Ịmụta Ihe na Vidio Bụ́ The Bible—Accurate History, Reliable Prophecy
Mgbe i kirisịrị vidio a, ị̀ pụrụ ịza ajụjụ ndị a? (1) Ònye bụ Isi Iyi nke ihe ọmụma a pụrụ ịdabere na ya dị na Bible? (Dan. 2:28) (2) Olee otú Bible si enye nkọwa ziri ezi banyere Ijipt oge ochie, oleekwa otú amụma ahụ e dekọrọ n’Aịsaịa 19:3, 4 si mezuo? (3) Olee otú nkà mmụta ihe ochie siworo kwado nkọwa Bible nyere banyere ndị Asiria, eze ha, na njedebe nke Asiria? (Nehum 3:1, 7, 13) (4) Amụma ndị dị aṅaa metụtara Babilọn gosipụtaworo na a pụrụ ịdabere na ha? (5) Olee mmetụta Midia na Peasia nwere n’ahụ ndị Chineke? (6) Olee otú e si mezuo Daniel 8:5, 8, ogologo oge hákwa aṅaa ka e buru nke a n’amụma tupu o mee? (7) Olee otú Jisọs si gosi na ya bụ ezi Mesaịa ahụ? (8) Olee ike ọchịchị nke oge a na-emezu amụma ndị dị ná Mkpughe 13:11 na 17:11? (9) Olee akụkụ vidio ahụ ndị na-egosi ịbụ eziokwu nke Eklisiastis 8:9? (10) Olee otú ihe nkiri a siworo wusie okwukwe gị ike ná nkwa ndị dị na Bible banyere ọdịnihu? (11) Olee otú ị pụrụ isi jiri ngwá ọrụ a mee ka ndị ọzọ kwere na Bible si n’aka Chineke?