Ịnụ Ọkụ n’Obi nke Na-akpali Ihe Ka n’Ọnụ Ọgụgụ
Pọl onyeozi jara ndị Kọrint mma n’ihi na ịnụ ọkụ n’obi ha maka ọrụ ọma ‘akpaliwo ihe ka n’ọnụ ọgụgụ’ ndị Kraịst ibe ha. (2 Kọr. 9:2) Ọtụtụ mgbe, otu onye, otu ezinụlọ, otu ìgwè ọmụmụ akwụkwọ, ma ọ bụ ọgbakọ dum pụrụ inwe mmetụta yiri nke ahụ site n’òkè ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere n’ọrụ izisa ozi ọma ahụ. Nke a bụ ụzọ ụfọdụ ị pụrụ isi gosipụta ịnụ ọkụ n’obi maka ozi ahụ.
◼ Debe ụbọchị Saturday gị maka ozi Ụbọchị Magazin.
◼ Kere òkè ụfọdụ n’ozi ubi na Sunday.
◼ Kere òkè n’ozi n’ụbọchị ọ bụla e mere ndokwa pụrụ iche maka ịgba àmà.
◼ Jiri oge ezumike ọrụ ma ọ bụ nke ụlọ akwụkwọ jee ozi.
◼ Kwadoo ozi n’oge nleta nke onye nlekọta sekit.
◼ Jiri otu ọnwa ma ọ bụ karị sụọ ụzọ inyeaka n’afọ.
◼ Mee mgbanwe n’ọnọdụ gị iji sụọ ụzọ oge nile ma o kwe mee.
Lee 2000 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peeji nke 17-19.