‘Nụrụ, Wee Tụkwasị Ihe Mmụta n’Amamihe Gị’
1 Akwụkwọ Ilu na-akọwa na amamihe na-akpọ òkù, sị: “Nụrụnụ, n’ihi na isi ihe dị iche iche ka m na-ekwu; nsaghe egbugbere ọnụ m ga-abụkwa ihe dị iche iche ziri ezi. Mụ nwe ndụmọdụ na nzube ihe. . . . Geenụ m ntị: n’ihi na ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị na-edebe ụzọ m nile bụ. N’ihi na onye na-achọta m achọtawo ndụ, ọ ga-enwepụtakwa n’aka Jehova na ihe ya ga-atọ Ya ụtọ.” (Ilu 8:6, 14, 32, 35) Okwu ndị ahụ na-akọwa nnọọ nke ọma ntụziaka na-echere anyị ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-ezi Okwu Chineke.”
2 A tụlewo ihe dị òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ mkpa, a kwadebewokwa usoro ihe omume mgbakọ ahụ iji gboo mkpa ndị ahụ. Ntụziaka ime mmụọ na aro ndị bara uru a ga-ewepụta pụrụ, ma ọ bụrụ na e jiri ha mee ihe, inyere anyị aka inwe obi ụtọ, ịnọgide soro Jehova na-enwe mmekọrịta dị mma, na ịnọgide n’ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ ebighị ebi. N’ezie, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji ‘nụrụ, wee tụkwasị ihe mmụta n’amamihe anyị.’—Ilu 1:5.
3 Tupu Ihe Omume Amalite: Iji rite uru n’ụzọ zuru ezu n’ihe a na-ekwu, ọ dị anyị mkpa ịnọ n’oche anyị na inwe ọnọdụ uche kwesịrị ekwesị mgbe ihe omume na-amalite. Nke a na-achọ mmadụ ime ezi nhazi n’onwe ya. Otu isi ihe dị mkpa bụ ịmalite n’oge. Lakpuo n’oge n’abalị bọtara ụbọchị ahụ. Teta n’ezi oge iji mee ka mmadụ nile nọ n’ezinụlọ gị nwee ohere iji jikere na inweta ihe ha ga-eri. Bịarute ebe a na-enwe mgbakọ ahụ n’oge ka i wee nwee ike ịchọta oche na ime ihe ndị dị mkpa tupu ihe omume amalite. Ihe omume ga-amalite n’elekere 9:20 nke ụtụtụ na Friday nakwa n’elekere 9:00 nke ụtụtụ na Saturday na Sunday.
4 Ebe ọ bụ na nzube bụ́ isi nke izukọta bụ ito Jehova “n’ime mkpọkọta mmadụ nile,” nnọkọ nke ọ bụla kwesịrị ịmalite n’ụzọ ga-ebuli Chineke anyị elu. (Ọma 26:12) Iji mezuo nke ahụ, a na-agba mmadụ nile ume ịnọrọ oche tupu a kpọọ abụ mmeghe. Nke a kwekọrọ na ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ bụ́: “Ka e mee ihe nile n’ụzọ dị mma n’anya, na n’usoro.” (1 Kọr. 14:40) Gịnị ka nke ahụ pụtara nye onye ọ bụla n’ime anyị? Mgbe ị hụrụ onyeisi oche ka ọ nọdụrụ ala n’elu ikpo okwu n’oge olu ụtọ, gaa nọdụ oche ozugbo. Nke a ga-eme ka i nwee ike iji obi gị nile kere òkè n’abụ a ga-eji amalite nnọkọ nke ọ bụla, na-eto Jehova.—Ọma 149:1.
5 Mgbe Ihe Omume Na-aga n’Ihu: Ezra “doziri obi ya ịchọ iwu Jehova, na ime ya.” (Ezra 7:10) Olee otú anyị pụrụ isi dozie obi anỵi iji nata ntụziaka Jehova na-enye? Ka ị na-atụle isiokwu nke ihe omume dị iche iche e depụtara n’usoro ihe omume e biri ebi, jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka Jehova na-agwa m site n’usoro ihe omume a? Olee otú m pụrụ isi jiri ihe ọmụma ahụ mee ihe iji baara onwe m na ezinụlọ m uru?’ (Aịsa. 30:21; Efe. 5:17) Nọgide na-ajụ ajụjụ ndị ahụ n’oge nile mgbakọ ahụ ga na-aga n’ihu. Detuo isi ihe ndị ị na-eme atụmatụ iji mee ihe. Wepụta oge kwurịta ha mgbe e mechisịrị nnọkọ n’ụbọchị ọ bụla. Nke a ga-enyere gị aka ịnọgide na-echeta ma jiri ihe ọmụma ahụ na-eme ihe.
6 Itinye uche n’ihe ruo ọtụtụ awa n’akwụsịtụghị akwụsị pụrụ ịbụ ihe siri ike. Gịnị pụrụ inyere anyị aka iguzogide omume nke ichewe ihe ọzọ? Jiri ikike anya gị nwere mee ihe. Ruo n’ókè dị ukwuu, ebe anyị lekwasịrị anya anyị bụ ebe uche anyị na-adị. (Mat. 6:22) Ya mere, guzogide ọchịchọ nke ịtụgharị ma ị nụ mkpọtụ ọ bụla ma ọ bụ ma ihe ọ bụla megharịa ahụ. Legide ọkà okwu anya. Na-ele anya na Bible nke gị mgbe a na-agụ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ, sapeekwa Bible gị asapee mgbe a na-atụle amaokwu ahụ.
7 Ịhụnanya ndị Kraịst ga-akpali anyị izere inye ndị ọzọ nsogbu mgbe ihe omume na-aga n’ihu. (1 Kọr. 13:5) Nke a bụ oge “ịgba nkịtị” na ige ntị. (Ekli. 3:7) Ya mere, zere ikwu okwu ndị na-adịghị mkpa na ịgagharị agagharị. Belata ugboro ole ị na-aga n’ụlọ mposi site n’ibu ụzọ mee atụmatụ. Erila ihe ma ọ bụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ tupu oge e wepụtara maka ya, ọ gwụla ma i nwere nnukwute nsogbu ahụ ike. Ndị ga-eji fon cellular ha, ìgwè camcorder, na kamera ha bịa ekwesịghị iji ha mee ihe n’ụzọ ga-adọpụ uche ndị ọzọ. Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ime ndokwa ka ezinụlọ ha dum—gụnyere ndị nọ n’afọ iri na ụma—nọkọta ọnụ ka ha wee nwee ike ilekọta ụmụ ha nke ọma.—Ilu 29:15.
8 N’afọ gara aga, otu okenye nke nọworo na-aga mgbakọ eri ọtụtụ iri afọ kwuru, sị: “Echere m na mgbakọ a magburu onwe ya n’ihi otu ihe ọzọ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla na-ege ntị nọ na-edetu ihe, tinyere ụmụaka. Ọ na-enye obi ụtọ ịhụ ya. E ji Bible mee ihe nke ọma mgbe ndị ọkà okwu kwuru ka a sapeta akụkụ ụfọdu.” Ụdị ịṅa ntị nke ọma dị otú ahụ kwesịrị ịja mma n’ezie. Ọ bụghị nanị na ọ na-abara anyị na ndị ibe anyị bịara mgbakọ uru kama, nke ka nke, ọ na-ewetara Onye Nkụzi Ukwu anyị, bụ́ Jehova Chineke otuto.—Aịsa. 30:20.