Ịgbakọta Ọnụ Iji Nye Jehova Otuto
1. Gịnị bụ isiokwu mgbakọ distrikti, n’ihi gịnịkwa ka Jehova ji kwesị ka anyị nye ya otuto?
1 Jehova bụ onye kasị ike, onye nwere amamihe na-enweghị atụ, onye zuru okè n’ikpe ikpe ziri ezi, bụrụkwa ịhụnanya n’onwe ya. Dị ka Onye Okike, Onye na-enye ndụ, na Eze eluigwe na ala, ọ bụ nanị ya ka anyị kwesịrị ife ofufe. (Ọma 36:9; Mkpu. 4:11; 15:3, 4) Mgbakọ Distrikti “Nye Chineke Otuto” nke afọ a ga-eme ka mkpebi anyị mere inye ya otuto dị ka nanị ezi Chineke ahụ sikwuo ike.—Ọma 86:8-10.
2, 3. Olee otú ime atụmatụ dị mma ga-esi mee ka anyị nwee ike irite uru n’ụzọ zuru ezu?
2 Ọ Dị Mkpa Ime Atụmatụ Dị Mma: Iji rite uru n’ụzọ zuru ezu site n’oriri ime mmụọ Jehova kwadebere, ọ dị anyị mkpa ime atụmatụ dị mma. (Efe. 5:15, 16) Ì mechaala ndokwa maka ebe obibi, ụgbọ njem, ma nata ikike iji hapụ ọrụ ma ọ bụ ghaa akwụkwọ? Ahapụla ihe ndị a dị mkpa ruo mgbe oge gachawarala. Ọ bụrụ na i gbuo oge n’ịnata ikike iji hapụ ọrụ ma ọ bụ ghaa akwụkwọ, akụkụ ụfọdụ nke ihe omume a na-enye ọṅụ pụrụ ịkwa gị. Ọ dị anyị nile mkpa ịnọ ya ná nnọkọ nke ọ bụla.
3 Mee ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ gị irute n’ala mgbakọ n’oge n’ụbọchị nke ọ bụla. Nke ahụ ga-eme ka i nwee ike ịnọdụ n’oche gị tupu a malite ịbụ abụ mmeghe, ọ ga-enyekwa aka ime ka ahụ́ ruo gị ala iji nara ntụziaka ndị a ga-enye. Biko akụtala oche maka ndị ọzọ na-abụghị ndị òtù ezinụlọ gị ma ọ bụ ndị gị na ha so n’otu ụgbọala.
4. N’ihi gịnị ka e ji na-arịọ ka anyị nile jiri ihe anyị ga-eri n’ehihie bịa mgbakọ?
4 A na-arịọ ka mmadụ nile jiri ihe ha ga-eri n’ehihie bịa kama isi n’ala mgbakọ pụọ iji zụrụ ihe oriri n’oge nkwụsịtụ nke ehihie. Ịgbaso ndokwa a ga-eso mee ka nsogbu ghara ịdị ma mee ka anyị nwekwuo oge iji soro ndị kwere ekwe ibe anyị kpakọrịta. (Ọma 133:1-3) Biko buru n’uche na a chọghị ka e webata karama na arịa ndị na-akụwa akụwa na ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya n’ala mgbakọ.
5. Olee otú anyị pụrụ isi malite ịkwadebe obi anyị maka mgbakọ ahụ?
5 Gee Ntị Ma Mụta Ihe: Ezra ji ekpere kwadebe obi ya ịnara okwu Chineke. (Ezra 7:10) O tinyere obi ya n’ihe Jehova na-akụzi. (Ilu 2:2) Anyị pụrụ ịmalite ịkwadebe obi anyị maka mgbakọ ahụ ọbụna tupu anyị agawa, site n’ịtụgharị uche n’isiokwu mgbakọ ahụ na iso ezinụlọ anyị kwurịta ya.
6. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ime ka uche anyị dịgịde n’usoro ihe omume ahụ? (Lee igbe.)
6 Ná nnukwu ụlọ mgbakọ, a pụrụ inwe ọtụtụ ihe anyị ga-ahụ ma nụ, bụ́ ndị pụrụ ịdọpụ uche anyị. Ihe ndọpụ uche ndị dị otú ahụ pụrụ, n’ụzọ dị mfe, ime ka uche anyị ghara ịdị n’ihe ọkà okwu na-ekwu. Mgbe nke ahụ mere, anyị agaghị anụ mgbe e kwuru ihe dị mkpa. Aro ndị dị n’igbe ya na isiokwu a so pụrụ inyere anyị aka ime ka anyị na-etinyekwu uche n’ihe.
7, 8. Olee otú anyị pụrụ isi chebara ndị ọzọ echiche, gịnịkwa ka ndị na-adịghị anụ ihe nke ọma kwesịrị ime iji rite uru zuru ezu n’usoro ihe omume ahụ?
7 Chebara Ndị Ọzọ Echiche: A pụrụ iji kamera na vidio mee ihe n’oge ihe omume na-aga n’ihu, ma iji zere ịdọpụ uche ndị ọzọ, nọrọ n’oche gị mgbe i ji ha eme ihe. A ghaghị ịgbanyụlata fon ndị a na-eji agagharị agagharị na ígwè ozi bụ́ pager ka ha ghara ịdọpụ uche ndị ọzọ. Ndị na-adịghị anụ ihe nke ọma pụrụ ịnọdewe ígwè okwu nke na-eme ka okwu daa ụda iji rite uru n’ụzọ zuru ezu site n’ihe omume ahụ. Ọ dịghị onye kwesịrị ịkwụnye ngwá eletronic ya n’ebe a na-akwụnye ihe n’eletrik ma ọ bụ n’ígwè okwu e ji eme ihe n’ụlọ mgbakọ ahụ.
8 Lee ka anyị si atụsi anya ike ịgbakọta ọnụ iji nye Jehova otuto! Ka anyị kpebisie ike inye ya otuto site n’ịga nnọkọ nke ọ bụla, site n’ige ntị nke ọma, nakwa site n’itinye ihe anyị mụtara n’ọrụ.—Deut. 31:12.
Igbe dị na peeji nke 3]
Ige Ntị ná Mgbakọ
▪ Tụgharịa uche n’isiokwu nke okwu ndị a ga-ekwu
▪ Sapeta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e hotara
▪ Detuo ihe dị nkenke
▪ Rịba isi ihe ndị ị ga-etinye n’ọrụ ama
▪ Tụleghachi ihe ị mụtara