Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/02 p. 8
  • Zere Ịchụso “Ihe Efu Dị Iche Iche”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Zere Ịchụso “Ihe Efu Dị Iche Iche”
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iji Internet Na-eme Ihe—Nọrọ na Nche Maka Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya!
    Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Ozi Ọma n’Internet
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Jiri Ịntanet Na-eme Ihe Otú Kwesịrị Ekwesị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Zere Ihe Ize Ndụ Ndị Dị n’Internet?
    Teta!—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 9/02 p. 8

Zere Ịchụso “Ihe Efu Dị Iche Iche”

1 Otu ụzọ a ma ama nke e si ezirịta ozi taa bụ site na E-mail. Ọ bụ ezie na isi n’ụzọ dị otú a soro ndị òtù ezinụlọ na ndị enyi na-akọrịta echiche na ahụmahụ ndị i nwere pụrụ ịbụ ihe kwesịrị ekwesị, olee “ihe efu dị iche iche” ndị pụrụ ịdị n’iji ozi E-mail na-eme ihe n’ụzọ a na-akparaghị ókè?—Ilu 12:11.

2 Okwu Ịdọ Aka ná Ntị Banyere Ozi E-Mail: Ụfọdụ na-ekwu na ha na-enwe mmetụta nke iso nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ mgbe ha na-enweta ihe ha na-ewere na ọ bụ ihe ọmụma ọhụrụ site n’ozi E-mail. Nke a pụrụ ịgụnye ahụmahụ, akụkọ banyere ihe ndị na-eme n’ebe obibi Betel, akụkọ banyere ọdachi ma ọ bụ mkpagbu, na ọbụna ihe nzuzo ndị e kwuru n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze. Ndị ọzọ yiri ka ha na-enwe ọchịchọ gabigara ókè nke izipụ ụdị ozi ndị ahụ, na-enwe olileanya na ọ bụ ha bụ ndị mbụ ga-akọrọ ndị enyi ha ihe ahụ.

3 Mgbe ụfọdụ, a na-agbanwe ma ọ bụ gbakwụnye ihe n’ihe ọmụma na ahụmahụ ndị ahụ. Ma ọ bụ ikekwe ná mgbalị ikwu ihe na-akpali akpali, ụfọdụ enyewo echiche na-ezighị ezi. Ọtụtụ mgbe, ndị ahụ ọ na-adị ngwa n’ahụ́ ikpughe ihe ndị dị otú ahụ adịghị ama ihe nile banyere ha. (Ilu 29:20) N’ọnọdụ ụfọdụ, ọbụna mgbe otu akụkọ bụ ihe a na-apụghị ikweta ekweta, a ka na-akọsakwa ya dị ka ihe na-akpali mmasị. Ụdị akụkọ ndị ahụ na-ezighị ezi ma ọ bụ ndị na-eduhie eduhie bụ “akụkọ ụgha,” ndị na-adịghị akwalite ezi nsọpụrụ Chineke.—1 Tim. 4:6, 7.

4 Ọ bụrụ na i zipụ ihe ọmụma mesịrị bụrụ nke na-ezighị ezi, ụta ụfọdụ dịịrị gị maka ihe mgbu ma ọ bụ mgbagwoju anya nke a pụrụ iweta. Mgbe Devid natara akụkọ a gbakwụnyere ihe na ya nke bụ́ na e gbuwo ụmụ ya nile, o ji n’ihi mwute “dọwaa uwe ya nile.” Otú ọ dị, n’eziokwu, ọ bụ nanị otu n’ime ụmụ ya nwụrụ. Nke ahụ ezuola ịkpata obi erughị ala, ma ịgbakwụnye ihe na ya wetakwuuru Devid obi erughị ala. (2 Sam. 13:30-33) N’ezie, anyị agaghị achọ ime ihe ọ bụla nke pụrụ iduhie onye ọ bụla n’ime ụmụnna anyị ma ọ bụ kụda ya mmụọ.

5 Ụzọ Chineke Họpụtara Isi Na-ezi Ozi: Buru n’uche na Nna anyị nke eluigwe nwere ụzọ o si na-ezi ozi, “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.” “Ohu ahụ” nwere ibu ọrụ nke ikpebi ihe ọmụma a ga-enye ezinụlọ nke okwukwe, nakwa ‘oge kwesịrị ekwesị’ iji kesaa ya. A na-enweta nri ime mmụọ a nanị site ná nzukọ ahụ a na-eduzi n’ụzọ ọchịchị Chineke. Anyị kwesịrị ịdị na-adabere mgbe nile n’ụzọ ahụ Chineke họpụtara isi na-ezi ozi maka inweta ihe ọmụma ndị a pụrụ ịtụkwasị obi, ọ bụghị n’usoro njikọ nke ndị na-eji Intanet eme ihe.—Mat. 24:45.

6 Ebe Ndị A Na-enweta Ihe Ọmụma n’Intanet: Anyị nwere ebe a na-enweta ihe ọmụma n’Intanet nke bụ́: www.watchtower.org. Ebe a zuru ezu isi mee ka ọha na eze na-enweta ihe ọmụma. Ọ dịghị mkpa ka onye ọ bụla, kọmitii, ma ọ bụ ọgbakọ ọ bụla nwee ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet maka Ndịàmà Jehova. Ụfọdụ ezigawo ihe ndị dị n’akwụkwọ anyị na akụkụ Akwụkwọ Nsọ nile na ebe ndị e zoro aka na ha n’ụzọ zuru ezu, ha enyefewokwa ọbụna ihe omume mgbakọ ma kwuo ka e nye onyinye. Ma è nwetara uru ma ọ bụ na e nwetaghị, iji kọmputa na-emepụtaghachi ma na-ekesa mbipụta nke Watchtower bụ imebi iwu metụtara ikike mbipụtaghachi. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị pụrụ ile nke a anya dị ka imere ụmụnna ha ihe ọma, anyị akwadoghị ya, e kwesịkwara ịkwụsị ya.

7 Iji ezi echiche na-eme ihe mgbe anyị ji kọmputa na-ezirịta ozi ga-eme ka anyị jide n’aka na anyị ji “akụ̀ nile dị oké ọnụ ahịa dịkwa ụtọ” mejuo uche anyị.—Ilu 24:4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya