Ị̀ Pụrụ Ije Ozi n’Ebe E Nwere Mkpa Ka Ukwuu?
1 Ọ̀ dịtụwo mgbe ọ bụla i chere echiche banyere ịkwaga n’ebe e nwere mkpa maka inwekwu ndị nkwusa Alaeze? Ọ bụrụ na a kpọọ gị ‘ịgafeta ma nye aka,’ ị̀ ga-aga dị ka Pọl onyeozi gara? (Ọrụ 16:9, 10) N’ọtụtụ ọgbakọ, e nwere mkpa maka ezinụlọ ndị tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ, ndị ọsụ ụzọ iji nye aka n’ịrụzu ókèala ha ma ọ bụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ruru eru iji nye aka n’idu ndú. Ókèala ahụ pụrụ ịbụ nke obodo ndị dịpụrụ adịpụ bụ́ ndị dịgasị n’ógbè ndị buru ibu na-emepeghị emepe mejupụtara. Ụlọ Nzukọ Alaeze kasị nso nwere ike jiri ọtụtụ kilomita dịpụ adịpụ n’ebe ahụ. Ọrụ ego nwere ike kọọ ụkọ. Ihu igwe nwere ike ghara ịdị na-adị mma mgbe nile. Ị̀ ga-adị njikere ịnakwere ihe ịma aka dị otú ahụ? Olee otú ọ ga-esi kwe omume inwe ihe ịga nke ọma na ya?
2 Okwukwe na Ntụkwasị Obi Dị Mkpa: Ná nduzi Chineke, Abram kpọọrọ nwunye ya, nwa nwoke nke nwanne ya nwoke, na nna ya meworo agadi, bụ́ Tira, hapụ obodo a mụrụ ya bụ́ Ua ma mee njem 1,000 kilomita gaa Heran. (Jen. 11:31, 32; Neh. 9:7) Mgbe Tira nwụrụ, Jehova nyere Abram, bụ́ onye dị afọ 75 mgbe ahụ, iwu ka ọ hapụ Heran na ndị ikwu ya ma mee njem gaa ná mba nke Chineke ga-egosi ya. Abram, Seraị, na Lọt “wee pụọ” ije. (Jen. 12:1, 4, 5) N’ezie, Abram agajeghị ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị ozi. Ma ọpụpụ ya chọrọ otu ihe. Ọ̀ bụ gịnị?
3 O were Abram okwukwe na ntụkwasị obi iji nwaa ime ihe dị otú ahụ. Echiche ya na ụzọ ndụ ya aghaghị ịgbanwe. Ọ ghaghị ịhapụ ndị ikwu ya bụ́ ndị ọ na-enwe mmetụta nke ịnọ ná nchebe n’etiti ha. Ma ọ tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-elekọta ya na ezinụlọ ya. Ọtụtụ ndị taa egosipụtawo ntụkwasị obi ha n’ebe Jehova nọ n’ụzọ yiri nke ahụ.
4 Ọrụ Ndị Na-adịru Nwa Oge: Ị̀ nụtụwo ụtọ ngọzi ndị bara ụba bụ́ ndị na-esite n’ịrụ ọrụ n’ókèala ị na-eketaghị ọrụ? N’afọ gara aga na United States of America, ndị nkwusa 5,699 jezuru ozi na 163 n’ime ókèala 174 a na-eketaghị ọrụ. Ndị nkwusa 5,676 ọzọ nyeere ọgbakọ 380 aka ịrụzu ókèala a na-adịghị arụkebe ọrụ na ya. Nye ụfọdụ ndị, nke a gụnyere ime njem ndị tere oké aka. Ò kwesịrị mgbalị e tinyere?
5 Otu nwanna nwoke bụ́ onye mere ụdị njem ahụ dere, sị: “Mgbe mbụ a gwara m ka m kpọrọ otu ìgwè gaa n’ókèala a na-adịghị arụkebe ọrụ na ya, ọ bụchaghị ọchịchọ m. Ma ekpebiri m ịnakwere ọrụ ahụ. Ọ bụghị nanị na m akwabeghị ụta ma ọlị maka ya, kama ọ gbanwewo ndụ m. Ana m ekele Jehova kwa ụbọchị maka ihe ùgwù nke iso na njem a.” Nwanna nwoke ọzọ kwuru na ọ bụ ahụmahụ kwesịrị ncheta karịsịa n’ime afọ 20 ọ nọworo n’eziokwu! Otu onye nọ n’afọ iri na ụma bụ́ onye gara ebe e nwere mkpa kwuru, sị: “Nke a bụ ahụmahụ kasị mma ná ndụ m!” Ihe ka ukwuu ná ndị nkwusa na-ekwenye na ọbụna ije ozi ruo nwa oge n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu emewo ka ha nwekwuo mmasị maka ozi ubi. Soro ndị meworo ya kwurịta okwu. Ị ga-ahụ na e wuliri ha elu n’ụzọ ime mmụọ nakwa na ikekwe ha ga-eme ya ọzọ ma ọ bụrụ na e nye ha ohere.
6 Ịnakwere ọrụ nwa oge iji jee ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu pụrụ imezu nzube ọzọ. Ndị na-eme otú ahụ pụrụ inweta ihe ọmụma bara uru iji nyere ha aka ‘ịgụ ihe ịkwaga n’akụkụ ọzọ nke mba ahụ ga-ewe.’—Luk 14:28.
7 Jehova ekpebiwo na a ga-akpọsa ozi ọma “n’elu ụwa dum mmadụ bi” tupu ọgwụgwụ eruo. (Matiu 24:14) N’ịmara nke a, ọ bụrụ na i nwere ike, ị̀ ga-adị njikere ịkwaga n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu? E nwere mkpa ahụ n’ọtụtụ ebe.
8 Ịkwaga n’Ebe E Nwere Mkpa Ka Ukwuu: Ị̀ lawo ezumike nká? Ì nwere ihe na-enye gị ego mgbe nile? Ma ọ́ bụghị otú ahụ, ị̀ pụrụ ime ndokwa maka inwe ọrụ nke aka gị ị ga-eji na-akpata ego? Ì nwere ike ịkpata ihe e ji ebi ndụ n’ebe ọ bụla na mba a? Ọ bụrụ na ị pụghị ịkwaga n’ebe ọzọ, ị̀ pụrụ inyere onye òtù ezinụlọ gị aka ije ozi n’ebe ọzọ?
9 Ọ bụrụ na i jirisịa ekpere tụlee nke a ma chee na ị ga-echeli ihe ịma aka nke ịkwaga n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu ihu, soro ezinụlọ gị na ndị okenye ọgbakọ gị kwurịta ya. E mesịa, dee akwụkwọ ozi ma nye ya ndị okenye ka ha wee nwee ike idenye nchọpụta ha na aro ha tupu ha ezite ya n’alaka ụlọ ọrụ.
10 Gịnị ka i kwesịrị idenye n’akwụkwọ ozi gị? Afọ ndụ gị, ụbọchị baptism gị, ibu ọrụ ndị i nwere n’ọgbakọ, ma ị̀ bụ onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye ka ọ bụ na ị bụghị, nakwa ma ì nwere obere ụmụaka. Kwuo steeti ma ọ bụ ebe ndị ị ga-achọ ije ozi na ha, na-adabere ná mkpa onwe onye gị.
11 Ì nwere ịnụ ọkụ n’obi ma na-ebute ụzọ n’ihe? Ọnọdụ gị ọ̀ ga-ekwe gị ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu? Ya bụrụ otú ahụ, mgbe ahụ, chọpụta otú Jehova si awụpụ ngọzi ya n’ụba n’esepụghị aka n’ebe ndị tụkwasịrị ya obi nọ ka ha na-egosipụta mmụọ nke ịchụ onwe onye n’àjà!—Ọma 34:8; Mal. 3:10.