Igbe Ajụjụ
◼ Olee ihe Baịbụl kwuru ndị ga-abara anyị uru ma anyị jiri ekwentị gaa ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma?
“E Nwere Oge A Kara Aka Maka Ihe Ọ Bụla” (Ekli. 3:1): Anyị nwere ike iji ekwentị zigara mmadụ ozi ma ọ bụ gwa ya okwu mgbe ọ bụla anyị chọrọ. Ma, o nwere oge anyị na-ekwesịghị ịna-apịgharị ekwentị. Dị ka ihe atụ, anyị ekwesịghị ịna-apịgharị ya ma anyị bịa ọmụmụ ihe. Ihe anyị kwo abịa ọmụmụ ihe bụ ka anyị fee Jehova, mụọ Baịbụl, gbaa ụmụnna anyị ume, hanwa agbaakwa anyị. (Diut. 31:12; Ọma 22:22; Rom 1:11, 12) Í cheghị na ọ ga-aka mma ka anyị gbanyụọ ekwentị anyị ma anyị bịa ọmụmụ ihe? Kama ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze gụwa ozi e ziteere anyị, ọ ga-akakwa mma ka anyị hapụ ya a gbasaa ọmụmụ ihe anyị agụọ ya. Ọ bụrụ na o nwere ozi dị oké mkpa anyị na-atụ anya ya ma ọ bụkwanụ na o nwere ihe dị oké mkpa mmadụ chọrọ ịgwa anyị, anyị kwesịrị ịpịnye ekwentị anyị otú ọ na-agaghị adapụta ụda.
‘Na-eme Ihe Niile n’Ihi Ozi Ọma’ (1 Kọr. 9:23): Ekwentị nwere ike ịbara anyị uru ma anyị gaa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, nwanna haziri ozi ọma nwere ike iji ya kpọọ ndị nkwusa ndị ọzọ iji mara otú ihe si kwụrụ n’ebe ha nọ ozi ọma. Mgbe ụfọdụ, ndị nkwusa na-eji ekwentị akpọ ndị ha chọrọ ịga nletaghachi na nke ha. Ha nwekwara ike iji ya akpọ ndị ha na-amụrụ Baịbụl iji mara ma hà nọ ya, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ebe ndị ahụ bi dị anya. Anyị jiri ekwentị gaa ozi ọma, anyị kwesịrị ilezi anya ka ọ ghara imegharị anyị anya mgbe anyị na-ezi onye anyị gara na nke ya ozi ọma. (2 Kọr. 6:3) Mgbe anyị na-eche ndị nkwusa ndị ọzọ ka ha pụta, kama iji oge ahụ na-ezigara enyi anyị ozi ma ọ bụkwanụ na-akpọ ya n’ekwentị, í cheghị na ọ ga-aka mma ka anyị jiri oge ahụ na-ezi ndị na-agafe n’ebe ahụ ozi ọma? Anyị na ndị anyị na ha so ozi ọma nwekwara ike iji oge ahụ na-akọ gbasara ozi ọma anyị bịara.
Na-akwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù (1 Kọr. 10:24; Fil. 2:4): Ụfọdụ na-abịa nzukọ ozi ubi n’azụ oge n’ihi na ha chere na ha nwere ike iji ekwentị ha jụta ebe ụmụnna nọ ozi ọma. Anyị ekwesịghị ịna-eme otú ahụ. Anyị bịa nzukọ ozi ubi n’azụ oge, ọ ga-eme ka onye na-ahazi nzukọ ozi ubi kegharịwa ndị pụtara ozi. Mgbe ụfọdụ, ihe nwere ike dapụta, anyị abịa nzukọ ozi ubi n’azụ oge. Ma, ọ bụrụ na anyị na-abịa n’oge, anyị na-egosi na anyị na-erubere Jehova isi. Anyị na-egosikwa na anyị na-akwanyere ndị na-ahazi ozi ubi na ndị nkwusa ndị ọzọ ùgwù.