Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/02 p. 4
  • “Na-achụso Ihe Dị Mma Mgbe Nile”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Na-achụso Ihe Dị Mma Mgbe Nile”
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbakọ Distrikti “Okwu Amụma nke Chineke” nke Ndịàmà Jehova nke 1999
    Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Bụrụ Ihe Nlereanya n’Ezi Ọrụ
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Mgbakọ Distrikti nke Ndịàmà Jehova nke Afọ 2008
    Ozi Alaeze Anyi—2008
  • “Na-emenụ Omume Dị Mma Na-etiti Ndị Mba Ọzọ”
    Ozi Alaeze Anyi—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 9/02 p. 4

“Na-achụso Ihe Dị Mma Mgbe Nile”

1 Ụzọ ndụ nke Ndị Kraịst na-agụnye ịdị ‘na-achụso ihe dị mma mgbe nile n’ebe mmadụ nile nọ.’ (1 Tesa. 5:15) Mgbe anyị na-aga mgbakọ distrikti, anyị nwere ọtụtụ ohere iji meere ndị ọzọ ihe dị mma. N’oge ndị ahụ, ọha na eze na-ele anyị, ndị nile anyị na ha mekọrọ ihe na-eme mkpebi banyere ụdị ndị anyị bụ dabere n’otú anyị si mesoo ha omume. Iji chebe aha ọma anyị dị ka Ndịàmà Jehova, ọ dị anyị mkpa igosi site n’omume anyị na anyị ‘na-asọpụrụ ụdị mmadụ ọ bụla.’ (1 Pita 2:17) Nke ahụ na-agụnye ‘ilekwasị anya, ọ bụghị n’igosi mmasị onwe onye nanị n’ihe ndị metụtara anyị, kamakwa n’igosi mmasị onwe onye n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ.’ (Fil. 2:4) Tụlee otú nke a si emetụta ndokwa maka ebe obibi nke mgbakọ na-eme.

2 Ì tinyewo akwụkwọ maka inweta ebe obibi? (1) Ebe Ngalaba Ụlọ Obibi chọrọ itinye ndị mmadụ n’ọnụ ụlọ nile e nwere, etinyela akwụkwọ maka ọnụ ụlọ karịrị ọnụ ụlọ ole ị na-eme atụmatụ iji mee ihe. (2) Atụla anya ka Ngalaba Ụlọ Obibi debere gị ụlọ ọ gwụla ma i bu ụzọ tinye akwụkwọ maka ụlọ obibi n’oge tupu ị garuo. (3) Mgbe i rutere ná mgbakọ, nwee ndidi ma kwanyere ụmụnna na-arụ ọrụ na Ngalaba Ụlọ Obibi ùgwù ka ha na-agbalị inye gị ụlọ. (4) Rube isi n’iwu onye nwe ụlọ (ma ọ bụ iwu họtel ị nọ na ya ma ọ bụrụ na ị nọ na họtel) nyere banyere otú e si eji ogige ya eme ihe.

3 Ịkụziri Ụmụaka Ụzọ Isi Na-eme Ihe Ọma: Mgbe ụfọdụ, ụmụaka ndị a hapụrụ n’ebe ndị e nyere ha ụlọ n’enweghị onye toro eto na-elekọta ha akpatawo nsogbu. (Ilu 29:15) N’ọnọdụ ụfọdụ, ndị nne na nna nọ na-eme ihe ndị ọzọ ma hapụ ụmụ ha n’ụlọ, n’ebe igwu mmiri, ma ọ bụ n’ebe ọzọ n’enweghị onye na-elekọta ha. Ụfọdụ ụmụaka na-akpa aghara nke ukwuu nke na onye nwe ụlọ ga-ewere ya na ọ dị mkpa igbochi ha iji ihe ụfọdụ eme ihe. Nke a kpataara ndị ọzọ bi n’ebe ahụ, ma Ndịàmà ma ndị na-abụghị Ndịàmà, nsogbu na ihe isi ike.

4 Ndị mụrụ ụmụ, tupu mgbakọ eruo, ọ ga-abụ ihe bara uru iwepụta oge ma soro ụmụ unu tụleghachi ụdị àgwà Ndị Kraịst nke a na-atụ anya ya n’aka ha mgbe nile na n’ebe nile. (Efe. 6:4) Dị ka ihe atụ, meenụ ka ha ghọta na ezi ịhụnanya nke Ndị Kraịst ‘adịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya, ọ dịghị abụ nke a kpasuru iwe.’ (1 Kọr. 13:5) Ndị toworo eto pụrụ imesi okwu ndị a ike site n’isetịpụ ihe nlereanya kwesịrị ekwesị ka mmadụ nile na-ahụ ya. Ụmụaka, unu pụrụ ịchụso ihe ọma site n’irubere ndị mụrụ unu isi, igosi nkwanye ùgwù maka ihe ndị dị n’ebe ndị e nyere unu ụlọ, nakwa ichebara ndị nọ unu gburugburu echiche. (Kọl. 3:20) Ka anyị ji ịdị n’otu na-agbalịsi ike ime ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ, anyị ‘na-achọ ozizi Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, mma n’ihe nile.’—Taị. 2:10.

5 Àgwà ọma anyị na-enwe mmetụta dị mma ọ bụghị nanị n’ebe ndị na-ekiri anyị nọ n’ozuzu ha, kamakwa n’ebe ndị na-akatọ anyị n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ nọ. N’ihe nile anyị na-eme ná mgbakọ na n’obodo ebe a na-eme mgbakọ ahụ—ma ànyị na-aga ije n’okporo ámá, na-eri nri n’ụlọ nri, na-ezuru ike na họtel, ma ọ bụ jiri ohere dapụtaranụ na-agba àmà mberede—okwu na omume anyị dị ka Ndị Kraịst kwesịrị igosi na anyị chọrọ ịchụso ihe ọma.

Igbe dị na peeji nke 4]

Biko Cheta:

■ Nwee ndidi ma na-akwanyere ụmụnna na-arụ ọrụ na Ngalaba Ụlọ Obibi ùgwù.

■ Rube isi n’iwu nile onye nwe ụlọ ma ọ bụ họtel nyere, maka abamuru nke ndị nile bi ebe ahụ.

■ Na-eleru anya nke ọma n’ihe ụmụ gị na-eme.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya