Bụrụ Ihe Nlereanya n’Ezi Ọrụ
1. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị kpachara anya karịsịa banyere omume anyị ná mgbakọ distrikti?
1 Mgbe anyị gbakọtara ọnụ n’ọnụ ọgụgụ buru ibu ná mgbakọ distrikti, ndị na-ekiri ihe na-emenụ na-abịa hụkwuo ụzọ anyị si eme omume na otú anyị si emeso ndị ọzọ ihe. Ya mere, ọ dị onye ọ bụla n’ime anyị mkpa ichebara ndụmọdụ Bible a echiche n’ụzọ pụrụ iche: “[Nwee] uche zuru okè, na-egosi onwe gị ịbụ ihe nlereanya nke ezi ọrụ n’ihe nile.” (Taị. 2:6, 7) Ọ pụrụ ịdị mkpa itinyekwu mgbalị iji ‘na-elekwasị anya, ọ bụghị n’igosi mmasị onwe onye nanị n’ihe ndị metụtara anyị, kamakwa n’igosi mmasị onwe onye n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ.’ (Fil. 2:4) Ka anyị tụlee ebe ụfọdụ anyị pụrụ itinye agbamume a n’ọrụ ná Mgbakọ Distrikti “Nye Chineke Otuto,” nke na-abịanụ.
2. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche banyere ndokwa ndị e mere maka ebe obibi?
2 Ndokwa Ndị E Mere Maka Ebe Obibi: Ọ dị oké mkpa ka anyị nile kwenyere ndokwa ndị na-ahazi mgbakọ mere. Nke a dị mkpa karịsịa mgbe anyị na-eme ndokwa maka ebe anyị ga-ebi. N’ezie, a chọrọ ọtụtụ narị ọnụ ụlọ maka mgbakọ nke ọ bụla. Ihe ka ọtụtụ n’ụmụnna anyị enwechaghị ego, ha chọkwara ụlọ ndị dị ọnụ ala. E mewo mgbalị dị ukwuu iji hụ na ụgwọ ụlọ dị ala ruo ókè o kwere mee. Anyị aghaghị iji ịhụnanya chebara mkpa nke ndị ọzọ echiche ma ‘na-elekwasị anya, ọ bụghị n’igosi mmasị onwe onye nanị n’ihe ndị metụtara anyị, kamakwa n’igosi mmasị onwe onye n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ.’—Fil. 2:4.
3. Olee otú anyị pụrụ isi “na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ” na họtel?
3 Ọ bụrụ na e nyere anyị ụlọ na họtel, e kwesịrị ịhụ mmasị onwe onye anyị nwere n’ebe ndị ọzọ nọ n’ụzọ anyị si eji ihe ndị e nwere na họtel eme ihe. Ndị ọrụ họtel ga-enwe ekele mgbe anyị gosịrị àgwà nke ichebara ndị ọzọ echiche site n’iji nlezianya gbasoo ụkpụrụ nduzi ndị na-achịkwa họtel. N’ụzọ ndị dị otú a, anyị ga “na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ,” ma si otú ahụ na-agbara ndị ọzọ ezi àmà.—Gal. 6:10.
4, 5. Olee otú ụmụaka pụrụ isi wetara Jehova otuto, oleekwa ibu ọrụ ndị mụrụ ụmụ nwere?
4 Ndị Mụrụ Ụmụ na Ụmụ Ha: N’ụwa nke ọtụtụ ndị ntorobịa na-akpa àgwà ọjọọ, ụmụ anyị gbapụrụ iche n’ụzọ dị ịrịba ama, nke a na-ewetakwara Jehova na nzukọ ya otuto. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, e nwewo nsogbu mgbe a na-elebaraghị ụmụaka anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (Ilu 29:15) Ndị mụrụ ụmụ ekwesịghị ịhapụ ụmụ ha n’elekọtaghị ha anya na họtel, gụnyere n’ebe a na-egwu mmiri, ma ọ bụ n’ala mgbakọ.
5 Tupu mgbakọ amalite, ụfọdụ ndị nne na nna ahụtawo ya dị ka ihe bara uru iso ụmụ ha tụleghachi ụdị akparamàgwà a na-atụ anya n’aka ha. (Efe. 6:4) Ha na-enyere ụmụ ha aka ịghọta na ezi ịhụnanya Ndị Kraịst ‘adịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị’ ma ọ bụ ‘na-achọ ọdịmma nke ya.’ (1 Kọr. 13:5) Mgbakọ distrikti bụ oge e wepụtara iche iji bụrụ ndị Jehova ziri ihe, ụmụaka nakwa ndị meworo okenye pụrụ iji àgwà ha ga-akpa ma n’ala mgbakọ ma n’ebe ọ bụla ọzọ gosi na ha na-akwanyere ndokwa a ùgwù.—Aịs. 54:13.
6. Mmetụta dị aṅaa ka ezi ọrụ anyị pụrụ inwe n’ebe ndị ọzọ nọ?
6 Omume ọma anyị pụrụ ime ihe dị ukwuu n’ime ka ndị mmadụ kwụsị inwe echiche na-ezighị ezi banyere anyị ma bụrụ ndị a dọtara n’ezi ofufe. (Mat. 5:16; 1 Pita 2:12) Ka ndị nile anyị ga-ezute ná mgbakọ distrikti bụrụ ndị a gbaara àmà dị mma site n’ụzọ anyị ga-esi eme omume na otú anyị ga-esi emeso ha. N’ụzọ dị otú a, anyị ‘ga-egosi onwe anyị ịbụ ihe nlereanya nke ezi ọrụ’ ma nye Jehova otuto.—Taị. 2:7.
Igbe dị na peeji nke 4]
Na-echebara Ndị Ọzọ Echiche
▪ Nweta nanị ọnụ ụlọ i mere ndokwa ibi na ya
▪ Nwee ndidi mgbe ị kwụ n’ahịrị maka inweta ụlọ na ịkwụ ụgwọ ụlọ na họtel
▪ Emetọla ụlọ e nyere gị na họtel ma ọ bụ jiri ihe ndị e nwere na ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi
▪ Jiri nlezianya gbasoo ụkpụrụ nduzi ndị na-achịkwa họtel
▪ Lebara ụmụ gị anya nke ọma