Ndụ Nọ n’Ihe Ize Ndụ!
1 Bible na-eme ka uche Jehova doo anya, nke bụ́ “ka a zọpụta mmadụ nile.” Otú ọ dị, ọ bụkwa eziokwu na atụmanya ndụ nke ọtụtụ nde mmadụ nọ n’ụwa nwere na-adabere n’àgwà ha n’ebe Jehova Chineke na Alaeze ya nke dị n’aka Jisọs Kraịst dị. Àgwà kwesịrị ekwesị pụrụ ịdabere nanị ná “mmazu nke eziokwu.” (1 Tim. 2:3, 4) Ka anyị na-ama ọkwa na n’oge na-adịghị anya, a ga-ekpochapụ ajọ omume nile n’ụwa iji nye ohere maka ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke, e nyewokwa anyị iwu ịrụ ọrụ dị mkpa nke na-azọpụta ndụ.—Mat. 24:14; 28:19, 20; Rom 10:13-15.
2 N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Oké Mkpa? Jisọs dọrọ aka ná ntị banyere ‘mkpagbu ukwu, nke ihe dị ka ya aka-adịghị site ná mmalite ụwa.’ (Mat. 24:21) Mkpagbu ahụ ga-abịa ná njedebe ya n’Amagedọn. (Mkpu. 16:16) Ọha mmadụ, bụ́ ndị na-eche mbibi ihu ma ọ bụrụ na ha aṅaghị ntị n’ozi ọma ahụ na-agụnye ndị ikwu anyị na-ekweghị ekwe, ndị agbata obi anyị, ndị ọrụ ibe anyị, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, na ndị anyị maara. Ma nchegbu anyị bụ ijekwuru “mmadụ nile” n’iṅomi Chineke, bụ́ onye gosipụtara ịhụnanya ya maka ụwa dum nke ihe a kpọrọ mmadụ site n’inye Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, dị ka ihe mgbapụta maka mmadụ nile. (Jọn 3:16) Anyị aghaghị iji ịnụ ọkụ n’obi na-agbalịsi ike ịkpọ mmadụ nile òkù ịgbaba n’ebe nchebe nke Chineke. Site n’ịrụ ọrụ nkwusa ahụ n’ụzọ zuru ezu, anyị pụrụ izere ikpe ọmụma ọbara.—Ezik. 33:1-7; 1 Kọr. 9:16.
3 Gịnị Bụ Ebumnobi Anyị? E mesiri ịdị mkpa nke ọrụ nkwusa ahụ ike n’akụkụ nile n’ime Okwu Chineke. Dị ka Pọl onyeozi si kwuo ya, “ịhụnanya Kraịst [na-arụgide] anyị” ibi ndụ kwekọrọ n’ụzọ nke Chineke. (2 Kọr. 5:14) Tụkwasị na nke ahụ, Ụlọ Nche na-emesikarị ibu ọrụ anyị nwere nke ime nkwusa ike. Ozi Alaeze Anyị na-enye nduzi mgbe nile banyere ụzọ isi rụzuo ọrụ nkwusa ahụ. Ndị okenye na-ahazi ọrụ ahụ ma na-agba anyị ume ikere òkè na ya. Ndị nkwusa ibe anyị na-akpọ anyị òkù iso ha kere òkè n’ozi. Anyị na-anụ ọtụtụ ihe banyere ịkwadebe ụzọ iche ihe n’ihu anyị, inyefe magazin na akwụkwọ ndị ọzọ, ime nletaghachi, iduzi ọmụmụ Bible, na iji ohere ọ bụla dapụtaranụ na-agba àmà. Ihe a nile na-enyere anyị aka imezu ebumnobi anyị nke bụ́ ịzọpụta ndụ.—1 Kọr. 9:22, 23; Efe. 1:13.