Baịbụl—Akwụkwọ Na-akọ Ihe Ndị Mere Eme na Amụma Ndị Na-emezu Emezu
Olee ihe na-egosi na akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl mere eme? Olee amụma ndị dị na Baịbụl mezurulanụ bụ́ ndị na-eme ka obi sie anyị ike na ndị nke na-emezubeghị ga-emecha mezuo? A zara ajụjụ ndị a na fim bụ́ The Bible—Accurate History, Reliable Prophecy (Baịbụl—Akwụkwọ Na-akọ Ihe Ndị Mere Eme na Amụma Ndị Na-emezu Emezu). Fim a bụ fim nke atọ dị n’ime diiviidi bụ́ The Bible—A Book of Fact and Prophecy. Ì nwere ike ịza ajụjụ ndị a ma i kirichaa ya?
(1) Ònye ka ihe ndị e dere na Baịbụl si n’aka? (Dan. 2:28) (2) Olee ihe ndị bụ́ eziokwu Baịbụl kọrọ banyere Ijipt oge ochie, oleekwa otú amụma e buru n’Aịzaya 19:3, 4 si mezuo? (3) Olee otú ihe ọmụmụ banyere ihe ndị mgbe ochie si gosi na ihe Baịbụl kọrọ banyere ndị Asiria, ndị eze ha, na mbibi e bibiri Asiria, bụ eziokwu? (Nehọ. 3:1, 7, 13) (4) Olee amụma ndị e buru banyere Babịlọn bụ́ ndị mezurulanụ? (Jere. 20:4; 50:38; 51:30) (5) Olee amụma e buru banyere Midia na Peshia bụ́ nke mezurulanụ? (Aịza. 44:28) (6) Olee otú amụma e buru na Daniel 7:6 na 8:5, 8, bụ́ nke e buru banyere Gris, si mezuo? (7) Olee otú amụma e buru na Daniel 7:7 si mezuo mgbe Rom ghọrọ mba na-achị ụwa? (8) Olee Siza ndị a kpọrọ aha ha na Baịbụl? (9) Gịnị mere Ndị Kraịst mgbe Nero na-achị? (10) Olee otú amụma ndị dị na Mkpughe 13:11 na 17:10 si mezuo? (11) Ònye bụ eze nke asatọ ahụ? (12) Olee ihe ị hụrụ na fim a nke gosiri na ihe e kwuru n’Ekliziastis 8:9 bụ eziokwu? (13) Olee amụma ndị ị na-atụsi anya ha ike ka ha mezuo? (14) Olee otú i nwere ike isi jiri fim a nyere ndị ọzọ aka ịghọta na Baịbụl si n’aka Chineke?