Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/02 p. 3
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Ekwe Ntị Ọ̀ Bara Uru Ka Ọ̀ Na-emebi Ihe?
    Teta!—2005
  • Fon A Na-eji Agagharị Agagharị Ọ̀ Dị M Mkpa?
    Teta!—2002
  • Ekwe Ntị, Tiivi Ma Ọ Bụ Kọmputa Ọ̀ Na-agbazi M Ara?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 7/02 p. 3

Igbe Ajụjụ

◼ Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe anyị ji telifon ndị na-enweghị eriri na ígwè ozi pager na-eme ihe?

Ihe ndị dị otú ahụ pụrụ ime ka anyị nwee ike ịkpọtụrụ ndị ọzọ site n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ebe ọ bụla anyị nọ. Ọ bụ ezie na nke a nwere ike ịba uru, anyị aghaghị ilezi anya ka iji fon na-enweghị eriri na ígwè ozi pager eme ihe n’oge ndị na-ekwesịghị ekwesị ghara ịdọpụ uche n’ozi ma ọ bụ ná nzukọ Ndị Kraịst anyị. Olee otú nke a pụrụ isi mee?

Chee echiche mmetụta ọ ga-enwe ma ọ bụrụ na fon anyị na-enweghị eriri ma ọ bụ ígwè ozi pager anyị akụọ mgbe anyị nọ na-agba àmà n’ozi ubi. Gịnị ka onye nwe ụlọ ga-eche? Echiche dị aṅaa ka anyị ga-enye onye nwe ụlọ ma ọ bụrụ na anyị akwụsị wee zaa òkù ahụ? N’ezie, anyị agaghị achọ ime ihe ọ bụla iji gbochie ndị ọzọ ige ntị n’ozi Alaeze ahụ. (2 Kọr. 6:3) Ya mere, ọ bụrụ na anyị na-eji fon na-enweghị eriri ma ọ bụ ígwè ozi pager na-agagharị, anyị kwesịrị ịgbanye ya otú ọ na-agaghị adọpụ uche anyị ma ọ bụ nke ndị ọzọ mgbe anyị nọ n’ozi ubi.

Olee maka mgbe anyị nọ na-echere ka ndị ọzọ na-agba àmà? Ọ bụrụ na anyị ewepụtawo oge maka ozi ubi, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị itinye uche anyị n’ọrụ ahụ? N’ihi nkwanye ùgwù maka ozi dị nsọ anyị na-eje, biko debe ihe ndị metụtara achụmnta ego onwe onye ndị na-adịghị mkpa na ihe ndị metụtara ihe omume ọha na eze n’oge ndị ọzọ. (Rom 12:7) N’ezie, nke a apụtaghị na a pụghị iji fon mee ihe iji gbakwuo àmà ma ọ bụ iji mee ndokwa maka ime otú ahụ.

Anyị kwesịrị ịkpachara anya karịsịa banyere iji fon na-enweghị eriri eme ihe mgbe anyị na-anya ụgbọala, ebe ọ bụ na nnyocha ụfọdụ e mere na-egosi na ime otú ahụ na-amụba nke ukwuu ihe ize ndụ nke inwe ihe mberede. Anyị kwesịrị idebe iwu ọ bụla nke kpara ókè n’iji fon na-enweghị eriri eme ihe mgbe a na-anya ụgbọala.

Anyị na-abịa nzukọ Ndị Kraịst na mgbakọ dị iche iche iji fee Jehova na iji bụrụ ndị o ziri ihe. Ọ̀ bụ na inwe ekele maka ịdị nsọ nke oge ndị a ekwesịghị ịkpali anyị ịgbanye fon na-enweghị eriri na ígwè ozi pager otú ha na-agaghị adọpụ uche anyị ma ọ bụ nke ndị ọzọ? Ọ bụrụ na e nwere ihe ndị dị mkpa chọrọ ka anyị lebara ha anya ozugbo, anyị kwesịrị isi n’ebe ahụ e zukọrọ pụọ n’èzí gaa mee ya. Ma ọ́ bụghị ya, anyị kwesịrị ime ndokwa ilebara mkpa onwe onye na ihe ndị na-emetụtaghị okpukpe anya n’oge ndị ọzọ na-abụghị n’oge ndị e wepụtara maka ofufe.—1 Kọr. 10:24.

Ka ụzọ anyị si eji fon na-enweghị eriri na ngwá electronic ndị ọzọ eme ihe na-egosi mgbe nile na anyị na-echebara ndị ọzọ echiche ma nwee obi ekele miri emi maka ihe ime mmụọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya