Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/01 p. 4
  • Bụrụ Onye Na-eji Obi Ụtọ Eme Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Bụrụ Onye Na-eji Obi Ụtọ Eme Ihe
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ndị Na-eme Okwu ahụ” n’Ọṅụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ọṅụ Jehova Bụ Ike Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ọṅụ Bụ Àgwà Chineke Na-eme Ka Anyị Nwee
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • “Werenụ Ọṅụ Na-ejere Jehova Ozi”
    Ozi Alaeze Anyi—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 1/01 p. 4

Bụrụ Onye Na-eji Obi Ụtọ Eme Ihe

1 Jisọs kwuru na n’oge ọnụnọ ya, ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị mmadụ ‘agaghị ama,’ dị nnọọ ka ọ dị n’ụbọchị Noa. (Mat. 24:37-39) Ya mere, a na-atụ anya na ọtụtụ ndị agaghị ege ntị n’ozi ọma Alaeze ahụ. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-enwe ọṅụ ka anyị na-eje ozi anyị?—Abụ Ọma 100:2.

2 Nke mbụ, ọ dị anyị mkpa iburu n’uche na ma ozi ma ọrụ e nyere anyị nke bụ́ ime nkwusa sitere n’aka Chineke. Aṅaghị ntị n’ozi ahụ, n’agbanyeghị mgbalị kasị mma anyị na-eme, bụ n’ezie ịjụ Jehova. Icheta na ikwesị ntụkwasị obi anyị n’ime nkwusa nwere nnwapụta ya ga-enyere anyị aka ịnọgide na-enwe ọṅụ nakwa obi ụtọ n’ime onwe anyị dị ka ndị na-eme okwu Chineke.—Jes. 1:25.

3 Nke abụọ, a ka nwere ndị ga-anakwere ụzọ Jehova si na-azọpụta ndị mmadụ. Ọ bụ ezie na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nwere ike ghara inwe mmasị, e nwere ndị yiri atụrụ a ka ga-achịkọta, ọbụna ugbu a a bamiworo n’oge ọgwụgwụ. Ọ dị anyị mkpa ịnọgide na-eme nkwusa, na-aga ‘n’obodo ọ bụla ma ọ bụ obodo nta ọ bụla’ iji ‘chọpụta onye kwesịrị n’ime ya.’—Mat. 10:11-13.

4 Nọgide Na-enwe Àgwà Ziri Ezi: Aha ọjọọ nke okpukpe ụgha nwere emewo ka ndị ụfọdụ nwee nkụda mmụọ. Ndị ọzọ abụrụwo ndị usoro ihe a ‘sogburu ma chụsaa.’ (Mat. 9:36) Ọtụtụ ndị pụrụ ịbụ ndị enweghị ọrụ, enweghị nlekọta ahụ ike, na enweghi nchebe meworo ka ike gwụ ha. Ịghọta nke a ga-enyere anyị aka ịnọgidesi ike n’ọrụ anyị. Na-agbalịsi ike ịmalite mkparịta ụka ndị ga-eleba anya n’ihe ndị kasị echegbu ndị mmadụ n’ókèala anyị. Nyere ha aka ịghọta na Alaeze Chineke bụ nanị ihe ngwọta dịnụ. Jiri akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche na isi ihe ndị a kapịrị ọnụ dị ná mbipụta dị iche iche mee ka ozi ọma ahụ ruo n’obi ha.—Hib. 4:12.

5 Ndị ji obi ụtọ na-eme okwu Chineke na-echeta mgbe nile na: “Ọṅụ Jehova bụ ike [anyị].” (Neh. 8:10) Ọ dịghị mkpa ịkwụsị inwe ọṅụ anyị. “Ọ bụrụkwa na ụlọ ahụ kwesịrị, ka udo unu bịakwasị ya: ma ọ bụrụ na o kwesịghị, ka udo unu laghachikwute unu ọzọ.” (Mat. 10:13) Jehova na-eme ka ọṅụ anyị na ume anyị na-adị ọhụrụ ka anyị na-eji ndidi na-anọgide n’ozi ya dị nsọ, ọ na-agọzikwa ikwesị ntụkwasị obi anyị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya