Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
Ụlọ Nche Dec. 15
“N’oge a n’afọ, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-eche echiche banyere Jisọs Kraịst, ma hà kwere na ya ma ọ bụ na ha ekweghị. Ndị ụfọdụ na-ekwu na ọ bụghị onye dịrị adị. Gịnị ka i chere? [Mgbe ọ zaghachisịrị, gụọ Matiu 16:15, 16.] Eji m n’aka na ị ga-enwe mmasị ịgụ isiokwu a na-ekwu banyere ‘Jisọs nke Bụ́ Ezigbo Ya’ iji hụ otú o si emetụta gị taa na otú ọ ga-esi metụta gị n’ọdịnihu.”
Teta! Jan. 8
“Í cheghị na iji mee ka ndụ bụrụ nke e ji n’aka, ọ dị anyị mkpa inwe ihe oriri na-adịghị ize ndụ, nke a pụrụ ịdabere na ya? [Nye ohere maka nzaghachi.] Rịba ama ihe Chineke kwere ndị ya ná nkwa n’oge Bible. [Gụọ Levitikọs 26:4, 5.] Teta! na-atụle nchegbu ndị a na-enwe taa banyere ihe oriri anyị. Ọ na-ezokwa aka n’oge mgbe Chineke ga-eme ka anyị nọrọ ná nchebe n’ụwa nile.”
Ụlọ Nche Jan. 1
“Ị̀ na-eche ihe mere o ji yie ka ndụ ọ̀ na-agara ụfọdụ ndị were were ebe ndị ọzọ na-adọlị iji nweta ihe ha ga-eji bie ndụ? Ọ dị ihe Bible kwuru banyere nke ahụ. [Gụọ Job 34:19.] N’ime magazin a, a kọwara otú Chineke zubere isi mee ka ịkpa ókè ọkwá bụrụ ihe na-agaghịzi adị.”
Teta! Jan. 8
“Anyị nile maara banyere ọdachi a mere ka ụwa maa jijiji. Kemgbe ahụ, nkasi obi na enyemaka dị ndị mmadụ mkpa nke ukwuu. Isiokwu a, gụnyere ihe ndị ọzọ, na-akọwa ihe Ndịàmà Jehova nọworo na-eme iji nyere ndị lanarịrịnụ, ndị ọrụ a zụrụ maka ihe mberede, na ndị mmadụ nwụnahụrụ aka.”