Akwụkwọ Ndị Na-enye Aka Iji Malite Nkwurịta Okwu Baịbụl Ì Ji Ha Na-eje Ozi?
1. Olee otú Pọl onyeozi na Jizọs si kụziere ndị ọzọ ihe?
1 Pọl onyeozi gbara mbọ ịhụ na ya na ndị mmadụ ‘tụgharịrị uche n’Akwụkwọ Nsọ.’ (Ọrụ 17:2, 3; 18:19) Site n’ime otú ahụ, o ṅomiri Jizọs, bụ́ onye kwuru ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ugboro ugboro ma jiri ihe atụ nyere ndị na-ege ya ntị aka ịghọta uche Chineke. (Mat. 12:1-12) E bipụtara akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible iji nyere anyị aka ime otu ihe ahụ.
2. Olee otú anyị nwere ike isi jiri akwụkwọ nta ahụ bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible kwadebe otú anyị ga-esi na-amalite mkparịta ụka otú ọ ga-adọrọ mmasị?
2 Ịkwadebe Otú Ị Ga-esi Na-amalite Mkparịta Ụka Otú Ọ Ga Na-adọrọ Mmasị: Na peeji nke 2-7 nke akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, e nwere aro ndị na-akpali mmasị a tụrụ banyere otú e nwere ike isi malite mkparịta ụka. Ịmụta ụzọ dị iche iche e si amalite mkparịta ụka na iji ha na-amalite mkparịta ụka, karịsịa ma ọ bụrụ na unu na-arụzukarị ókèala unu, ga-eme ka i nwee ọtụtụ ụzọ i si amalite mkparịta ụka, ọ ga-enyekwara gị aka inwekwu ike izi ụdị ndị dị iche iche ozi ọma. Ọ bụrụ na mmadụ ji telefon na-agba àmà ma ọ bụ na-ekwunye okwu n’ígwè e ji akparịta ụka n’ụlọ ndị ndị nwe ha na-anaghị apụtakarị apụta, o nwere ike isi n’akwụkwọ nta ahụ gụpụta aro ndị a tụrụ maka otú e si amalite mkparịta ụka.
3. Olee ihe ndị dị na peeji nke 7-13 nke akwụkwọ nta bụ́ Nkwurịta Okwu Bible bụ́ ndị ga-enyere anyị aka n’ozi anyị? (b) Olee ndị ọ ga-adị mma iji ihe dị na peeji nke 13-16 malitere mkparịta ụka?
3 Ihe Ị Ga-aza Mgbe Ndị Mmadụ Welitere Ihe Mgbochi: Ọ́ gaghị adị mma ma i buru ụzọ wepụta nkeji ole na ole tupu ị gawa ozi ọma ma tụlee ihe ndị dị na peeji nke 7-13 iji mata ihe i nwere ike ịza ndị ga-ekwu ihe ụfọdụ iji gbochie gị izi ha ozi ọma? È nwere ndị okpukpe Buddha, ndị Hindu, ndị Juu, ma ọ bụ ndị Alakụba n’ókèala unu? Ya bụrụ na e nwere, ihe dị na peeji nke 13-16 ga-enyere gị aka.
4. Olee otú Isiokwu Dị Iche Iche nke Baịbụl Maka Nkwurịta Okwu nke dị n’azụ azụ Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ anyị nwere ike isi nyere anyị aka mgbe a jụrụ anyị ajụjụ ma ọ bụ kwulite ihe nwere ike ịkpata arụmụka?
4 Ịza Ajụjụ: Isiokwu Dị Iche Iche nke Baịbụl Maka Nkwurịta Okwu nke dị ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ peeji nke 1773 ruo 1789 nwekwara ike inyere anyị aka mgbe a jụrụ anyị ajụjụ ma ọ bụ kwulite ihe nwere ike ịkpata arụmụka. I nwere ike ịgwa onye ahụ na ị ga-achọ igosi ya ihe ga-amasị ya n’isiokwu ahụ, mgbe ahụ gazie n’azụ azụ Baịbụl gị. Ebe ọ bụ na e depụtara isiokwu ndị a n’usoro A, B, CH, gaa n’isiokwu i chere ga-enyere gị aka ịza ajụjụ ahụ. Lewezie anya n’obere isiokwu ndị e dere ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo. Ozugbo ị chọtara ihe ị na-achọ, gụpụta ya agụpụta. Ọ bụrụ na ihe unu na-ekwu bụ ihe na-egosi na Baịbụl si n’aka Chineke, i nwere ike ịchọta ihe ga-enyere gị aka n’okpuru isiokwu bụ́ “Baịbụl.”
5. Olee uru ndị ọzọ akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible na Isiokwu Dị Iche Iche nke Baịbụl Maka Nkwurịta Okwu bara?
5 Ihe Ndị Ọzọ E Nwere Ike Iji Ha Eme: Ụfọdụ na-edebe otu akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible nakwa Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ha n’ebe ha na-arụ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ ha iji nyere ha aka ịza ajụjụ ndị dị ka, ‘Olee ihe mere na unu anaghị eso eme ememme ndị ọzọ na-eme?’ ‘Gịnị mere unu ekweghị n’ọkụ ala mmụọ?’ Ihe ndị dị n’okpuru isiokwu bụ́ “Okike” enyerela ndị na-eto eto aka, isiokwu bụkwa “Ngwakọta Okwukwe” nwekwara ike inyere ha aka ịma ihe ha ga-aza mgbe a na-achọ ịmanye ha ka ha sonye n’ekpere ụtụtụ a na-ekpe n’ụlọ akwụkwọ ha. Ị̀ na-aga ileta onye ahụ́ na-adịghị ma ọ bụ onye onye ọ hụrụ n’anya nwụnahụrụ? Ihe ndị dị n’okpuru isiokwu bụ́ “Ọnwụ” na “Mbilite n’Ọnwụ” nwere ike inyere gị aka iji Akwụkwọ Nsọ kasie onye ahụ obi. Ma akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible ma Isiokwu Dị Iche Iche nke Baịbụl Maka Nkwurịta Okwu nwechara ihe ndị ga-enyere ndị na-akwado okwu ihu ọha na okwu ndị ọzọ na ndị na-akwado iduzi nzukọ ozi ubi aka.
6. Gịnị mere anyị ji ezi ozi ọma?
6 Ihe mere anyị ji ezi ozi ọma abụghị iji gosi ndị mmadụ na anyị ka ha mara ihe; ọ bụghịkwanụ naanị ka anyị gwa ha ihe anyị ji bịa. Kama ọ bụ inyere ha aka ịtụgharị uche n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. Ọ bụrụ na anyị ejiri akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible na Isiokwu Dị Iche Iche nke Baịbụl Maka Nkwurịta Okwu na-aga ozi ọma, anyị na-egosi na anyị na-elezi ozizi anyị anya mgbe niile.—1 Tim. 4:16.