Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/02 p. 1
  • Nkwusa Alaeze Na-enye Aka Azọpụta Ndụ!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkwusa Alaeze Na-enye Aka Azọpụta Ndụ!
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • “Na-ezisa Ozi Ọma nke Ezi Ihe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • “Gaanụ Mee Ndị Mba Niile Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ M”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma!
    Ozi Alaeze Anyi—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 4/02 p. 1

Nkwusa Alaeze Na-enye Aka Azọpụta Ndụ!

1 Ọ bụ ọrụ kasị mkpa a na-arụ n’ụwa n’oge a. Jehova Chineke, Jizọs Kraịst, na imerime ndị mmụọ ozi atụkwasịwo uche ha na ya. Gịnị ka ọ bụ, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị oké mkpa? Ọ bụ nkwusa Alaeze, ọ na-enyekwa aka azọpụta ndụ!—Rom 1:16; 10:13, 14.

2 Ụfọdụ ndị pụrụ iche na anyị pụrụ inyere ndị ọzọ aka karị ma ọ bụrụ na anyị etinye aka n’ịgbalị ime ka ụwa gbara anyị gburugburu ka mma. Ọtụtụ ndị mikpuru onwe ha ná mgbalị iji weta udo, gwọọ ọrịa dị iche iche, ma ọ bụ mee ka ọnọdụ akụ̀ na ụba ka mma. Ma gịnị ga-enyere ndị mmadụ aka karịsịa?

3 Ọrụ Dị Oké Mkpa: Ọ bụ nanị ozi Alaeze ahụ na-akọwa nzube nke ndụ, ihe kpatara nhụjuanya ụmụ mmadụ, nakwa ihe bụ nanị olileanya a pụrụ ịdabere na ya maka ọdịnihu. Ozi ọma ahụ na-eme ka ndị mmadụ nwee ike ịghọ ndị enyi Jehova ma si otú ahụ nweta “udo nke Chineke nke karịrị echiche nile.” (Fil. 4:7) Ọ bụ nanị ozi Alaeze ahụ na-enye nduzi dị irè iji nyere ndị mmadụ aka ịnagide nsogbu nke ndụ ugbu a, na-akọwakwa otú mmadụ pụrụ isi bụrụ onye e chebere mgbe a ga-ebibi ajọ ụwa a n’ọdịnihu. (1 Jọn 2:17) Nke ahụ ó kwesịghị mgbalị nile anyị pụrụ itinye ná nkwusa Alaeze ahụ?

4 Iji maa atụ: Olee ụzọ kasị mma isi nyere obodo na-ehi ụra aka bụ́ nke nọ n’ihe ize ndụ n’ihi ihe mgbochi mmiri na-achọ ịgbawa agbawa? Ọ̀ bụ site n’ikupụsịwa mmiri site n’ihe mgbochi mmiri ahụ na-esighịzi ike? Ịchọ obodo ahụ ọdachi na-eche ihu mma? Ee e! A ghaghị ịkpọte ndị obodo ahụ, dọọ ha aka ná ntị banyere ọdachi na-achọ iwere ọnọdụ, ma nyere ha aka ịgbapụ! Ndị na-ehi ụra n’ụzọ ime mmụọ taa nọ n’oké ihe ize ndụ. (Luk 21:34-36) Ebe ọ bụ na usoro ihe a ga-agabiga n’oge na-adịghị anya, ka anyị gbalịsie ike iji ịdị ngwa kasịnụ na-eme nkwusa nye mmadụ nile ruo n’ókè ọ pụrụ ikwe mee!—2 Tim. 4:2; 2 Pita 3:11, 12.

5 Nọgidesie Ike na Ya: Ka anyị chọọ ụzọ ndị anyị ga-esi jiri ozi ọma a jekwurukwuo ndị nwere ezi obi—n’ebe obibi ha, n’okporo ámá, na telifon, nakwa n’ụzọ mberede. Ọrụ Jehova nyeworo anyị ịrụ bụ ọrụ kasị mkpa anyị pụrụ ịrụ. Ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi rụọ ya, anyị ‘ga-azọpụta ma onwe anyị ma ndị na-ege anyị ntị.’—1 Tim. 4:16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya