Ụzọ Isi Zụlite Nkà Isoro Ndị Ọzọ Na-atụgharị Uche
1 Otu nkọwa e nyere okwu ahụ bụ́ “ntụgharị uche” bụ “isoro onye ọzọ kwurịta okwu iji gbanwee omume ma ọ bụ echiche ya.” Iji meziwanye ịdị irè gị n’ozi, ọ dị gị mkpa iwulite nkà nke isoro ndị ị na-ezute na-atụgharị uche. (Ọrụ 17:2-4) Ma olee otú ị pụrụ isi zụlite nkà a?
2 Ọ Na-amalite ná Ntụgharị Uche: Mgbe ị na-amụ eziokwu Bible, ọ ga-enyere gị aka ma ọ bụrụ na i chee echiche banyere ihe ọmụma ahụ. Ọ bụrụ na ihe ọmụma ahụ sitụrụ ike, wepụta oge iji metụ nnyocha ma tụgharịa uche n’ihe ndị ị chọpụtara. Gbalịa ka i ghọta nke ọma ọ bụghị nanị nkọwa ndị e nyere kamakwa ihe ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ mere e ji nye nkọwa ndị ahụ.
3 Ọ Gụnyere Ime Nkwadebe Maka Ozi: Chee banyere otú ị ga-esi kọwaara ndị dị iche iche eziokwu ahụ. Chepụta ajụjụ na-akpali echiche iji kpalie mmasị. Kpebie ụzọ ị ga-esi mee ka o kwekọọ n’ihe sitere n’Akwụkwọ Nsọ, nakwa otú i ga-esi jiri ya soro mmadụ tụgharịa uche. Tụọ anya okwu mgbochi ndị a pụrụ iwelite, cheekwa banyere otú ị pụrụ isi kwuo okwu na ha. Chọta isi ihe dị n’akwụkwọ ahụ ị ga-enyefe bụ́ nke ga-akasị daba adaba.
4 Gbasoo Ihe Nlereanya Jisọs: Jisọs setịpụrụ ihe nlereanya kasị mma nke isoro ndị ọzọ na-atụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ dị irè. Iji tụlee otú o si kụzie ihe, leba anya n’ihe ndekọ ahụ dị na Luk 10:25-37. Rịba usoro a ama: (1) Dọrọ uche gaa n’Akwụkwọ Nsọ mgbe ị na-aza ajụjụ ndị mmadụ. (2) Gwa ha ka ha kwuo uche ha, jaakwa ha mma mgbe ha kwuru ihe ndị ezi uche dị na ha. (3) Jide n’aka na i mere ka ihe jikọrọ ajụjụ ahụ na Akwụkwọ Nsọ pụta ìhè. (4) Jiri ihe atụ na-eru n’obi mee ihe iji jide n’aka na a ghọtara ezi ebumnobi nke azịza ahụ.—Lee Ụlọ Nche nke September 1, 1986, peji nke 27-28, paragraf nke 8-10.
5 Na-eji Ngwá Ọrụ E Nyere Anyị Na-eme Ihe: E bipụtara Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible ịbụ akwụkwọ e ji eje ozi ubi. Okwu ndị e ji amalite mkparịta ụka, ụzọ isi zaghachi ndị pụrụ ịkwụsị mkparịta ụka, na isi ihe ndị e ji atụgharị uche dị na ya na-enyere anyị aka iwulite ikike nke isoro ndị ọzọ na-atụgharị uche. Akwụkwọ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible bụ ngwá ọrụ bara uru anyị kwesịrị iji na-eje ozi mgbe nile ma jiri ya na-eme ihe n’alaghị azụ mgbe anyị na-enwe nkwurịta okwu dabeere na Bible.
6 Iwulite ikike i nwere isoro ndị ọzọ na-atụgharị uche ga-eme ka nkà i nwere n’ọrụ nkwusa na izi ihe ka mma. Nke a ga-eme ka gị na ndị ị na-ezute n’ozi nwee ngọzi bara ụba.