“Okwu E Kwuru na Mgbe Kwesịrị Ya”
1 Iso ndị ọzọ na-ekerịta ozi nke ndụ ahụ ọ̀ na-esiri gị ike? Ị̀ na-eche na ị ghaghị ikwu oké ihe iji kpalie mmasị ndị na-ege gị ntị? Mgbe Jisọs zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya, ọ gwara ha, sị: “Mgbe unu na-aga, na-ekwusanụ, sị, Alaeze eluigwe dị nso.” (Mat. 10:7) Ozi ahụ adịghị mgbagwoju anya, ọ dịkwa mfe izi ya mmadụ. Ọ dịghị iche taa.
2 Ọtụtụ mgbe ọ bụ nanị okwu ole na ole na-adị mkpa iji malite mkparịta ụka. Mgbe Filip zutere ọnaozi Etiopia ahụ, ọ jụrụ ya, sị: “Ị̀ na-amata ihe ị na-agụ?” (Ọrụ 8:30) Lee nkwurịta okwu na-eweta afọ ojuju si ‘n’otu okwu e kwuru na mgbe kwesịrị ya’ pụta!—Ilu 25:11.
3 Ị pụrụ iji ụzọ yiri nke ahụ mee ihe n’ozi gị. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ileru anya ala ma na-ahọrọ okwu ndị kwekọrọ n’ọnọdụ ndị dịnụ. Jụọ ajụjụ, ma gee ntị n’azịza e nyere.
4 Ụfọdụ Ajụjụ Ndị Bụ́ Isi: Iji malite mkparịta ụka, ị pụrụ ịnwale nke ọ bụla n’ime ajụjụ ndị a:
◼ “Ị na-eji Ekpere Onyenwe Anyị (ma ọ bụ, Nna Anyị Bi n’Eluigwe) eme ihe n’ofufe gị?” (Mat. 6:9, 10) Kwughachi akụkụ ya ụfọdụ, ma kwuzie, sị: “Ụfọdụ ndị na-ajụ, sị: ‘Gịnị bụ aha Chineke, nke Jisọs sịrị na a ga-edo nsọ?’ Ndị ọzọ na-ajụ, ‘Gịnị bụ Alaeze ahụ Jisọs kwuru ka anyị na-ekpe ekpere maka ya?’ Ì nwetawo azịza ndị na-eju afọ nye ajụjụ ndị a?”
◼ “Ì chetụwo, sị: ‘Gịnị bụ nzube nke ndụ?’” Mee ka ọ pụta ìhè na e jikọtara ya na ịmata Chineke.—Ekli. 12:13; Jọn 17:3.
◼ “Ì chere na ọ dị mgbe a ga-ewepụ ọnwụ?” Jiri Aịsaịa 25:8 na Mkpughe 21:4 mee ihe iji nye azịza a pụrụ ịtụkwasị obi.
◼ “È nwere ihe ngwọta dị mfe maka oké ọgba aghara dị n’ụwa?” Gosi na Chineke na-akụzi ‘ịhụ onye agbata obi gị n’anya.’—Mat. 22:39.
◼ “Otu ụbọchị, ọkụ si n’eluigwe ọ̀ ga-ebibi ụwa anyị?” Gwa ya nkwa Bible bụ́ na ụwa ga-adịru mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 104:5.
5 Jiri ụzọ dị mfe, nke na-aga n’ihe a chọrọ kpọmkwem, na ụzọ njekwu obi ọma na-ezi ozi ọma ahụ. Jehova ga-agọzi mgbalị ndị ị na-eme iji soro ndị ọzọ kerịta ọbụna ‘otu okwu’ nke eziokwu ahụ.