanị onye ahụ, mmadụ abụọ ahụ anọdewe onwe ha, ọ bụghị iguzo n’ihu otu onye ma ọ bụ karị.
14 Chekwaa Ego Maka Mgbakọ Ahụ: Tinyere ndokwa ndị ọzọ, UGBU A bụ oge iji malite chekwawa ego maka mgbakọ distrikti ahụ. Ụfọdụ bi n’ebe dịtụ anya site n’ebe a ga-enwe mgbakọ. Ọzọkwa, ụfọdụ nwere ezinụlọ buru ibu. Ego dị ndị a, nakwa anyị nile, mkpa maka inye onyinye, ịgba ụgbọ, iri ihe n’oge mgbakọ ahụ, na ihe ndị ọzọ pụrụ ịdapụta. Ọ dị ndị nwere ezinụlọ buru ibu mkpa ime atụmatụ tupu oge eruo na ichekwa ego ga-ezunụ ka ezinụlọ ahụ nile wee nwee ike ịga mgbakọ ahụ. Ihe dị irè a pụrụ ime bụ ime atụmatụ ego nile a ga-achọ. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya imenye atụmatụ maka ịrị elu nke ọnụ ahịa ihe mgbe ị na-eme atụmatụ gị. Jiri ọnụ ọgụgụ ọnwa ndị dị malite ugbu a ruo mgbe unu ga-enwe mgbakọ distrikti unu kee ego ole e mere atụmatụ ya. Nke a bụ ego ole ọ ga-adị mkpa ka ị na-echekwa kwa ọnwa. Kwa ọnwa, mee ka ọ bụrụ iwu na ị ga-ebu ụzọ wepụ ego a iche dị ka ego mgbakọ. A pụrụ ịdị na-etinye nke a n’obere igbe ma ọ bụ envelopu. Otú ọ dị, a pụrụ ike ego ahụ a na-echekwa kwa ọnwa ụzọ anọ ma na-edebe ya iche kwa izu. Ihe dị mkpa bụ na i kwesịghị ichere ruo mgbe ọ fọrọ otu ọnwa ma ọ bụ abụọ ka mgbakọ malite tupu ị malite chekwawa ego maka njem a a na-eme mgbe nile kwa afọ.—Ilu 21:5.
15 Mmechi: Ka oge ị ga-eji gaa mgbakọ distrikti gị na-akpụdewe nso, tinye ya n’ekpere nye Jehova ka i nwee ike ịnọ ná nnọkọ nile n’ụbọchị atọ ahụ dum ma rite uru kasị ukwuu n’usoro ihe omume ahụ. Ị̀ rịọwo maka ohere ịhapụ ọrụ maka ụbọchị atọ nke mgbakọ ị na-eme atụmatụ ịga? Ọ bụrụ na i mebeghị ya, mee otú ahụ ngwa ngwa o kwere omume. A dịghị anabatakarị arịrịọ maka ohere ịhapụ ọrụ, bụ́ ndị a rịọrọ mgbe ọ fọrọ ntakịrị ka oge gwụ. Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche emewo ndokwa maka Mgbakọ Distrkti “Ndị Na-ezi Okwu Chineke” nke afọ a iji nye anyị ntụziaka ime mmụọ na iji wulie okwukwe anyị elu. Ya mere malite ime atụmatụ gị ugbu a ịga, na-agbaso ndụmọdụ nke ọbụ abụ ahụ: “N’ime mkpọkọta nile nke mmadụ gọzienụ Chineke”!—Ọma 68:26.
[Okwu Dịịrị Òtù Ndị Okenye: Ozugbo unu natara ihe ntinye a, biko maanụ n’ọkwa ná Nzukọ Ije Ozi na-eso ya nakwa n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ga-esochinụ, ebe na ụbọchị Society kenyere ọgbakọ unu. Ọ ga-adị mma ịkanye ihe n’okpuru ebe na ụbọchị ndị e kenyere ọgbakọ unu ịga mgbakọ ma mapawa akụkụ ihe ntinye ahụ na bọọdụ ịma ọkwa.
Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ime ihe omume na ịma ọkwa ndị metụtara mgbakọ ná nzukọ ndị a ga-enwe n’ọdịnihu. Ndị okenye nile ga-achọ inye nkwado zuru ezu iji hụ na e mere ihe ọsọ ọsọ, n’ịnụ ọkụ n’obi, nakwa n’ụzọ dị irè banyere ihe ndị metụtara mgbakọ.]
Igbe dị na peeji nke 3]
Oge Ihe Omume
Friday
9:20 ụtụtụ – 4:40 uhuruchi
Saturday
9:00 ụtụtụ – 4:20 uhuruchi
Sunday
9:00 ụtụtụ – 3:20 ehihie