Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma!
1. Olee agbamume Pọl nyere, bụ́ nke anyị kwesịrị ilebara anya?
1 “Kwusaa okwu Chineke, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ya.” (2 Tim. 4:2) Gịnị mere agbamume a Pọl nyere ji dị ezigbo mkpa n’oge anyị a? Olee otú ihe a o kwuru ga-esi emetụta ndụ anyị na nke ndị ọzọ?
2. Gịnị mere anyị ji agba mbọ achọ ndị na-anụbeghị ozi ọma ahụ?
2 O Metụtara Ndụ Ndị Mmadụ: E nwere ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa, bụ́ ndị na-anụbeghị ozi ọma ahụ nke nwere ike ime ka a zọpụta ha. (Rom 10:13-15; 1 Tim. 4:16) Ọtụtụ ndị obi ha ziri ezi nọ n’ókèala ndị anyị na-ekwusakarị ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị agaa n’ụlọ ndị mmadụ n’ụbọchị ma ọ bụ n’oge anyị na-ejibughị aga na nke ha, anyị nwere ike ịhụ onye anyị na-ahụbeghị mbụ. Isi otú a gbaa mbọ chọọ ndị na-anụbeghị ozi ọma ga-eme ka anyị nwee akọnuche dị ọcha, meekwa ka ikpe ọbara ghara ịma anyị.—Ọrụ 20:26.
3. Olee otú anyị nwere ike isi jiri oge anyị na-eme ihe otú kwesịrị ekwesị mgbe anyị nọ ozi ọma?
3 N’agbanyeghị na a kpagburu Ndị Kraịst narị afọ mbụ n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ, ha ‘mere ka ozizi ha jupụta Jeruselem.’ (Ọrụ 5:28) Ànyị ekpebisiela ike na anyị ga ‘na-agba àmà nke ọma’ otú ahụ ha mere? (Ọrụ 10:42) Mgbe anyị nọ ozi ọma, ànyị na-eji oge ahụ eme ihe otú kwesịrị ekwesị? Ọ bụrụ na e nwere ihe mere o ji dị mkpa na anyị ga-echere ndị anyị na ha so gaa ozi ọma, ànyị na-eji oge ahụ ezi ndị na-agafe agafe ozi ọma?
4. Olee otú iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma si enyere anyị aka ịna-eche nche?
4 Ọ Na-eme Ka Anyị Mụrụkwuo Anya: Ebe ọ bụ na ọgwụgwụ nke usoro ihe a dị nso, anyị kwesịrị ịmụrụ anya, ma na-eche nche. (1 Tesa. 5:1-6) Ọ bụrụ na anyị na-ekwukarị banyere Alaeze Chineke, ọ ga-eme ka nchegbu nke oge a ghara ịnyịgbu anyị. (Luk 21:34-36) Ọ bụrụkwa na anyị “na-eburu ọbịbịa nke ụbọchị Jehova n’uche,” ọ ga-eme ka anyị na-ewepụtakwu oge na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma nke na-azọpụta ndụ.—2 Pita 3:11, 12.
5. Iji gosi na anyị ji ndụ kpọrọ ihe, gịnị ka anyị ga-eme n’ozi anyị?
5 Mgbe anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, anyị na-egosi na anyị na-ele ndụ anya otú Jehova si ele ya, n’ihi na ‘Jehova achọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.’ (2 Pita 3:9; Ezik. 33:11) Ka anyị kpebisie ike na anyị ga na-ekwusara ndị niile nọ n’ókèala anyị ozi ọma, ka otuto niile gaara Jehova!—Ọma 109:30.