Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/01 p. 1
  • Bụrụ Onye Na-ege Ntị nke Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Bụrụ Onye Na-ege Ntị nke Ọma
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Lezienụ Anya Otú Unu Si Aṅa Ntị”
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Otú Jehova Si Edu Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Nzukọ Na-abara Ndị Na-eto Eto Uru
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Tụkwasị Uche M n’Ihe?
    Teta!—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 1/01 p. 1

Bụrụ Onye Na-ege Ntị nke Ọma

1 Ọ na-achọ inye onwe onye ọzụzụ iji na-ege ntị nke ọma. Ọ na-achọkwa ka onye ahụ na-ege ntị nwee ọchịchọ ịmụta ihe na irite uru site n’ihe ọ na-anụ. N’ihi ya, Jisọs mesiri ike mkpa ọ dị ‘ilezi anya otú unu si anụ.’—Luk 8:18.

2 Nke a dị otú a karịsịa mgbe anyị gara nzukọ ọgbakọ, na mgbakọ dị iche iche. Ndị a bụ oge ndị anyị na-aghaghị ige ntị nke ọma. (Hib. 2:1) Lee isi ihe ụfọdụ ndị ga-enyere gị aka ịbụ onye na-ege ntị nke ọma ná nnọkọ ndị a nke ndị Kraịst.

◼ Jiri nzukọ ndị ahụ kpọrọ ihe. Ha bụ ụzọ bụ́ isi e si eme anyị ‘ndị mmụta Jehova’ site n’aka “onye ahụ na-achị ezinụlọ, onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi.”—Aịsa. 54:13; Luk 12:42.

◼ Kwadebe tupu oge eruo. Tụleghachi ihe ndị a ga-atụle, jidekwa n’aka na i wetara Bible gị nakwa nke gị n’akwụkwọ a na-amụ.

◼ N’oge nzukọ ahụ, tinye mgbalị pụrụ iche ịtụkwasị uche n’ihe a na-amụ. I kwesịrị izere ikwunyere ndị gị na ha nọ okwu nakwa ikiri ihe ndị ọzọ na-ege ntị na-eme. Gbalịa ka a ghara ịdọpụ uche gị site n’iche echiche ihe ị ga-eme mgbe nzukọ gasịrị ma ọ bụ ihe ndị ọzọ dịịrị gị.

◼ Tụlee ihe a na-ekwu. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú nke a si metụta m? Olee mgbe m ga-etinye ya n’ọrụ?’

◼ Detuo ná mkpirikpi ihe ndị bụ́ isi na akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche. Nke a na-enyere gị aka ime ka uche gị dịgide n’ihe a na-atụle ma na-eme ka i nwee ike icheta ihe ndị bụ́ isi maka iji ha mee ihe mgbe e mesịrị.

3 Kụziere Ụmụ Gị Ka Ha Na-ege Ntị: Ntụziaka ime mmụọ dị ụmụaka mkpa. (Deut. 31:12) N’oge ochie, “onye ọ bụla nke na-aghọta ịnụ ihe” n’etiti ndị Chineke aghaghị ige ntị mgbe a na-agụrụ ha Iwu ahụ. (Neh. 8:1-3) Ọ bụrụ na ndị mụrụ ụmụ na-etinye uche ná nzukọ ma na-ege ntị nke ọma, o yiri ka ụmụ ha hà ga-eme otú ahụ. Ọ bụghị ihe amamihe dị na ya iji ihe e ji egwuri egwu ma ọ bụ akwụkwọ e ji ese ihe bịa ka ụmụaka jiri ha na-egwuri egwu. Ije n’ụlọ mposi mgbe ọ na-adịghị mkpa na-egbochikwa ha ige ntị. Ebe ọ bụ na ọ bụ “uche gbagọrọ agbagọ ka e kekọtaworo n’obi nwata,” ndị mụrụ ụmụ kwesịrị itinye ezigbo mgbalị iji hụ na ụmụ ha nọ nwayọọ ma na-ege ntị ná nzukọ.—Ilu 22:15.

4 Site n’ịbụ ndị na-ege ntị nke ọma, anyị na-egosipụta na anyị maara ihe n’ezie ma na-achọ ‘ịtụkwasị ihe mmụta n’amamihe’ anyị.—Ilu 1:5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya