Ịgha Mkpụrụ n’Ụba Na-eweta Ngọzi Bara Ụba
1 Anyị nile na-atụ anya mmezu nke nkwa ndị dị ebube dị n’Okwu Chineke. Ọbụna ugbu a, Jehova na-enye anyị ọtụtụ ngọzi ndị na-ewetara anyị obi ụtọ ná ndụ. Otú ọ dị, otú anyị ga-eriteru uru n’onwe anyị na-adabere ruo n’ókè dị ukwuu ná mgbalị anyị na-etinye. Dị ka Pọl onyeozi si kwuo ya, “onye na-aghakwa mkpụrụ n’ụba ga-aghọrọ mkpụrụ n’ụba.” (2 Kọr. 9:6) Tụlee akụkụ abụọ ebe ụkpụrụ a dabara.
2 Ozi Anyị: Isoro ndị mmadụ na-ekerịta ozi ọma ahụ mgbe ọ bụla anyị nwere ike ịgba àmà na-eweta ọtụtụ ụgwọ ọrụ. (Ilu 3:27, 28) N’ụzọ kwesịrị ịja mma, ọtụtụ ndị na-agha mkpụrụ n’ụba site n’ịmụba òkè ha na-ekere n’ozi, gụnyere ịsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ nke oge nile. Anyị nile pụrụ ịgha mkpụrụ n’ụba site n’iji ịdị uchu na-agaghachi iji zụlite mmasị nile anyị chọtara nakwa site n’ịmalite ọmụmụ Bible mgbe ọ bụla ohere ya dapụtara. (Rom 12:11) Ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ n’ụzọ ndị a na-eme ka e nwee ahụmahụ ndị na-ewuli elu na ọṅụ ka ukwuu n’ozi anyị.
3 Ịkwado Ihe Ndị Metụtara Alaeze Ahụ: Pọl kwuru ihe ahụ o kwuru banyere ‘ịgha mkpụrụ n’ụba’ mgbe ọ na-ekwu okwu banyere inye onyinye ihe onwunwe. (2 Kọr. 9:6, 7, 11, 13) Taa, e nwere ọtụtụ ihe anyị pụrụ iji ike ọkpụkpụ aka na ihe onwunwe anyị mee iji kwado ihe ndị metụtara Alaeze. Anyị pụrụ inye aka n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ dị iche iche. Anyị pụkwara iwepụta onwe anyị ikere òkè n’ilekọta na idebe ebe ndị a ọcha maka ezi ofufe. Tụkwasị na nke ahụ, anyị pụrụ inye onyinye ego maka mmefu ndị a na-enwe n’ọgbakọ nakwa maka ọrụ nkwusa Alaeze na ime ndị na-eso ụzọ zuru ụwa ọnụ. Ka anyị na-eme òkè nke anyị, anyị na-enwe ọṅụ ịhụ ngọzi bara ụba nke Jehova n’ọrụ a nke Chineke nyere iwu ka a rụọ!—Mal. 3:10; Luk 6:38.
4 Okwu Chineke na-agba anyị ume ‘ka anyị na-arụ ọrụ ọma, ka anyị baa ọgaranya n’ezi ọrụ, ka anyị na-emesapụ aka, na-adị njikere ikerịta ihe.’ Ka anyị na-aṅa ntị na ndụmọdụ ahụ, anyị na-enweta ngọzi bara ụba ugbu a. N’otu oge ahụ, anyị “na-atọrọ onwe [anyị] ezi ntọala maka ọdịnihu [nakwa maka] ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie” nke gaje ịbịa.—1 Tim. 6:18, 19.